‘Ka Okwu Unu Bụrụ Ihe E Ji Nnu Mee Ka Ọ Dị Ụtọ Mgbe Niile’
1. Olee ihe ‘iji nnu eme ka okwu anyị dị ụtọ’ pụtara?
1 “Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile, ka ọ bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.” (Kọl. 4:6) Iji nnu eme ka okwu anyị dị ụtọ pụtara ikwu okwu ndị ziri ezi na ikwu okwu otú ga-eme ka okwu anyị dị onye na-ege anyị ntị ụtọ ná ntị. Ọ dị ezigbo mkpa ime otú ahụ mgbe anyị nọ n’ozi.
2. Olee otú Jizọs si nwee ike ịgbara otu nwaanyị Sameria àmà?
2 Ihe Nlereanya Jizọs: Mgbe Jizọs nọ n’akụkụ otu olulu mmiri na-ezu ike, ọ malitere ịgwa otu nwaanyị Sameria bịara ebe ahụ isere mmiri okwu. Ugboro ugboro ná nkwurịta okwu ahụ, nwaanyị ahụ kwuru ihe ndị gosiri na ọ dịla anya ndị Juu na ndị Sameria sewere okwu. O kwukwara ihe gosiri na o kweere na ndị Sameria bụ ụmụ ụmụ Jekọb, n’agbanyeghị na ndị Juu kwenyesiri ike na ndị Sameria bụ ụmụ ndị mbịarambịa. Jizọs eweghị iwe n’ihi ihe ndị ahụ nwaanyị ahụ kwuru, kama nke ahụ, ọ hụrụ na esemokwu abataghị ná mkparịta ụka ahụ. N’ihi ya, ọ gbaara nwaanyị ahụ àmà nke baara ya na ndị obodo ya uru.—Jọn 4:7-15, 39.
3. Olee otú anyị nwere ike isi gbasoo ihe nlereanya Jizọs mgbe anyị nọ n’ozi?
3 Ka anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị kwesịrị iburu ihe anyị chọrọ ịrụzu n’uche—nke bụ́, ‘ikwusa ozi ọma nke ihe dị mma.’ (Rom 10:15) Anyị chọrọ ịgwa onye nwe ụlọ ihe na-adọrọ mmasị ma na-enye obi ụtọ site na Baịbụl, ọ bụghị ime ka o chee na anyị na-akatọ ihe ndị o kweere. Ọ bụrụ na o kwuo ihe na-ezighị ezi, anyị ekwesịghị ịrụwa ya ụka. Ọ̀ dị ihe o kwuru nke anyị nwere ike ikwenyere ma ọ bụ gbakwasị ụkwụ na ya jaa ya mma? Tupu anyị agụọ otu amaokwu Baịbụl, anyị nwere ike ikwu, sị, “Ọ̀ dịtụla mgbe i chere echiche na ihe a nwere ike ime eme?”
4. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma onye nwe ụlọ kparịwa anyị?
4 Ya bụrụkwanụ na onye nwe ụlọ nọ na-akparị anyị ma ọ bụ anyị achọpụta na naanị ihe ọ chọrọ bụ ka anyị na ya rụwa ụka? Okwu anyị na omume anyị ka kwesịkwara igosi na anyị dị nwayọọ. (2 Tim. 2:24, 25) Ọ bụrụ na onye ahụ enweghị mmasị n’ozi Alaeze ahụ, ọ ga-akasị mma iji akọ hapụ onye ahụ.—Mat. 7:6; 10:11-14.
5. Olee otú olu ọma otu nwanna nwaanyị ji zaa mmadụ okwu si rụpụta ezigbo ihe?
5 Ezi Ihe Ndị Sirila na Ya Pụta: Mgbe otu nwanna nwaanyị chọrọ ịgbara otu nwaanyị bi ya nso àmà, ezigbo iwe were nwaanyị ahụ, ya amalitekwa ịgwa nwanna anyị nwaanyị okwu ọjọọ. Nwanna anyị nwaanyị ji olu ọma sị ya: “Ewela iwe ma ọ bụrụ otú i si lee ya anya. Biko, ka ọ dị mgbe ọzọ.” Izu abụọ ihe ahụ mesịrị, nwaanyị ahụ bịara n’ụlọ nwanna nwaanyị ahụ, sị ya gbaghara ya maka otú ya si gwa ya okwu, ma kwuo na ya ejikerela ịnụ ihe nwanna nwaanyị ahụ chọrọ ịgwa ya. Azịza dị nro na-arụpụtakarị ezigbo ihe!—Ilu 15:1; 25:15.
6. Olee ihe mere o ji dị mkpa ikwu okwu ndị e ji nnu mee ka ha dị ụtọ mgbe anyị nọ n’ozi?
6 Gbalịa ikwu okwu ndị e ji nnu mee ka ha dị ụtọ mgbe ị na-ekwusa ozi ọma. Ya bụrụgodị na onye nwe ụlọ achọghị ige gị ntị, o nwere ike ige ntị mgbe ọzọ Ndịàmà Jehova bịara na nke ya.