Jigide Okwukwe n’Ebe Chineke na Kraịst nọ
Isi Ihe Ndị Sitere ná Ndị Kọlọsi
OKWUKWE n’ebe Jehova Chineke na Jisọs Kraịst nọ dị mkpa maka nzọpụta. Ma ijigide okwukwe dị otú ahụ bụ ihe ịma aka. Otú a ka ọ dị nye ndị Kraịst nọ na Kọlọsi, bụ́ obodo nke dị n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke Efesọs n’Asia Minor. N’ihi gịnị? N’ihi na ndị ozizi ụgha nọ n’ebe ahụ na-ekwu n’ụzọ na-ezighị ezi na nzọpụta dabeere n’ibi úgwù, ihe mmadụ riri, na idebe ememe ụfọdụ.
Mgbe ahụ, ọ bụ ihe kwere nghọta na Pọl nwere nchegbu banyere ọdị-mma ime mmụọ nke ndị Kraịst nọ na Kọlọsi, ọ chọkwara n’ezie ka ha jigide okwukwe ha n’ebe Chineke na Kraịst nọ. Ya mere mgbe ọ na-eru nso ngwụsị nke mkpọrọ mbụ a tụrụ Pọl na Rom (n’ihe dị ka 60-61 O. A.), o degaara ndị Kọlọsi akwụkwọ ozi nke e dere iji megide echiche ndị na-ezighị ezi ma wulite okwukwe ha. Ka anyị lee otú anyị onwe anyị pụkwara isi rite uru n’okwu ịhụnanya ya.
Ghọta Ọnọdụ nke Kraịst
Ná mmalite nke akwụkwọ ozi ya, Pọl gosipụtara nghọta maka ihe bụ ọnọdụ Jisọs. (1:1-2:12) Ọ jara ndị Kọlọsi mma n’ihi okwukwe ha n’ebe Kraịst nọ na ịhụnanya ha n’ebe ndị kwere ekwe ibe ha nọ. Pọl zoro aka n’ebe ịdị elu nke Kraịst dị, dị ka Onye e sitere n’aka ya kee ihe ndị ọzọ nile, Onye isi nke ọgbakọ ahụ, na onye e buru ụzọ mụọ site ná ndị nwụrụ anwụ. Ichigharịkwuru Chineke bụ ihe kwere mee site na Kraịst, bụ́ onye e zobere akụ nile nke amamihe na ihe ọmụma n’ime ya. N’ihi ihe ndị a nile, ndị Kraịst kwesịrị ịga n’ihu na-ejegharị n’ịdị n’otu ha na Kraịst ma ghara ikwe ka onye ọ bụla jiri ọkà ihe ọmụma mmadụ dọkpụfuo ha.
Site na Kraịst, Chineke wezụgara Iwu ahụ. (2:13-23) N’ụzọ ihe atụ, a kpọgidere ya n’elu osisi ahụ nke Kraịst nwụrụ n’elu ya. Ihe ndị Iwu ahụ chọrọ ka a na-eme bụ “onyinyo nke ihe gaje ịbịa; ma ahụ bụ nke Kraịst.” Site n’ịnọgidesi ike n’akụkụ nke Kraịst, ha agaghị ekwe ka mmadụ ọ bụla napụ ha ihe mgbata n’ọsọ nke ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe.
Ghọta Chineke na Kraịst
Pọl gara n’ihu ịgba ndị Kọlọsi ume ka ha yikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ ma doo onwe ha n’okpuru ike nke Jisọs Kraịst. (3:1-17) Site n’itinye uche ha n’ihe ndị dị n’elu, ha ga-enye ọdịmma ime mmụọ ọnọdụ mbụ ná ndụ ha. Nke a chọrọ iwezụga omume na okwu ndị na-ezighị ezi. Lee otú ha ga-esi bụrụ ndị a gọziri ma ọ bụrụ na ha eyikwasị onwe ha ụdị àgwà ndị ahụ dị ka obi ebere, obi dị umeala, na ịhụnanya! Udo nke Kraịst ga-eduzi obi ha ma ọ bụrụ na ha emee ihe nile n’aha Jisọs, site n’aka ya na-ekele Chineke.
Nghọta onye Kraịst ghọtara Jehova na Jisọs kwesịkwara inwe mmetụta ná mmekọrịta ya na ndị ọzọ. (3:18-4:18) Ndị bụ nwunye, di, ụmụ, ndị ohu, na ndị nwe mmadụ ga-eji egwu nke Chineke na nsọpụrụ nke Kraịst rụzuo ọrụ dịịrị ha. Leekwa ihe dị mkpa ọ bụ ịnọgidesi ike n’ekpere ma na-aga ije n’amamihe!
Akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Kọlọsi pụrụ inyere anyị aka izere ozizi ụgha ndị ga-anapụ anyị ihe mgbata n’ọsọ nke ndụ. Okwu nke onyeozi ahụ kwusiri ike banyere ịmata ikike ịchịisi nke Jehova na Ọkpara ya pụrụ inwe ezi mmetụta n’ebe mmekọrịta nke anyị na ndị ọzọ dị. E mesikwara anyị obi ike banyere ngọzi bara ụba ma ọ bụrụ na anyị ejigide okwukwe anyị n’ebe Chineke na Kraịst nọ.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 26]
Akwụkwọ Ozi nye Leọdisia: Pọl degaara ndị Kọlọsi, sị: “Mgbe ọ bụla a ga-agụsị akwụkwọ ozi a n’etiti unu, meenụ ka a gụọkwa ya ná nzukọ Kraịst nke dị na Leọdisia, leziekwanụ anya ka unu onwe unu gụọkwa akwụkwọ ozi ahụ si na Leọdisia bịa.” (Ndị Kọlọsi 4:16) Leọdisia bụ obodo bara ọgaranya nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ Asia Minor, e ji okporo ụzọ jikọọ ya na obodo ndị dị ka Filadelfia na Efesọs. O yiri ka ọ bụ ozi Pọl jere n’Efesọs ruru ebe dị anya dị ka Leọdisia, ọ bụ eziokwu na o jeghị ozi n’ebe ahụ. O zigaara ndị Kraịst nọ na Leọdisia akwụkwọ ozi, ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị mmụta kwere na ọ bụ nke e depụtara site na nke ahụ o degaara ndị Efesọs. A dịghị ahụ akwụkwọ ozi ahụ e degaara ndị Leọdisia na Bible, ọ pụrụ ịbụ n’ihi na o nweghị ihe ọmụma dị anyị mkpa taa, ma ọ bụ ma eleghị anya, o kwughachiri otu isi ihe ndị ahụ a kọwara nke ọma n’akwụkwọ ozi ndị ọzọ.
[Foto]
Mkpọmkpọ ebe ndị dị na Leọdisia