Jehova Pụrụ Ime Ka Ị Dị Ike
“Ọ bụ Onye na-enye onye dara mbà ike; onye ike na-adịghị ka Ọ na-emekwa ka o nwee ume n’ụba.”—AỊSAỊA 40:29.
1, 2. Gịnị bụ ihe àmà ụfọdụ nke ike hiri nne nke Jehova?
JEHOVA bụ Chineke nke ‘nwere ike hiri nne.’ Anyị pụrụ ịhụ ihe àmà nke “ike ebighị ebi Ya na ụdị Chineke Ya,” n’ịdị ebube nke ihe ndị o kere eke a na-ahụ anya. Ndị na-ajụ ịmata ihe àmà dị otú ahụ nke ịbụ Onye Okike ya enweghị ihe ngọpụ.—Abụ Ọma 147:5; Ndị Rom 1:19, 20.
2 Ike Jehova na-apụtawanye ìhè ka ndị ọkà mmụta sayensị na-enyobami anya n’eluigwe na ụwa, ya na ụyọkọ kpakpando ya a na-apụghị ịgụta ọnụ ndị gbasapụrụ ruo ọtụtụ narị nde nke ọsọ àmụ̀mà n’afọ. N’abalị gbara ọchịchịrị nke ihu igwe gbachapụrụ agbachapụ, lelie anya n’eluigwe lee ma ị́ gaghị enwe mmetụta yiri nke onye ọbụ abụ ahụ: “Mgbe m hụrụ eluigwe Gị, bụ́ ọrụ mkpịsị aka Gị, ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo; gịnị ka mmadụ bụ, na Ị na-echeta ya; na nwa nke mmadụ, na Ị na-eleta ya?” (Abụ Ọma 8:3, 4) Leekwa otú Jehova siworo lekọta mmadụ nke ọma, lekọta anyị! O nyere nwoke na nwanyị mbụ ebe obibi elu ala mara mma. Ọbụna ájá ya nwere ike—ime ka ihe ọkụkụ too, na-emepụta ihe oriri ndị na-edozi ahụ, ndị a na-emetọghị emetọ. Mmadụ na anụmanụ na-enweta ike anụ ahụ site ná ngosipụta nke a nke ike Chineke.—Jenesis 1:12; 4:12; 1 Samuel 28:22.
3. E wezụga ihe ndị a na-ahụ anya n’eluigwe na ụwa, gịnị ọzọ na-egosipụta ike Chineke?
3 E wezụga eluigwe ịbụ ihe na-adọrọ mmasị na ihe ọkụkụ na anụmanụ nke elu ala ịbụ ndị na-enye ọṅụ, ha na-egosi anyị ike Chineke. Pọl onyeozi dere, sị: “Ihe Ya anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke, bụ ike ebighị ebi Ya na ụdị Chineke Ya.” (Ndị Rom 1:20) Ma e nwere ihe àmà ọzọ nke ike ya nke kwesịrị ịdọrọ mmasị na ekele anyị. ‘Gịnị,’ ka ị pụrụ iche, ‘na-egosipụta ike Chineke karịa eluigwe na ụwa?’ Azịza ya bụ Jisọs Kraịst. N’ezie, n’okpuru ike mmụọ nsọ Pọl onyeozi na-ekwu na Kraịst ịbụ onye a kpọgburu bụ “ike nke Chineke, na amamihe nke Chineke.” (1 Ndị Kọrint 1:24) ‘N’ihi gịnị ka o ji bụrụ otú a?’ ka ị pụrụ ịjụ, ‘Oleekwa ihe jikọtara ya na ndụ m ugbu a?’
Ike Site n’Ọkpara Ya
4. Olee otú e si gosi ike Chineke n’ihe banyere Ọkpara ya?
4 E buru ụzọ gosipụta ike Chineke mgbe o kere Ọkpara ya ọ mụrụ nanị ya, bụ́ onye e mere n’onyinyo ya. Ọkpara nke a bụ mmụọ jeere Jehova ozi dị ka “onye ọkà” site n’iji ike hiri nne nke Chineke mee ihe n’ike ihe nile ndị ọzọ. (Ilu 8:22, 30) Pọl degaara ụmụnna ya ndị Kraịst nọ na Kọlọsi, sị: “N’ime Ya ka e kere ihe nile, nke dị n’ime eluigwe na nke dị n’elu ụwa, ihe a pụrụ ịhụ anya na ihe a na-apụghị ịhụ anya . . . E sitewo n’aka Ya kee ihe nile, e kewokwara Ya ihe nile.”—Ndị Kọlọsi 1:15, 16.
5-7. (a) N’oge ndị gara aga, olee otú ụmụ mmadụ si kere òkè ná ngosipụta dị iche iche nke ike Chineke? (b) Olee ihe mere a ga-eji kweta na a pụrụ igosipụta ike Chineke n’ihe banyere ndị Kraịst taa?
5 Anyị bụ akụkụ nke ‘ihe nile e kere eke nke dị n’elu ụwa.’ Ya mere à pụrụ ime ka ike Chineke rutere anyị bụ́ ụmụ mmadụ? Otú ọ dị, ná mmeso nile nke Chineke na-emeso ụmụ mmadụ na-ezughị okè, Jehova site n’oge ruo n’oge enyekwuwo ndị ohu ya ike ka ha wee nwee ike ịrụzu nzube ya dị iche iche. Mosis maara na, n’ozuzu ha, ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-adị ndụ 70 ma ọ bụ 80 afọ. (Abụ Ọma 90:10) Olee banyere Mosis n’onwe ya? O biri ndụ 120 afọ, ma “anya ya adịghị ahụ inyoghị inyoghị, ume ya apụghị n’ahụ ya.” (Deuterọnọmi 34:7) Ọ bụ ezie na nke ahụ apụtaghị na Chineke na-enye ohu ya nke ọ bụla ike ibite ndụ aka otú ahụ ma ọ bụ ịnọgide na-enwe ume dị otú ahụ, ọ na-egosi na Jehova pụrụ inye ụmụ mmadụ ike.
6 Ihe ọzọ na-egosi ikike Chineke nwere inye ndị ikom na ndị inyom ike bụ ihe o mere n’ebe nwunye Abraham nọ. ‘Sera natara ike ọbụna ịmụ nwa, ya onwe ya, mgbe ọ gasịrị ịmụ nwa, ebe ọ gụrụ Ya n’Onye kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Onye kwererị nkwa.’ Ma ọ bụ tụlee otú Chineke si nye ndị ikpe ike n’Israel: ‘Gideon, Berak, Samson, Jefta; ha na Devid na Samuel na ndị amụma: ndị e mere ka ha dị ike site n’adịghị ike.’—Ndị Hibru 11:11, 32-34.
7 Ike dị otú ahụ pụrụ ịrụkwa ọrụ n’ebe anyị nọ. Oo, ọ pụrụ ịbụ na anyị agaghị atụ anya nwa ugbu a site n’ọrụ ebube, ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na anyị agaghị egosipụta ike dị ka nke Samson. Ma anyị pụrụ ịdị ike, dị ka Pọl gwara ndị mmadụ nkịtị nọ na Kọlọsi. Ee, Pọl degaara ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka, dị ka anyị na-ahụ n’ọgbakọ dị iche iche taa akwụkwọ, o kwukwara na a ‘na-eme ka ha dị ike n’ime ike nile.’—Ndị Kọlọsi 1:11.
8, 9. Na narị afọ mbụ, olee otú e si mee ka ike Jehova pụta ìhè n’ihe banyere ụmụ mmadụ ndị dị ka anyị?
8 N’oge ije ozi elu ala nke Jisọs, Jehova mere ka o doo anya na ike ya na-arụ ọrụ site n’Ọkpara ya. Dị ka ihe atụ, n’otu oge mgbe ìgwè mmadụ nuuru bịakwute Jisọs na Kapanaum, “ike nke Onyenwe anyị dinyekwaara Ya ime ka ahụ dị mmadụ ike.”—Luk 5:17.
9 Ka mbilite n’ọnwụ ya gasịrị, Jisọs mesiri ụmụazụ ya obi ike na ha ‘ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ bịakwasịrị ha.’ (Ọrụ 1:8) Lee ka o si bụrụ eziokwu! Otu onye ọkọ akụkọ ihe mere eme na-akọ banyere ihe ndị mere ụbọchị ole na ole ka Pentikọst nke 33 O.A. gasịrị, sị: “Ọ bụkwa ike ukwuu ka ndị ozi ji agba àmà ha banyere mbilite n’ọnwụ nke Onyenwe anyị Jisọs.” (Ọrụ 4:33) Pọl n’onwe ya bụ onye Chineke mere ka ọ dị ike maka ọrụ nke Chineke nyere ya ka ọ rụọ. Mgbe ntọghata na nnwetaghachi ọhụhụ ụzọ ya gasịrị, o “nwee ike karị, na-ekwukwa okwu nke gbara ndị Juu bi na Damaskọs gharị, ebe ọ na-egosi nke ọma na Onye a bụ Kraịst ha.”—Ọrụ 9:22.
10. Olee otú ike sitere n’aka Chineke si nye aka n’ọnọdụ Pọl?
10 N’ezie inwetakwu ike dị Pọl mkpa, mgbe anyị tụlere ume ime mmụọ na nke uche nke a chọrọ iji mee njem ozi ala ọzọ atọ nke gụnyere ijezu ọtụtụ puku maịlụ. O dikwara ụdị ihe isi ike nile, na-edi ije mkpọrọ na iche ọnwụ n’ihi okwukwe ya ihu. Ò si aṅaa mee nke a? Ọ zara, sị: “Onyenwe anyị guzoro m nso, wee mee ka m dị ike; ka e wee were ọnụ m kwusazuo nkwusa ahụ.”—2 Timoti 4:6-8, 17; 2 Ndị Kọrint 11:23-27.
11. Banyere ike Chineke, olileanya dị aṅaa ka Pọl zooro ndị ohu ibe ya nọ na Kọlọsi aka na ya?
11 Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na Pọl, mgbe ọ na-edegara ‘ụmụnna ya n’ime Kraịst’ ndị nọ na Kọlọsi akwụkwọ, mesiri ha obi ike na a pụrụ ime ka ha “dị ike n’ime ike nile, dị ka ike nke ebube [Jehova] si dị, ruo ntachi obi na ogologo ntachi obi nile, ya na ọṅụ.” (Ndị Kọlọsi 1:2, 11) Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị Kraịst e tere mmanụ kpọmkwem ka a gwara okwu ndị ahụ, ndị nile na-agbaso nzọụkwụ Kraịst pụrụ irite uru dị ukwuu site n’ihe Pọl dere.
E Mere Ka Ha Dị Ike na Kọlọsi
12, 13. Gịnị bụ ihe kpaliri akwụkwọ ozi ahụ e degaara ndị Kọlọsi, gịnịkwa ka o yiri ka ọ bụ otú e si meghachi omume banyere ya?
12 Ọgbakọ ahụ dị na Kọlọsi, nke dị n’ókèala ndị Rom n’Esia, bụ nke e guzobere ma eleghị anya site ná nkwusa nke onye Kraịst ahụ kwesịrị ntụkwasị obi aha ya bụ Epafras. O yiri ka mgbe ọ nụrụ banyere ịtụ mkpọrọ nke Pọl na Rom n’ihe dị ka na 58 O.A., Epafras kpebisiri ike ije leta onyeozi ahụ ma jiri akụkọ ọma nke ịhụnanya na nguzosi ike nke ụmụnna ya nọ na Kọlọsi gbaa ya ume. O yikwara ka Epafras ọ kọrọ akụkọ bụ eziokwu banyere nsogbu ụfọdụ dị n’ọgbakọ Kọlọsi nke chọrọ mgbazi. N’aka nke ya, Pọl nwere mmetụta nke ịbụ onye a kwaliri idegara ọgbakọ ahụ akwụkwọ ozi agbamume na ndụmọdụ. Gị onwe gị kwa pụrụ inweta agbamume dị ukwuu site n’isi 1 nke akwụkwọ ozi ahụ, n’ihi na ọ na-eme ka otú Jehova pụrụ isi mee ka ndị ohu ya dị ike pụta ìhè.
13 Cheedị echiche ụdị mmetụta ụmụnna nwoke na nwanyị nọ n’ọgbakọ Kọlọsi na-aghaghị inweworị mgbe Pọl kọwara ha dị ka “ụmụnna anyị n’ime Kraịst ndị . . . kwekwara ekwe.” Ha kwesịrị ịja mma n’ihi ‘ịhụnanya ha ji hụ ndị nsọ nile’ na n’ihi ‘ịmị mkpụrụ nke ozi ọma ahụ’ site n’oge ha ghọrọ ndị Kraịst! À pụrụ ikwu okwu ndị a banyere ọgbakọ anyị, banyere anyị n’otu n’otu?—Ndị Kọlọsi 1:2-8.
14. Gịnị bụ ọchịchọ Pọl banyere ndị Kọlọsi?
14 Akụkọ ahụ Pọl natara kwaliri ya nke ukwuu nke na ọ gwara ndị Kọlọsi na ya akwụsịbeghị ikpe ekpere n’ihi ha na ịrịọ ka e mee ka ha “jupụta ná mmazu nke ihe [Chineke] na-achọ n’ime amamihe na nghọta nile nke Mmụọ Nsọ, ka unu jegharịa n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị.” O kpere ekpere ka ha nọgide “na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ nile ọ bụla, na-abakwa ụba n’ime mmazu nke Chineke; ebe a na-eme ka unu dị ike n’ime ike nile, dị ka ike nke ebube Ya si dị, ruo ntachi obi na ogologo ntachi obi nile, ya na ọṅụ.”—Ndị Kọlọsi 1:9-11.
Ndị E Mekwara Ka Ha Dị Ike Taa
15. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta otu ụdị àgwà ahụ dị ka e gosipụtara n’ihe Pọl degaara ndị Kọlọsi?
15 Lee aha ihe nlereanya ọma nke Pọl setịpụụrụ anyị! Ekpere anyị dị ụmụnna anyị gburugburu ụwa mkpa ka ha na-atachi obi ma jigide ọṅụ ha n’agbanyeghị ahụhụ ha nile. Dị ka Pọl, anyị kwesịrị ịkpọ okwu aha n’ekpere anyị mgbe anyị nụrụ akụkọ na ụmụnna anyị nọ n’ọgbakọ ọzọ, ma ọ bụ n’ala ọzọ, na-enwe ihe isi ike. Ọ pụrụ ịbụ na ọdachi ndị na-emere onwe ha ma ọ bụ nsogbu ime mmụọ ụfọdụ metụtara otu ọgbakọ nọ nso. Ma ọ bụ na ọ pụrụ ịbụ na ndị Kraịst nọ n’ala ebe e nwere agha obodo ma ọ bụ mgburịta nke ndị si n’ebo dị iche iche. N’ekpere, anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka o nyere ụmụnna anyị aka ‘ijegharị n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị,’ ịnọgide na-amị mkpụrụ Alaeze ka ha na-atachi obi, na ịba ụba n’ihe ọmụma. N’ụzọ dị otú a ndị ohu Chineke na-anata ike nke mmụọ ya, ‘ebe a na-eme ka ha dị ike n’ime ike nile.’ Ị pụrụ ijide n’aka na Nna unu ga-anụ ma zaghachi.—1 Jọn 5:14, 15.
16, 17. (a) Dị ka Pọl dere, gịnị ka anyị kwesịrị inwe ekele n’ihi ya? (b) N’echiche dị aṅaa ka e siworo tọhapụ ma gbaghara ndị Chineke?
16 Pọl dere na ndị Kọlọsi kwesịrị ịdị ‘na-ekele Nna ahụ, Onye mere ka ha ruo iketa òkè ha n’ihe nketa ndị nsọ n’ìhè.’ Ka anyị na-ekelekwa Nna anyị nke eluigwe n’ihi ọnọdụ anyị ná ndokwa ya, ma ọ bụ n’ógbè eluigwe ma ọ bụ elu ala nke Alaeze ya. Olee otú Chineke si mee ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè ruo eru n’anya ya? Pọl degaara ụmụnna ya e tere mmanụ, sị: “Onye dọpụtara anyị n’ike nke ọchịchịrị, wee webiga anyị n’alaeze nke Ọkpara nke ịhụnanya Ya; Onye anyị nwere mgbapụta anyị n’ime Ya, bụ mgbaghara mmehie anyị nile.”—Ndị Kọlọsi 1:12-14.
17 Ihe ọ sọrọ ya bụrụ olileanya anyị, nke eluigwe ma ọ bụ nke elu ala, anyị na-ekele Chineke kwa ụbọchị maka mgbapụta anyị site n’usoro ọjọọ nke a nke ọchịchịrị, bụ nke e mezuru site n’okwukwe anyị n’ime àjà mgbapụta dị oké ọnụ ahịa nke Ọkpara Jehova ọ hụrụ n’anya. (Matiu 20:28) Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ eritewo uru site n’ihe mgbapụta nke e ji eme ihe n’ụzọ pụrụ iche n’ihi ha ka e wee nwee ike ‘iwebiga ha baa n’alaeze nke Ọkpara nke ịhụnanya Chineke.’ (Luk 22:20, 29, 30) Ma “atụrụ ọzọ” ahụ na-eritekwa uru site n’ihe mgbapụta ahụ ọbụna ugbu a. (Jọn 10:16) Ha pụrụ ịnata mgbaghara Chineke iji nwee nguzo ezi omume n’ihu ya dị ka ndị enyi ya. Ha nwere òkè buru ibu n’ịkpọsa “ozi ọma nke a nke alaeze” n’oge ọgwụgwụ a. (Matiu 24:14) Tụkwasị na nke ahụ, ha nwere olileanya ahụ dị ebube nke ịghọ ndị ezi omume kpam kpam na ịbụ ndị zuru okè n’anụ ahụ ka ọ na-erule ọgwụgwụ nke Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst. Ka ị na-agụ nkọwa ahụ dị ná Mkpughe 7:13-17, lee ma ọ bụ na i kwetaghị na nke a gaje ịbụ ihe àmà nke ịbụ ndị a napụtara, gọzikwa.
18. Ime ka a dị n’otu dị aṅaa e hotara ná Ndị Kọlọsi ka Chineke ka na-arụzu?
18 Akwụkwọ ozi Pọl na-enyere anyị aka ịghọta otú ụgwọ anyị ji nwoke ahụ kasị ukwuu nke dịworo ndụ haruru. Gịnị ka Chineke na-arụzu site n’aka Kraịst? “[Ọ bụ] ka O wee sitekwa n’aka Ya mee ka Ya onwe ya na ihe nile dị n’otu, ebe O sitesịrị n’ọbara nke [osisi ịta ahụhụ, NW] Ya mee ka Ya onwe ya na mmadụ dị n’udo site n’aka Ya, ka m kwuru, ma ọ bụ ihe dị n’elu ụwa, ma ọ bụ ihe dị n’eluigwe.” Nzube Chineke bụ ime ka ya na ihe nile e kere eke dịghachi n’otu zuru ezu, dị ka ọ dị tupu nnupụisi ahụ n’Iden. Onye e ji mee ihe n’ike ihe nile bụ otu Onye ahụ e ji eme ihe ugbu a iji rụzuo ịdị n’otu nke a.—Ndị Kọlọsi 1:20.
Ndị E Mere Ka Ha Dị Ike Ime Gịnị?
19, 20. Na gịnị ka anyị ịbụ ndị dị nsọ na ndị a na-apụghị ibo ebubo dabeere?
19 Ibu ọrụ na-abịara anyị bụ́ ndị e mere ka ha na Chineke dị n’otu. O nwere mgbe anyị bụ ndị mmehie na ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ. Ma ugbu a, ebe anyị tinyeworo okwukwe n’àjà nke Jisọs, uche anyị ghara ịdịkwa n’ọrụ ọjọọ dị iche iche, anyị na-eguzo n’ụzọ bụ isi n’ọnọdụ “dị nsọ, ndị a na-apụghịkwa ịta ụta,” “a na-apụghịkwa ibo ebubo” n’ihu Chineke. (Ndị Kọlọsi 1:21, 22) Cheedị echiche, dị nnọọ ka ihere na-emeghị Chineke banyere ndị àmà kwesịrị ntụkwasị obi nke oge ochie, otú a ka ihere na-adịghịkwa eme ya banyere anyị, ịbụ onye a kpọkuru dị ka Chineke anyị. (Ndị Hibru 11:16) Taa, ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ibo anyị ebubo nke ịza aha ya dị ebube n’ụzọ na-ezighị ezi, ma ọ bụkwanụ anyị ịbụ ndị na-atụ ụjọ ikwupụta aha ahụ ruo ebe ụwa sọtụrụ!
20 Ma rịba ama ịdọ aka ná ntị nke Pọl gbakwụnyere ná Ndị Kọlọsi 1:23: “Ma a sị na ọ bụ ezie na unu anọgide n’okwukwe unu, ndị a tọworo ntọala, ndị na-eguzosikwa ike, ndị a na-adịghị ewepụkwa n’olileanya nke ozi ọma ahụ nke unu nụrụ, nke e kwusara n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.” Ya mere ihe dị ukwuu dabeere na anyị ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova, na-agbaso nzọụkwụ nke Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya. Jehova na Jisọs emeworo anyị ihe dị ukwuu! Ka anyị gosi ịhụnanya anyị nwere n’ebe ha nọ site n’ịgbaso ndụmọdụ Pọl.
21. N’ihi gịnị ka anyị ji nwee oké ihe mere anyị ji bụrụ ndị nwere ọṅụ taa?
21 Ndị Kraịst bụ́ ndị Kọlọsi aghaghị ịbụworị ndị nwere oké ọṅụ ịnụ na ‘ozi ọma ahụ nke ha nụrụ’ abụrụworị “nke e kwusara n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.” Taa ọ bụ ihe na-akpali akpali ọbụna karị ịnụ ókè a na-ekwusaru ozi ọma Alaeze ahụ site n’aka ihe karịrị nde Ndịàmà anọ na ọkara n’ihe karịrị 230 ala. Leenụ, kwa afọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 300,000 sitere ná mba nile na-aghọ ndị dị n’otu ha na Chineke!—Matiu 24:14; 28:19, 20.
22. Ọbụna a sị na anyị na-ata ahụhụ, gịnị ka Chineke pụrụ imere anyị?
22 Ọ bụ ezie na ihe àmà na-egosi na a tụrụ Pọl mkpọrọ n’oge o degaara ndị Kọlọsi akwụkwọ ozi ahụ, o nweghị mwute n’ụzọ ọ bụla n’ihi ihe ndị bịakwasịrị ya. Kama nke ahụ, ọ sịrị: “Ugbu a ana m aṅụrị ọṅụ n’ahụhụ m na-ahụ n’ihi unu.” Pọl maara ihe ọ pụtara bụ ‘ịtachi obi na ogologo ntachi obi nile, ya na ọṅụ.’ (Ndị Kọlọsi 1:11, 24) Ma ọ matara na o meghị nke a n’ike nke onwe ya. Jehova emewo ya ka ọ dị ike! Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ọtụtụ puku Ndịàmà a tụworo mkpọrọ ma kpagbuo atụfubeghị ọṅụ ha n’ijere Jehova ozi. Kama nke ahụ, ha abịala ghọta ịbụ eziokwu nke okwu Chineke ndị ahụ a na-achọta n’Aịsaịa 40:29-31: “Ọ bụ Onye na-enye onye dara mbà ike . . . Ndị na-ele anya Jehova ga-agbanwe ike ha.”
23, 24. Gịnị bụ ihe omimi ahụ dị nsọ nke e hotara ná Ndị Kọlọsi 1:26?
23 Ije ozi nke ozi ọma ahụ nke hiwere isi n’ebe Kraịst nọ dị oké mkpa nye Pọl. Ọ chọrọ ka ndị ọzọ mara abamuru nke òkè Kraịst ná nzube Chineke, ya mere ọ kọwara ya dị ka “ihe omimi nke e zoworo ezo site n’oge nile sitekwa n’ọgbọ nile.” Otú ọ dị, ọ gaghị anọgide na-abụ ihe omimi mgbe nile. Pọl gbakwụnyere, sị: “Ugbu a ka e mere ya ka ọ pụta ìhè nye ndị nsọ Ya.” (Ndị Kọlọsi 1:26) Mgbe nnupụisi tiwapụtara n’Iden, Jehova kwere nkwa ihe ndị ka mma ndị gaje ịbịa, na-ebu amụma na ‘mkpụrụ nke nwanyị ahụ ga-echifịa isi nke agwọ ahụ.’ (Jenesis 3:15) Gịnị ka nke a pụtara? Ruo ọtụtụ ọgbọ, ruo ọtụtụ narị afọ, ọ nọgidere na-abụ ihe omimi. Jisọs bịaziri, o wee “sitekwa n’ozi ọma Ya wepụta ndụ na emebighị emebi.”—2 Timoti 1:10.
24 Ee, “ihe omimi” ahụ hiwere isi n’ebe Kraịst na Alaeze Mesaịa ahụ dị. Pọl hotara “ihe dị n’eluigwe,” na-ezo aka ná ndị ahụ ga-eso Kraịst kere òkè n’ịchịisi Alaeze ahụ. A ga-eji ndị a mee ihe n’iwetara “ihe dị n’elu ụwa” ngọzi a na-apụghị iji ọnụ kọọ, bụ́ ndị ga-anụ ụtọ nke paradaịs na-adịru ebighị ebi n’ebe a. Ị pụziri ịhụ otú o si kwesị ekwesị nye Pọl izo aka n’ebe “akụ̀ nke ebube nke ihe omimi a” dị.—Ndị Kọlọsi 1:20, 27.
25. Dị ka e gosiri ná Ndị Kọlọsi 1:29, gịnị kwesịrị ịbụ omume anyị ugbu a?
25 Pọl tụsiri anya ike maka ọnọdụ ya n’Alaeze ahụ. Ma ọ ghọtara na ọ bụghị ihe ọ ga-anọrọ na-atụ anya ya n’emeghị nnọọ ihe ọ bụla. “Ana m adọgbukwa onwe m n’ọrụ ime ihe a, na-agbasi mgba ike dị ka ịrụsi ọrụ ike nke Ya si dị, nke na-arụsi ike n’ime m n’ike.” (Ndị Kọlọsi 1:29) Rịba ama na Jehova, site n’aka Kraịst, mere ka Pọl dị ike iji jezuo ozi na-azọpụta ndụ. Jehova pụrụ imere anyị otu ihe ahụ taa. Ma anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ènwere m mmụọ izisa ozi ọma m nweburu n’oge mbụ m mụtara eziokwu ahụ?’ Gịnị bụ azịza gị? Gịnị pụrụ inyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ịnọgide ‘na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ, na-agbasikwa mgba ike n’ikwekọ n’ịrụ ọrụ nke ike Jehova’? Isiokwu ọzọ na-esonụ tụlere okwu a.
Ị̀ Rịbara Ama?
◻ N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Jehova pụrụ igosipụta ike ya n’ihi ụmụ mmadụ?
◻ Gịnị kpaliri okwu ndị ahụ nke Pọl nke dị ná Ndị Kọlọsi isi 1?
◻ Olee otú Chineke si arụzu ịdị n’otu ahụ e hotara ná Ndị Kọlọsi 1:20?
◻ Site n’ike ya, gịnị ka Jehova pụrụ iji anyị rụzuo?
[Map/Foto dị na peeji nke 8]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
KỌLỌSI