Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Saa Anya ná Mmiri ma A Bịa n’Ụdị Ndị Ị Na-emete Enyi
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • 1. Olee ihe jikọrọ ndị enyi gị na otú i si akpa àgwà?

      Ndị mmadụ na-akpakarị àgwà ka ndị ha na ha na-akpa. Ha nwere ike ịmụta àgwà ọma ma ọ bụ àgwà ọjọọ n’aka ha, ma hà na-ahụ ihu na ihu ma hà na-akpa n’Ịntanet. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị na “onye ya na ndị ma ihe na-akpa ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu [ya bụ, ndị na-ahụghị Jehova n’anya] na-emekọ ihe.” (Ilu 13:20) Ọ bụrụ na ndị enyi gị hụrụ Jehova n’anya ma na-efe ya, ha nwere ike ime ka gị na ya dịkwuo ná mma, nyekwara gị aka ịna-eme ihe dị mma. Ma, ọ bụrụ na ndị enyi anyị ahụghị Jehova n’anya, ha nwere ike ime ka anyị na ya gharazie ịdị ná mma. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị saa anya ná mmiri mgbe anyị na-emete ndị enyi. Ọ bụrụ na ndị enyi anyị hụrụ Chineke n’anya, anyị ga-amụta ihe n’aka ha, hanwa ga-amụtakwa ihe n’aka anyị. Anyị na ha ga ‘na-agba ibe anyị ume ma na-eme ka ibe anyị dị ike.’​—1 Ndị Tesalonaịka 5:11.

  • Olee Ihe Ị Ga-eme Ka Ihe Ị Na-ekwu Na-atọ Jehova Ụtọ?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • E nwere ọmarịcha onyinye Jehova nyere anyị mgbe o kere anyị. Onyinye ahụ bụ na o kere anyị ka anyị na-ekwu okwu. Ọ̀ na-achọ ịma ihe anyị ji onyinye a o nyere anyị na-eme? N’eziokwu, ọ na-achọ. (Gụọ Jems 1:26.) Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ihe anyị na-ekwu na-atọ Jehova ụtọ?

      1. Gịnị ka anyị kwesịrị iji onyinye ahụ na-eme?

      Baịbụl gwara anyị, sị: “Na-agbanụ ibe unu ume ma na-emenụ ka ibe unu dị ike.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:​11) Ò nwere ndị i chetara i nwere ike ịgba ume? Olee otú ị ga-esi gbaa ha ume? Mee ka obi sie ha ike na ị hụrụ ha n’anya. I nwere ike ịgwa ha ihe mere i ji hụ ha n’anya. Ò nwere amaokwu Baịbụl i chetara ị ga-eji gbaa mmadụ ume? E nwere ọtụtụ amaokwu Baịbụl i nwere ike isi na ha họrọ ndị nke ị ga-eji gbaa mmadụ ume. Chetakwa na otú i si kwuo okwu nwere ike ịgba mmadụ ume. N’ihi ya, ị na-agwa mmadụ okwu, gbalịa wetuo obi ala, jirikwa olu ọma.​—Ilu 15:1.

      2. Olee ụdị okwu anyị na-ekwesịghị ịna-ekwu?

      Baịbụl kwuru, sị: “Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta.” (Gụọ Ndị Efesọs 4:29.) Ihe a o kwuru pụtara na anyị ekwesịghị ịna-ekwu okwu na-adịghị mma. Anyị ekwesịghịkwa ịna-ekwu ihe nwere ike imenye mmadụ ihere ma ọ bụ gbuo mmụọ ya. Anyị ga-ezerekwa ịgba asịrị na ikwutọ mmadụ.​—Gụọ Ilu 16:28.

      3. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-ekwu okwu otú ga-agba ndị ọzọ ume?

      Ihe ndị anyị na-akpụkarị n’ọnụ na-egosi otú anyị si ele ihe anya na ihe ndị dị anyị n’obi. (Luk 6:45) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị na-eche ihe ndị dị mma, ya bụ, ihe ndị ziri ezi, ihe ndị dị ọcha, ihe ndị na-eme ka mmadụ hụ ibe ya n’anya, na ihe ndị kwesịrị otuto. (Ndị Filipaị 4:8) Ihe ga-enyere anyị aka ịna-eche ihe ndị a bụ ịkpachara anya n’ihe ndị anyị ji eme onwe anyị obi ụtọ nakwa ụdị ndị anyị na-emete enyi. (Ilu 13:20) Ihe ọzọ ga-enyere anyị aka bụ ịna-eche ihe anyị chọrọ ikwu eche. Chee otú obi ga-adị ndị ọzọ n’ihi ihe i kwuru. Baịbụl kwuru, sị: “Okwu mmadụ kwuru n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ, ma okwu ndị ma ihe na-agwọ mmadụ.”​—Ilu 12:18.

      MỤTAKWUO IHE

      Chọpụta otú ị ga-esi mee ka ihe ị na-ekwu na-atọ Jehova ụtọ, na-agbakwa ndị ọzọ ume.

      4. Na-eche ihe ị ga-ekwu eche

      Mgbe ụfọdụ, anyị na-ekwu ihe anyị na-emecha kwaara ụta. (Jems 3:2) Gụọnụ Ndị Galeshia 5:22, 23. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Ị chọọ ịna-eche ihe ị na-ekwu eche, olee nke n’ime àgwà ndị a kpọrọ aha ebe a ị ga-arịọ Jehova ka o nyere gị aka ịna-akpa? Olee otú àgwà ndị a nwere ike isi nyere gị aka?

      Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 15:33. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Olee ụdị okwu mmadụ nwere ike ịna-ekwu ma ọ bụrụ na ya na ndị ọjọọ na-akpa ma ọ bụ na o ji ihe na-adịghị mma eme onwe ya obi ụtọ?

      Foto abụọ na-egosi ihe ndị mere ka otu nwoke malite ịgwa nwunye ya okwu ọjọọ. 1. Ebe ọ na-ege egwú na-adịghị mma. 2. Ebe ya na otu enyi ya ji uche ha niile na-ele ndị na-akụ ọkpọ na tiivi. Foto abụọ na-egosi ihe ndị mere ka otu nwoke ahụ malitekwa iji olu ọma na-agwa nwunye ya okwu. 1. Ebe ọ na-agụ Baịbụl. 2. Ebe ya na nwunye ya na otu enyi ha na-akparịta ụka n’ọmụmụ ihe.

      Gịnị nwere ike ime ka otú i si ekwu okwu gbanwee?

      Gụọnụ Ekliziastis 3:1, 7. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Olee mgbe mmadụ kwesịrị ịgba nkịtị ma ọ bụkwanụ mgbe o nwere ike ichere ruo oge ọzọ ka mma ọ ga-ekwu ihe ọ chọro ikwu?

      5. Na-ekwu ihe dị mma gbasara ndị ọzọ

      Olee ihe anyị nwere ike ime ka anyị ghara ịna-agwa ndị ọzọ okwu ọjọọ ma ọ bụ okwu ga-emenye ha ihere? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      VIDIO: Na-ekwu “Okwu Dị Mma” Maka Iwuli Ndị Ọzọ Elu (4:07)

      • Gịnị mere nwanna a anyị lere na vidio ji chọọ ịgbanwe ihe ndị ọ na-ekwu gbasara ndị ọzọ?

      • Gịnị ka o mere nyeere ya aka ịgbanwe?

      Gụọnụ Ekliziastis 7:16. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • E nwee ihe mere ka anyị chọọ ikwu ihe na-adịghị mma gbasara onye ọzọ, gịnị ka anyị kwesịrị icheta?

      Gụọnụ Ekliziastis 7:21, 22. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Olee otú amaokwu abụọ a nwere ike isi nyere gị aka ka ị ghara iwe iwe ma mmadụ kwuo ihe na-adịghị mma gbasara gị?

      6. Jiri olu ọma na-agwa ndị ezinụlọ unu okwu

      Jehova chọrọ ka anyị jiri olu ọma na-agwa ndị ezinụlọ anyị okwu, na-agwakwa ha okwu otú gosiri na anyị hụrụ ha n’anya. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      VIDIO: Ịhụnanya na Nkwanye Ùgwù Na-eme Ka Ezinụlọ Dịrị n’Otu (3:08)

      • Olee ihe ga-enyere gị aka ịna-eji olu ọma agwa ndị ezinụlọ unu okwu?

      Gụọnụ Ndị Efesọs 4:31, 32. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Olee ụdị okwu na-eme ka udo dịrị n’ezinụlọ?

      Jehova kwuru otú ihe Ọkpara ya bụ́ Jizọs dị ya. Gụọnụ Matiu 17:5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Olee otú i nwere ike isi na-eme ụdị ihe a Jehova mere ma ị na-agwa ndị ezinụlọ unu okwu?

      Ebe otu nne na-aja nwa ya nwaanyị mma maka ihe o sere n’akwụkwọ.

      Na-eleru anya ka ị chọpụta mgbe ị ga-aja mmadụ mma

      ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ha na-agwa ndị ọzọ otú ọ dị ha n’obi, na ha achọghị ịma ma ọ̀ dị ha mma ma ọ bụ na ọ dịghị ha mma.

      • Ihe a ha na-ekwu ọ̀ dị mma? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?

      NCHỊKỌTA

      Ihe anyị kwuru nwere ike ịgba mmadụ ume ma ọ bụ wee ya iwe. Anyị kwesịrị ịna-echebara ihe anyị chọrọ ikwu echiche, chebakwara mgbe anyị chọrọ ikwu ya na otú anyị chọrọ isi ekwu ya echiche.

      Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

      • Olee ụzọ ndị i nwere ike isi jiri ihe ị na-ekwu nyere ndị ọzọ aka?

      • Olee ụdị okwu ị na-ekwesịghị ịna-ekwu?

      • Gịnị nwere ike inyere anyị aka iji olu ọma na-agwa ndị ọzọ okwu, na-agwakwa ha ya otú ga-agba ha ume?

      Ihe ị ga-agba mbọ mee

      IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

      Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịna-ekwu ihe ga-agba ndị ọzọ ume?

      Nweenụ Ire Ndị Maara Ihe (8:04)

      Chọpụta ihe nwere ike inyere gị aka ka ị ghara ịna-ekwu okwu ọjọọ.

      “Ịkpọ Mmadụ Iyi Ọ̀ Dị Njọ nke Otú Ahụ?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

      Chọpụta ihe ị ga-eme ka ị ghara ịna-agba asịrị.

      Gịnị Ga-enyere M Aka Ịkwụsị Ịgba Asịrị? (2:36)

      E nwere otu nwoke ịkwụsị ịkpọ ndị mmadụ iyi siiri ike. Chọpụta otú Jehova si nyere ya aka ya emechaa kwụsị ya.

      “M Malitere Ichesi Echiche Ike ma Ò nwere Uru Ndụ M Na-ebi Baara M” (Ụlọ Nche, Ọgọst 1, 2013)

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya