‘Ka Ọ Ghara Iwute Unu Dị Ka Ọ Na-ewute Ndị Ọzọ’
Ị̀HỤTỤWO ụzọ okooko osisi si eme ka o huuru ehuru mgbe ọ lanarịsịrị oké ifufe? N’otu ụzọ ọ bụ ihe nkiri na-emetụ n’ahụ. E kwuwerị, oké ntiwapụ ikuku ahụ chụlagasịrị ọtụtụ anụmanụ na ụmụ mmadụ—ihe ndị e kesiri ike karịa okooko osisi—ịchọ ebe mgbaba. Ma, okooko osisi guzooro ebe ahụ, gbagide mkpọrọgwụ, na-anagide oké iwe nile nke ọnọdụ ihu igwe ahụ. Ugbu a, n’ebe a ka ọ nọ n’enweghị ihe mere ya, hulata isi ya ma ghara ịgbaji agbaji, na-egosipụta ike nke dị iche site n’ọdịdị ya nke ịdị pekepeke. Ka ị na-ekiri ya, ị pụrụ iche ma ọ̀ ga-enweghachi ike ya ma bulie isi ọma ya elu na-ele ihu igwe ọzọ.
Ọ bụ otú ahụ ka ọ dịkarịrị n’ebe ụmụ mmadụ nọ. N’oge nsogbu ndị a, anyị na-eche ụdị oké ifufe dị iche iche ihu. Ihe isi ike ọnọdụ akụ̀ na ụba, nkụda mmụọ, ahụ ike na-adịwanye njọ, onye a hụrụ n’anya ịnwụnahụ mmadụ—ajọ ifufe ndị dị otú ahụ na-awụkwasị anyị nile n’otu oge ma ọ bụ n’oge ọzọ, mgbe ụfọdụkwa anyị apụghị izere ha dị ka okooko osisi na-apụghị ifopụ onwe ya ma gbalaga maka nchebe. Ọ na-akpali akpali ịhụ ndị mmadụ yiri ka ha ga-agbaji nnọọ agbaji ka ha na-egosipụta ume dị ịtụnanya ma na-anagide mwakpo ndị dị otú ahụ. Olee otú ha si na-eme ya? Ọtụtụ mgbe isi ihe dị na ya bụ okwukwe. Nwanne Jisọs Kraịst otu nne ji ha abụọ bụ́ Jemes dere, sị: “Unu maara na mgbe okwukwe unu nwere ihe ịga nke ọma n’iche ule ndị dị otú ahụ ihu, ihe ọ na-arụpụta bụ ikike ịtachi obi.”—Jemes 1:3, Today’s English Version.
Isi ihe ọzọ bụ olileanya. Dị ka ihe atụ, mgbe ọnwụ dakwasịrị onye a hụrụ n’anya, olileanya pụrụ ime ka e nwee oké ọdịiche nye ndị mmadụ nwụnahụrụ. Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst nọ na Tesalọnaịka akwụkwọ, sị: “Anyị achọghị ka unu ghara ịmara ihe banyere ndị na-ada n’ụra ọnwụ, ụmụnna anyị; ka o wee ghara iwute unu, ọbụna dị ka ọ na-ewute ndị fọdụrụ, ndị na-enweghị olileanya.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:13) Ọ bụ nnọọ ezie na ndị Kraịst na-eru újú n’ihi ọnwụ, e nwere ọdịiche. Ha nwere ezi ihe ọmụma banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ na banyere olileanya nke mbilite n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15.
Ihe ọmụma nke a na-enye ha olileanya. Olileanya ahụkwa, n’akụkụ nke ya, na-eji nwayọọ nwayọọ na-ebelata iru újú ha. Ọ na-enyere ha aka ịtachi obi, meekwa karịa otú ahụ. Ka oge na-aga, dị ka okooko osisi ahụ mgbe oké ifufe gasịrị, ha pụrụ ibuli isi ha elu site n’iru újú ma chọta ọṅụ na afọ ojuju ná ndụ ọzọkwa.