Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Dị Nso!
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
    • 3 Otu amụma Bible na-adọrọ mmasị kwuru na oge ga-abịa mgbe ndị ndú ụwa ga-akpọsa “Udo na ntụkwasị obi” n’ezie!a N’ezie, mgbe òtù United Nations kpọsara 1986 dị ka “Afọ Udo nke Mba Nile” ọ rịọrọ ka ndị òtù dị iche iche n’ebe nile tinye mgbalị pụrụ iche site n’afọ ahụ gaa n’ihu ịkwalite ihe mgbaru ọsọ nke “udo, nchebe nke mba nile na ijikọ aka ọnụ na-eme ihe.”1

      4. Ọ bụrụ na ndokwa ọ bụla maka udo na ntụkwasị obi ga-abara gị uru, olee nsogbu ndị ọ na-aghaghị ịgwọta?

      4 Ma nke a ọ̀ ga-abụ ezi “udo na ntụkwasị obi”? Ọ̀ ga-erute n’ógbè ebe i bi na n’ime ụlọ obibi gị ma gbooro gị mkpa ndị metụtara gị onwe gị? Ọ̀ ga-agwọta nsogbu ndị na-arịwanye elu nke imempụ na ọgwụ ọjọọ iri mmadụ ahụ, ọnụ ahịa ihe oriri, oké ụtụ isi, mgbasa nke mmetọ mbara, na nretọ na-aga n’ihu nke nkekọ ezinụlọ dị iche iche? Ruo n’ókè otu n’ime ọnọdụ ndị a nọgidere na-adị, ha na-eyi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke gị onwe gị egwu.

      5, 6. N’ịdabere n’ahụmahụ ndị i nwere ná ndụ, ì kwere na ụmụ mmadụ gaje ịgwọta nsogbu ndị ahụ?

      5 N’eziokwu, ụmụ mmadụ na-enwe olileanya na ha nwere ike imeri ihe isi ike ndị a. Ha na-asị na ọ bụrụ na ha enwere onwe ha pụọ n’oké ibu arọ nke ego a na-emefu n’agha, na ha pụrụ ichigharị akụ na ụba, ọkà nchọpụta nile na ikike ụmụ mmadụ ndị ahụ nile ihu iji merie nsogbu nile ndị ahụ.

      6 Ì kwere nke ahụ n’ezie? È nwere ihe àmà gbara ọkpụrụkpụ iji gosi na ụmụ mmadụ pụrụ nnọọ iweta ihe ngwọta ndị na-adịgide adịgide? Gịnị ka akụkọ ihe mere eme na-egosi? N’eziokwu, gịnị ka ahụmahụ nke gị onwe gị ná ndụ na-agwa gị?

  • Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Dị Nso!
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
    • 10 Ọ dị mma ịmata na amụma Bible maka “udo na ntụkwasị obi” nke e hotara na mbụ gụnyere ihe ndị a: “Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:3) Ya mere o doro anya na udo na ntụkwasị obi ọ bụla ndị ndú ụwa na-akpọsa ga-abụ maka oge dị oké mkpirikpi. N’ihi na amụma dị iche iche na-egosi na ngwa ngwa nke a gasịrị, a ga-etipịa ọchịchị nile nke mmadụ pụọ n’ịdị adị, a ga-ejikwa otu ọchịchị ga-achị ụwa nile—bụ́ Alaeze Chineke—dochie ha.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya