Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w09 5/1 p. 8-9
  • 4 Kwụsị Inwe Obi Abụọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 4 Kwụsị Inwe Obi Abụọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Nyere M Aka n’Ebe Ọ Dị M Mkpa Inwekwu Okwukwe!’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ì Nwere Okwukwe N’ezie N’ozi Ọma Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • ‘Guzosie Ike n’Okwukwe’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
w09 5/1 p. 8-9

4 Kwụsị Inwe Obi Abụọ

“Gị onye okwukwe nta, gịnị mere i ji nwewe obi abụọ?”—Matiu 14:31.

OLEE IHE MERE O JI ESI IKE? Ọbụna ndị na-eso ụzọ Jizọs nwere obi abụọ mgbe ụfọdụ. (Matiu 14:30; Luk 24:36-39; Jọn 20:24, 25) N’eziokwu, Baịbụl kwuru na enweghị okwukwe bụ ‘mmehie nke na-ekegidekarị anyị.’ (Ndị Hibru 12:1) Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụghị mmadụ niile nwere okwukwe.” (2 Ndị Tesalonaịka 3:2) Ọ pụtaghị na o nwere ndị na-agaghị enweli okwukwe. Kama nke ahụ, ihe ọ pụtara bụ na ọtụtụ ndị anaghị agba mbọ ka ha nwee okwukwe. Chineke ga-agọzi mgbalị nke ndị na-agba mbọ ka ha nwee okwukwe.

OLEE OTÚ Ị GA-ESI MERIE YA? Chọpụta ihe ndị mere i ji enwe obi abụọ. Dị ka ihe atụ, onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Tọmọs ekwetaghị na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ, n’agbanyeghị na ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ kwuru na ha ahụla ya. Ihe Tọmọs chọrọ bụ ihe akaebe. Gịnị meziri? Jizọs gosiri ya ihe akaebe dị ya mkpa nke ga-eme ka o nwee okwukwe siri ike.—Jọn 20:24-29.

Jehova Chineke ji Baịbụl zaa ajụjụ niile nwere ike ime ka anyị nwee obi abụọ. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-akwụsị inwe okwukwe na Chineke maka na ha kweere na ọ bụ Chineke na-akpata agha, ime ihe ike, na nhụjuanya ndị na-emekpọ ụmụ mmadụ ọnụ ma ọ bụkwanụ na aka ya dị na ha. Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere nke a?

Chineke esighị n’aka ọchịchị ụmụ mmadụ na-achị. Jizọs kwuru na ọ bụ mmụọ a na-anaghị ahụ anya, bụ́ Setan, bụ “onye na-achị ụwa.” (Jọn 14:30) Setan gwara Jizọs na ya ga-enye ya ikike ịchị alaeze niile nke ụwa ma ọ bụrụ na o fee ya ofufe. Ọ sịrị ya: “M ga-enye gị ikike a niile na ebube ha, n’ihi na e nyefewo ha n’aka m, ọ bụkwa onye ọ bụla m chọrọ ka m na-enye ya.” Jizọs ekwughị na ọ bụghị Setan nwe ikike ahụ. Kama nke ahụ, Ọ sịrị: “E dere, sị, ‘Ọ bụ Jehova Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.’” (Luk 4:5-8) Ọ bụ Setan na ọchịchị ụmụ mmadụ na-akpata nhụjuanya dị n’ụwa, ọ bụghị Chineke.—Mkpughe 12:9, 12.

N’oge na-adịghị anya, Jehova Chineke ga-ewepụ ihe niile na-akpata nhụjuanya. O meela ndokwa ka Alaeze, ma ọ bụ ọchịchị, Ọkpara ya, bụ́ Kraịst Jizọs, bụ eze ya, chịa ụmụ mmadụ. (Matiu 6:9, 10; 1 Ndị Kọrịnt 15:20-28) Ugbu a, a na-ekwusa ozi ọma banyere Alaeze a n’ụwa dum, dị ka Baịbụl buru n’amụma. (Matiu 24:14) N’oge na-adịghị anya, Alaeze a ga-ebibi ndị niile na-emegide ya, wepụkwa ihe ndị na-akpata ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata.—Daniel 2:44; Matiu 25:31-33, 46; Mkpughe 21:3, 4.

GỊNỊ GA-ABỤ ỤGWỌ ỌRỤ GỊ? Ndị na-enwe obi abụọ yiri ebili mmiri “ifufe ozizi ọ bụla na-ebugharị, site n’aghụghọ nke ụmụ mmadụ.” (Ndị Efesọs 4:14; 2 Pita 2:1) Ma, ndị a zara ajụjụ ha nke ọma na-enwe ike ‘iguzosi ike n’okwukwe.’—1 Ndị Kọrịnt 16:13.

Ọ ga-amasị Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-ebipụta magazin a, inyere gị aka inweta azịza nke ajụjụ ndị nwere ike ime ka i nwewe obi abụọ. Ha na-akpọ gị òkù ka ị bịa ha nso ma jiri aka gị nyochaa ozizi ha. Okwukwe i nwere na Chineke ga-esikwu nnọọ ike ma ọ bụrụ na i mee otú ahụ.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu isiokwu a, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Alaeze Chineke?,” n’isi nke 8 nakwa isiokwu bụ́ “N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?,” n’isi nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?a

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Foto dị na peeji nke 9]

Ndị a zara ajụjụ ha nke ọma na-ahụ ezigbo ihe mere ha ga-eji nwee okwukwe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya