A Ga-anwale Okwukwe Ndị Kraịst
“Ọ bụghị mmadụ nile nwere okwukwe.”—2 NDỊ TESALỌNAỊKA 3:2.
1. Olee otú akụkọ ihe mere eme siworo gosi na ọ bụghị mmadụ nile nwere ezi okwukwe?
N’AKỤKỌ ihe mere eme nile, e nwewo ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka ndị nwere ezi okwukwe. Nkọwaaha ahụ bụ́ “ezi” dabara adaba n’ihi na ọtụtụ nde ndị ọzọ egosipụtawo ụdị okwukwe yiworo ikwere ihe n’ajụghị ase, ịdị njikere ikwere n’enweghị ezi ihe ndabere ma ọ bụ ezi ihe mere a ga-eji mee otú ahụ. Ọtụtụ mgbe, okwukwe dị otú ahụ abụrụwo banyere chi ụgha ma ọ bụ ụdị ofufe ndị Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, na Okwu ya e kpughere ekpughe na-anabataghị. N’ihi ya Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụghị mmadụ nile nwere okwukwe.”—2 Ndị Tesalọnaịka 3:2.
2. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị nyochaa okwukwe nke anyị?
2 Ma okwu Pọl na-egosi na laa azụ n’oge ahụ, ụfọdụ nwere ezi okwukwe, na-egosikwa na ụfọdụ nwere taa. Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-agụ akwụkwọ a nwere ọchịchọ inwe na ito eto n’ezi okwukwe dị otú ahụ—okwukwe ya na ezi ihe ọmụma nke eziokwu Chineke kwekọrọ. (Jọn 18:37; Ndị Hibru 11:6) Ọ̀ dị otú ahụ n’ebe ị nọ? Mgbe ahụ ọ dị mkpa ka ị mata ma dị njikere n’ihi eziokwu ahụ bụ́ na a ga-anwale okwukwe gị. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo nke ahụ?
3, 4. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji legara Jisọs anya n’ihe metụtara ule nke okwukwe?
3 Anyị aghaghị ikwere na okwukwe anyị hiwere isi n’ebe Jisọs Kraịst nọ. N’ezie, Bible na-ekwu banyere ya dị ka Onye Mmezu nke okwukwe anyị. Nke ahụ bụ n’ihi ihe Jisọs kwuru ma mee, karịsịa otú o si mezuo amụma. O mere ka ihe ndabere nke ndị mmadụ pụrụ ịgbakwasị ụkwụ wee wulite ezi okwukwe sie ike. (Ndị Hibru 12:2; Mkpughe 1:1, 2) Ma, anyị na-agụ na Jisọs bụ onye “a nwaworo n’ihe nile n’otu ụzọ ahụ a na-anwa anyị, ma O mehieghị.” (Ndị Hibru 4:15) Ee, a nwalere okwukwe Jisọs. Kama ịkụda anyị mmụọ ma ọ bụ imenye anyị egwu, nke ahụ kwesịrị ịkasi anyị obi.
4 Site n’ịgabiga ule ndị siri ike ọbụna ruo n’ókè nke ịnwụ n’elu osisi, Jisọs “mụtara ịṅa ntị.” (Ndị Hibru 5:8) Ọ nwapụtara na ụmụ mmadụ pụrụ ịdị ndụ n’ezi okwukwe n’agbanyeghị ule ọ bụla nke pụrụ ịbịakwasị ha. Nke a na-enwe ihe pụrụ iche ọ pụtara mgbe anyị chere echiche banyere ihe Jisọs kwuru banyere ụmụazụ ya: “Chetanụ okwu Mụ onwe m gwara unu, Ohu adịghị aka onye nwe ya ukwuu.” (Jọn 15:20) N’ezie, banyere ụmụazụ ya n’oge anyị, Jisọs buru amụma, sị: “Mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.”—Matiu 24:9.
5. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si egosi na anyị ga-eche ule ihu?
5 Ná mmalite narị afọ a, ikpe si n’ụlọ Chineke malite. Akwụkwọ Nsọ bu ụzọ kwuo, sị: “Oge ahụ eruwo ka e site n’ụlọ Chineke malite ikpe ikpe: ma ọ bụrụ na o buru ụzọ site n’ahụ anyị malite, gịnị ga-abụ ọgwụgwụ nke ndị na-ekwenyeghị ozi ọma nke Chineke? Ọ bụrụkwa na ọ dị ike ịzọpụta onye ezi omume, olee ebe a ga-egosi onye na-adịghị asọpụrụ Chineke na onye mmehie?”—1 Pita 4:17, 18.
A Na-anwale Okwukwe—n’Ihi Gịnị?
6. N’ihi gịni ka okwukwe a nwalere anwale ji baa oké uru?
6 N’otu echiche, okwukwe a na-anwalebeghị enweghị uru a nwapụtara anwapụta, ọdịdị ya nọgidekwara bụrụ nke a na-amaghị. Ị pụrụ iji ya tụnyere akwụkwọ ndọrọ ego a na-adọrọbeghị ego ya. Ị pụrụ ịnatawo akwụkwọ ndọrọ ego maka ọrụ ị rụrụ, maka ngwá ahịa ndị i bunyere mmadụ, ma ọ bụ ọbụna dị ka onyinye. Akwụkwọ ndọrọ ego ahụ pụrụ iyi ka ọ dị mma, ma ọ̀ dị? Ò ruru n’ezie ego ole e dere na ya? N’otu aka ahụ, okwukwe anyị aghaghị ịkarị nanị ọdịdị a na-ahụ anya ma ọ bụ nkwupụta efu. A ghaghị ịnwale ya ma ọ bụrụ na anyị ga-anwapụta na ọ bara uru, nweekwa ọdịdị bụ ezie. Mgbe a nwalere okwukwe anyị, anyị pụrụ ịchọpụta na o siri ike ma baakwa uru. Ule pụkwara ikpughe ebe ọ bụla ndị okwukwe anyị chọrọ nnụcha na mwusiwanye ike.
7, 8. N’ole ebe ka ule nke okwukwe anyị si abịa?
7 Chineke na-ekwe ka mkpagbu na ule ndị ọzọ nke okwukwe bịakwasị anyị. Anyị na-agụ, sị: “Ka onye ọ bụla ghara ịsị, mgbe a na-anwa ya, A na-esite n’aka Chineke anwa m: n’ihi na Chineke bụ Onye a na-apụghị iwere ihe ọjọọ nwaa Ya, Ya onwe ya adịghị anwakwa onye ọ bụla.” (Jemes 1:13) Ònye ma ọ bụ gịnị na-akpata ọnwụnwa ndị dị otú ahụ? Ọ bụ Setan, ụwa, na anụ ahụ anyị na-ezughị okè.
8 Anyị pụrụ ikweta na Setan na-enwe mmetụta dị ike n’elu ụwa, n’echiche ya na n’ụzọ ya dum. (1 Jọn 5:19) E leghị anya anyị makwa na ọ na-akpalite mkpagbu megide ndị Kraịst. (Mkpughe 12:17) Ma ànyị kwesikwara ike na Setan na-anwa iduhie anyị site n’iji anụ ahụ anyị na-ezughị okè eme ihe, na-eche anyị ihe ndọrọ ụwa n’ihu, na-enwe olileanya na anyị ga-adaba n’ọnyà ahụ, nupụrụ Chineke isi, wee bụrụ ndị Jehova jụrụ? N’ezie, ụzọ ime ihe Setan ekwesịghị iju anyị anya, n’ihi na o jiri otu ụzọ aghụghọ ahụ mee ihe mgbe ọ na agbalị ịnwata Jisọs.—Matiu 4:1-11.
9. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe atụ dị iche iche nke okwukwe?
9 Site n’Okwu ya na ọgbakọ ndị Kraịst, Jehova na-esetịpụ n’ihu anyị ihe atụ ndị dị mma nke okwukwe anyị pụrụ iṅomi. Pọl dụrụ ọdụ, sị: “Ụmụnna m, dịnụ n’otu n’iṅomi m, na-elekwanụ ndị na-ejegharị otú a, otú unu nwere anyị dị ka ihe atụ.” (Ndị Filipaị 3:17) Dị ka otu n’ime ndị ohu Chineke e tere mmanụ na narị afọ mbụ, Pọl butere ụzọ n’ịrụ ọrụ okwukwe n’agbanyeghị ule ndị siri ike ọ gabigara. Ruo ná ngwụsị nke narị afọ nke 20, anyị anọghị n’ụkọ nke ihe atụ nke okwukwe a pụrụ iji tụnyere ndị ahụ. Okwu ndị nke Ndị Hibru 13:7 na-ekwekọ nnọọ ugbu a dị ka ọ dị n’oge Pọl dere ha: “Na-echetanụ ndị isi unu, bụ́ mmadụ ndị gwara unu okwu Chineke; na-ekirikwanụ ọpụpụ nke ibi obi ha, na-eṅomikwanụ okwukwe ha.”
10. Olee kpọmkwem ihe atụ nke okwukwe ndị anyị nwere n’oge ndị na-adịbeghị anya?
10 Ndụmọdụ ahụ nwere ikike pụrụ iche mgbe anyị tụlere otú omume nke ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ siworo dị. Anyị pụrụ ịtụgharị uche n’ihe atụ ha ma ṅomie okwukwe ha. Ha nwere ezi okwukwe e jiworo ule nụchaa. N’inwe mmalite ndị dị nta laa azụ n’afọ ndị 1870, òtù ụmụnna ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ tolitere. Dị ka mkpụrụ sitere n’okwukwe na ntachi obi nke ihe ahụ e tere mmanụ site n’oge ahụ gaa n’ihu, ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova ise na ọkara na-eme nkwusa ma na-ezi ihe ugbu a banyere Alaeze Chineke. Ọgbakọ zuru ụwa ọnụ dị ugbu a nke ezi ndị ji ịnụ okụ n’obi na-efe ofufe bụ ihe nnwapụta nke okwukwe a nwalere anwale.—Taịtọs 2:14.
A Nwalee Okwukwe n’Ihe Metụtara 1914
11. Olee otú 1914 si dị ịrịba ama nye C. T. Russell na ndị enyi ya?
11 Ọtụtụ afọ tupu ntiwapụ nke Agha Ụwa Mbụ, ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ anọwo na-akpọsa na 1914 ga-abụ oge dị ịrịba ama n’amụma Bible. Otú ọ dị, atụmanya ha ụfọdụ bụ nke oge ha na-erubeghị, echiche ha banyere ihe ga-eme ezughịkwa okè. Dị ka ihe atụ, C. T. Russell, onyeisi oche mbụ nke Watch Tower Society, ya na ndị enyi ya hụrụ na ọrụ ime nkwusa dị ukwuu dị mkpa. Ha gụrụ: “A ga-ekwusa oziọma nke a nke Alaeze n’ụwa nile, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14, King James Version) Otú ọ dị, olee otú ìgwè ha dị nnọọ nta pụrụ isi mee nke ahụ?
12. Olee otú otu n’ime ndị enyi Russell si zaghachi n’eziokwu Bible?
12 Tụlee otú nke a si nwee mmetụta n’ahụ A. H. Macmillan, bụ́ enyi Russell. N’ịbụ onye a mụrụ na Canada, Macmillan erubeghị afọ 20 mgbe ọ natara akwụkwọ Russell bụ́ The Plan of the Ages (1886). (Akwụkwọ a, a kpọkwara The Divine Plan of the Ages, ghọrọ Mpịakọta nke 1 nke mbipụta ahụ e kesara n’ọtụtụ ebe bụ́ Studies in the Scriptures. Mpịakọta nke 2, bụ́ The Time Is at Hand [1889], zoro aka na 1914 dị ka ọgwụgwụ nke “oge ndị Jentaịl.” [Luk 21:24, KJ]) N’otu abalị ahụ Macmillan malitere ịgụ ya, o chere: “Nke ahụ dara ka eziokwu!” N’oge okpomọkụ nke 1900, o zutere Russell n’otu mgbakọ nke Ndị Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ. N’oge na-adịghị anya e mere Macmillan baptism, ọ malitekwara iso Nwanna Russell na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ Society dị na New York.
13. Nsogbu dị aṅaa ka Macmillan na ndị ọzọ hụrụ n’ihe banyere mmezu nke Matiu 24:14?
13 Na-adabere n’ọgụgụ Bible ha, ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ zoro aka na 1914 dị ka oge a ga-enwe mgbanwe dị ịrịba ama ná nzube Chineke. Ma Macmillan na ndị ọzọ chere echiche otú a pụrụ isi mezuo nkwusa ahụ e buru n’amụma na Matiu 24:14 ná mba nile n’ime mkpirikpi oge fọdụrụnụ. O mesịrị kwuo, sị: “Echetara m iso Nwanna Russell kwurita nke ahụ mgbe mgbe, ọ ga-asịkwa, ‘Nwanna, kpọmkwem na New York anyị nwere ọtụtụ ndị Juu karịa ka ọ dị na Jerusalem. Anyị nwere ndị si Ireland n’ebe a karịa ka e nwere na Dublin. Anyị nwekwara ndị Itali karịa ka e nwere na Rom. Ugbu a ọ bụrụ na anyị ejekwuru ha ebe a, nke ahụ ga-abụ iji ozi ahụ jezuo ụwa.’ Ma nke ahụ eyighị ka o juru anyị afọ. Ya mere, e cheziri banyere ‘Foto Ihe Nkiri.’”
14. Tupu 1914, ọrụ dị aṅaa pụrụ iche ka a malitere?
14 Lee ihe ọhụrụ “Foto Ihe Nkiri nke Okike” ahụ bụ! O jikọtara sinima na ugegbe slide tụrụ àgwà, nke e mere ka ya na okwu Bible na egwú na-agakọ na rekọd phonograph. Na 1913, Ụlọ Nche kwuru banyere otu mgbakọ n’Arkansas, U.S.A., sị: “E ji otu olu kpebie na oge eruwo maka iji sinima eme ihe n’ịkụzi eziokwu Bible. . . . [Russell] kọwara na ya anọwo na-arụ ọrụ n’atụmatụ a ruo afọ atọ ma ugbu a na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ya enwetazuola ọtụtụ narị foto ndị mara mma, bụ́ ndị obi abụọ na-adịghị ya na ha ga-adọta ìgwè mmadụ dị ukwuu ma kpọsaa Oziọma ahụ, nyekwara ọha na eze aka inweghachi okwukwe na Chineke.”
15. Ihe ndị dị aṅaa ka “Foto Ihe Nkiri” ahụ rụpụtara?
15 “Foto Ihe Nkiri” mere ihe ahụ kpọmkwem mgbe e gosichara ya na nke mbụ ya na January 1914. Ihe ndị na-esonụ bụ ihe ndị Ụlọ Nche nke 1914 kọrọ:
April 1: “Otu onye ụkọchukwu, mgbe o kirisịrị akụkụ abụọ, sịrị, ‘ahụwo m nanị otu ọkara nke FOTO IHE NKIRI NKE OKIKE ahụ, ma amụtaworị m ihe banyere Bible na ya karịa ka m mụtara n’ihe ọmụmụ afọ atọ m na seminarị nkà mmụta okpukpe.’ Otu onye Juu mgbe o kirisịrị ya kwuru, sị, ‘Esi m n’ebe ahụ na-apụ na-abụ onye Juu ka mma karịa ka m bụ mgbe m batara.’ Ọtụtụ ndị ụkọchukwu na ndị nọn Katọlik abịawo kirie IHE NKIRI ahụ ma kwupụta ekele dị ukwuu. . . . Nanị usoro IHE NKIRI iri na abụọ ka zurula ezu . . . Ka o sina dị anyị eruworị ma na-ejekwa ozi n’obodo iri atọ na otu . . . Ihe karịrị puku iri atọ na ise kwa ụbọchị na-ekiri, na-anụ, na-enwe mmasị, na-eche echiche ma bụrụkwa ndị a gọziri.”
June 15: “Foto ndị ahụ emewo ka m dịkwuo uchu ịkpọsa Eziokwu ahụ, ọ mụbakwuwokwa ịhụnanya m n’ebe Nna anyị nke Eluigwe nakwa n’ebe ezi Deede anyị bụ́ Jisọs nọ. Ana m ekpe ekpere kwa ụbọchị maka ngọzi Chineke n’ụba n’ebe IHE NKIRI NKE OKIKE ahụ dị na n’ebe ndị nile na-ahụ maka ngosi ya nọ . . . Abụ m ohu unu n’ime Ya, F. W. KNOCHE.—Iowa.”
July 15: “Obi dị anyị ụtọ ịrịba ama mmetụta ọma dị ebube foto ndị ahụ nweworo n’obodo a, anyị nwekwara obi ike na a na-ejikwa àmà a a na-agbara ụwa eme ihe ịchịkọbata ọtụtụ ndị bụ́ ndị na-enye ihe àmà nke ịbụ ọla ndị Onyenwe anyị họọrọ n’onwe ya. Anyị maara nnọọ banyere ọtụtụ ndị a na-amụrụ Bible na-eme mgbalị bụ́ ndị na-eso Klas a akpakọ ugbu a n’ihi ọrụ e ji Foto Ihe Nkiri ahụ rụọ. . . . Nwanna unu nwanyị n’ime Onyenwe anyị, EMMA L. BRICKER.”
November 15: “Anyị ji n’aka na unu ga-enwe obi ụtọ ịnụ àmà magburu onwe ya e ji FOTO IHE NKIRI NKE OKIKE ahụ agba n’Ụlọ Egwú London, Kingsway. Aka nduzi nke Onyenwe anyị apụtawo nnọọ ìhè n’ụzọ dị ebube n’akụkụ nile nke ihe ngosi a nke na ụmụnna na-aṅụrị oké ọṅụ . . . Ndị mejupụtara ndị na-ege anyị ntị bụ ndị si n’ọkwá nile na ụdị mmadụ dị iche iche; anyị ahụwokwa ọtụtụ ndị ụkọchukwu n’etiti ndị bịaranụ. Otu onye osote ụkọchukwu . . . rịọrọ ka e nye ya tiketi ka ya na nwunye ya wee nwee ike ịbịa kirie ya ọzọ. Otu onye ụkọchukwu parish nke Chọọchị England abịawo kirie IHE NKIRI ahụ ọtụtụ ugboro, . . . ọ kpọtawokwa ọtụtụ ndị enyi ya ikiri ya. Ndị bishọp abụọ abịawokwa, na ọtụtụ ndị nwere ọkwá dị elu.”
December 1: “Mụ na nwunye m na-ekele Nna anyị nke Eluigwe ezi ekele maka ngọzi dị ukwuu na nke dị oké ọnụ ahịa nke bịawooro anyị site n’aka unu. Ọ bụ ọmarịcha FOTO IHE NKIRI unu bụ́ ihe mere ka anyị hụ ma nakwere Eziokwu ahụ . . . Anyị nwere mpịakọta isii unu nke STUDIES IN THE SCRIPTURES. Ha bụ ihe enyemaka dị ukwuu.”
Mmeghachi Omume Nye Ule n’Oge Ahụ
16. N’ihi gịnị ka 1914 ji weta ule nke okwukwe?
16 Otú ọ dị, gịnị ka ha mere mgbe ezi ndị Kraịst ahụ raara onwe ha nye hụrụ na atụmanya ha nke ịbụ ndị e jikọrọ ha na Onyenwe anyị na 1914 emezughị? Ndị ahụ e tere mmanụ gabigara oge ule tara akpụ. Ụlọ Nche nke November 1, 1914, kwuru, sị: “Ka anyị cheta na anyị nọ n’oge ule.” Banyere nke a, akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom (1993) na-ekwu, sị: “Afọ ndị ahụ site 1914 ruo 1918 ghọrọ, n’ezie, ‘oge ule’ nye Ndị Mmụta Bible.” Hà ga-ekwe ka a nụchaa okwukwe ha, ka a gbaziekwa echiche ha, ka ha wee nwee ike ịmalite oké ọrụ dị n’ihu?
17. Olee otú ndị kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ si meghachi omume n’ịnọgide n’ụwa gafee 1914?
17 Ụlọ Nche nke September 1, 1916, kwuru, sị: “Anyị chere na a ga-arụzu ọrụ Owuwe Ihe Ubi nke ịchịkọta Chọọchị ahụ [ndị e tere mmanụ] tupu ngwụsị nke Oge Ndị Jentaịl; ma ọ dịghị ihe dị n’ime Bible kwuru otú ahụ. . . . Ànyị na-akwa ụta na ọrụ Owuwe Ihe Ubi ahụ na-aga n’ihu? . . . Ezi ụmụnna anyị, àgwà anyị ugbu a kwesịrị ịbụ nke nnukwu obi ekele nye Chineke, nghọta na-amụba amụba nke ọmarịcha Eziokwu nke O nyeworo anyị ihe ùgwù ịhụ na ịbụ ndị e ji ya mara, na ịnụ ọkụ n’obi na-amụba amụba n’inye aka ime ka ndị ọzọ mara banyere Eziokwu ahụ.” E tinyewo okwukwe ha n’ule, ma ha chere ule ahụ ihu ma merie ya n’ụzọ gara nke ọma. Ma anyị bụ́ ndị Kraịst kwesịrị ịmara na ule nke okwukwe pụrụ ịdị ọtụtụ ma dịgasịa iche.
18, 19. Olee ule nke okwukwe ndị ọzọ sochiri maka ndị Chineke n’oge na-adịghị anya Nwanna Russell nwụsịrị?
18 Dị ka ihe atụ, ụdị ule ọzọ bịakwasịrị ihe ahụ fọdụrụnụ n’oge na-adịghị anya mgbe Nwanna Charles T. Russell nwụsịrị. Nke ahụ bụ ule nke iguzosi ike n’ihe na nke okwukwe ha. Ònye bụ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi” nke Matiu 24:45? Ụfọdụ chere na ọ bụ Nwanna Russell n’onwe ya, ha jụkwara ikwenyere ndokwa ndị ọhụrụ e mere n’ime nzukọ. Ọ bụrụ na ọ bụ ya bụ ohu ahụ, gịnị ka ụmụnna ahụ ga-eme ugbu a ọ nwụworo? Hà kwesịrị ịgbaso otu onye a họpụtara ọhụrụ, ka ọ̀ bụ oge ugbu a ịmata na Jehova na-eji, ọ bụghị nanị otu onye, kama otu ìgwè dum nke ndị Kraịst eme ihe dị ka ngwá ọrụ, ma ọ bụ òtù ohu?
19 Ule ọzọ bịakwasịrị ezi ndị Kraịst na 1918 mgbe ndị ọchịchị ụwa, n’ịbụ ndị ndị ụkọchukwu Krisendọm kpaliri, ‘jiri iwu kpụzie mmegbu’ megide nzukọ Jehova. (Abụ Ọma 94:20, KJ) A malitere ọtụtụ mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ megide Ndị Mmụta Bible ma n’Ebe Ugwu America ma na Europe. Mmegide ahụ ndị ndú okpukpe kpaliri ruru n’isi na May 7, 1918, mgbe gọọmenti etiti United States nyere iwu ijide J. F. Rutherford na ezi ndị enyi ya ndị ọzọ, tinyere A. H. Macmillan. E boro ha ebubo ụgha nke ịgba ọchịchị mgba okpuru, ndị isi leghakwaara arịrịọ ha nke na aka ha dị ọcha anya.
20, 21. Dị ka e buru n’amụma na Malakaị 3:1-3, ọrụ dị aṅaa ka a rụrụ n’etiti ihe ahụ e tere mmanụ?
20 Ọ bụ ezie na a mataghị ya otu ahụ mgbe ahụ, ọrụ ime nnụcha na-aga n’ihu, dị ka a kọwara na Malakaị 3:1-3: “Ònye ga-anagide ụbọchị ọbịbịa Ya? ọ̀ bụkwa onye ga na-eguzogide mgbe a na-ahụ Ya anya? n’ihi na [onye ozi ọgbụgba ndụ ahụ] dị ka ọkụ onye nnụcha ihe na dị ka ncha nke ọsụ ákwà: Ọ ga-anọdụkwa ala dị ka onye nnụcha ọlaọcha nke na-eme ka ọ dị ọcha, Ọ ga-emekwa ka ụmụ Livaị dị ọcha, sichaakwa ha dị ka ọlaedo na ọlaọcha; ha ga na-eweta nso Jehova onyinye ịnata ihu ọma n’ezi omume.”
21 Ka Agha Ụwa Mbụ na-achọ ibi, ụfọdụ n’ime Ndị Mmụta Bible chere ule ọzọ nke okwukwe ihu—ma ha ga-anọgide ná nnọpụiche kpam kpam n’obubuagha ụwa. (Jọn 17:16; 18:36) Ụfọdụ anọpụghị iche. Ya mere na 1918, Jehova zigara “Onyeozi ọgbụgba ndụ ahụ,” bụ́ Kraịst Jisọs, ná ndokwa ụlọ nsọ ime mmụọ Ya ịsachasị ìgwè nta nke ndị na-efe Ya ofufe pụọ ná mmerụ nile nke ụwa. Ndị raara onwe ha nye n’igosipụta ezi okwukwe mụtara ihe site n’ahụmahụ ahụ wee gaa n’ihu, jiri ịnụ ọkụ n’obi nọgide na-eme nkwusa.
22. N’ihe banyere ule nke okwukwe, gịnị fọdụrụ a ka ga-atụle?
22 Ihe ndị anyị tụleworo abụghị nanị akụkọ nkịtị nke na-akpali mmasị. O metụtara kpọmkwem ọnọdụ ime mmụọ nke oge a nke ọgbakọ Jehova zuru ụwa ọnụ. Ma ka anyị tụlee n’isiokwu na-esonụ ụfọdụ n’ime ule okwukwe nke ndị Chineke na-eche ihu taa ma hụ otú anyị pụrụ isi merie ha n’ụzọ ga-aga nke ọma.
Ị̀ Na-echeta?
◻ N’ihi gịnị ka ndị Jehova kwesịrị iji tụọ anya na a ga-anwale okwukwe ha?
◻ Mgbalị ndị dị aṅaa iji gbasaa ozi Chineke ka a nọ na-eme tupu 1914?
◻ Gịnị bụ “Foto Ihe Nkiri,” gịnịkwa ka ọ rụpụtara?
◻ Olee otú ihe ndị mere na 1914-1918 si jee ozi ịnwale ndị ahụ e tere mmanụ?
[Foto dị na peeji nke 12]
Ná mmalite nke narị afọ a, ndị mmadụ n’ọtụtụ ala nọ na-amụ Bible site n’enyemaka nke usoro mbipụta “Millennial Dawn,” nke e mesịrị kpọọ “Studies in the Scriptures”
[Foto dị na peeji nke 13]
Akwụkwọ ozi sitere n’aka C. T. Russell nke nwere okwu mmalite nke a ga-agụbanye na tepụ nke ọ nọ na ya kwuo, sị: “Ọ bụ IBSA—International Bible Students Association na-egosi ‘Foto Ihe Nkiri nke Okike.’ Nzube ya bụ inye ọha na eze ntụziaka n’ihe banyere okpukpe na sayensị, nakwa iji kwadoo Bible”
[Foto dị na peeji nke 15]
Demetrius Papageorge mere njem na-egosi “Foto Ihe Nkiri nke Okike.” E mesịa, a tụrụ ya mkpọrọ n’ihi nnọpụiche ndị Kraịst ya