-
Jehova Ga-akwado GịỤlọ Nche—2015 | Disemba 15
-
-
13. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta tupu anyị atụọrọ ndị ọzọ aro gbasara ịgwọ ọrịa ma ọ bụkwanụ mee ihe a tụụrụ anyị n’aro?
13 Taa, e nweghị nwanna nwere ike ịrụ ọrụ ebube gwọọ ọrịa. Ma, ebe ọ bụ na ụmụnna anyị na-echere anyị echiche ọma, ụfọdụ nwere ike ịtụrụ anyị aro gbasara otú e si agwọ ọrịa, ọ bụrụgodị na anyị arịọghị ha. O doro anya na mmadụ nwere ike ịtụrụ anyị aro ga-abara anyị uru. Dị ka ihe atụ, Pọl gwara Timoti ka ọ na-aṅụ obere mmanya. Timoti na-arịakarị ọrịa afọ, ikekwe n’ihi na ọ na-aṅụ mmiri na-adịghị mma.a (Gụọ 1 Timoti 5:23.) Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya. Nwanna nwere ike ịna-agwa anyị mgbọrọgwụ na mkpá akwụkwọ anyị ga-eji agwọ ọrịa na-arịa anyị ma ọ bụkwanụ gwawa anyị ụdị nri anyị ga-eri na ndị anyị ga-ezere. O nwere ike ikwu na ọ bụ ihe nyeere onye ezinụlọ ha nwere ụdị nsogbu ahụ aka. Ma, ọ pụtaghị na ọ ga-enyere anyị aka. Anyị kwesịrị icheta na ọgwụ ụfọdụ nwere ike ịkpata nsogbu n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị na-aṅụ ya.—Gụọ Ilu 27:12.
-
-
Jehova Ga-akwado GịỤlọ Nche—2015 | Disemba 15
-
-
a Otu akwụkwọ nke kọrọ banyere otú e si malite ime mmanya n’oge ochie kwuru na ndị sayensị achọpụtala na nje ndị na-akpata ọrịa taịfọd nakwa nje ndị ọzọ na-anwụ ozugbo e tinyere ha n’ime mmanya.
-