‘Zere Ihe Ọmụma—Nke A Na-akpọ Otú Ahụ n’Ụzọ Ụgha’
RUO ókè ha aṅaa ka eziokwu dị gị mkpa? Ọ̀ na-enye gị nsogbu ịhụ na okwu ụgha agwagbuwo, ọbụna kpuchite eziokwu banyere Onye Okike nke eluigwe na ala? Nke a nyere Irenaeus nsogbu nke ukwuu, bụ́ onye kwuru na ya bụ onye Kraịst na narị afọ nke abụọ nke Oge Anyị. Ọ gbalịrị ikpughe ezighị ezi nile dị ize ndụ nke usoro ọkà ihe ọmụma bụ Gnosticism, bụ́ ụdị Iso Ụzọ Kraịst nke siri n’ezi ofufe dapụ. Tupu mgbe ahụ, Pọl dọrọ Timoti aka ná ntị ka ọ gbakụta ihe dị otú ahụ azụ, bụ́ “ihe ahụ a na-akpọ ihe ọmụma n’ụzọ ụgha.”—1 Timoti 6:20, 21.
Irenaeus ji obi ike kwuo okwu megide ozizi ụgha. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe o kwuru n’okwu mmeghe dị n’akwụkwọ ya ahụ e deziri nke ọma, nke isiokwu ya bụ “Nguzogide na Nkwatu nke Ihe ahụ A Kpọrọ Ihe Ọmụma n’Ụzọ Ụgha.” O dere, sị: “Ụfọdụ ndị, mgbe ha jụrụ eziokwu ahụ, na-ewebata n’etiti anyị akụkọ ụgha dị iche iche na ngụkọ usoro ọmụmụ ndị na-abaghị uru ọ bụla, ndị na-edujekarị n’esemokwu, dị ka onyeozi ahụ kwuru [1 Timoti 1:3, 4], kama ịkwado ọrụ Chineke nke iwuli mmadụ elu n’okwukwe. Site n’ọkà nkwuwa okwu ha, ha na-eduhie uche nke ndị na-enweghị ahụmahụ, na-ewebatakwa ha n’ịbụ ohu, na-emetọ ihe ọmụma nile nke Onyenwe anyị, na-abụkwa ndị na-akọwa ihe e kwuru nke ọma n’ụzọ mmebi iwu.”
Ndị Gnostic (Ọkà Ihe Ọmụma) ahụ (nke sitere n’okwu Grik bụ gnósis, nke pụtara “ihe ọmụma”) na-azọrọ na ha nwere ihe ọmụma ka elu site ná mkpughe ihe nzuzo, na-anyakwa isi na ha bụ “ndị na-agbazi ndị ozi.” Usoro ọ̀ka ihe ọmụma Gnosticism bụ ngwakọta nke ọkà amamihe ụwa, ọkà nchepụta echiche, ihe omimi nke ndị na-ekpere arụsị na Iso Ụzọ Kraịst nke si n’ezi ofufe dapụ. Irenaeus jụrụ ikere òkè na ha nile. Kama nke ahụ, ọ malitere atụmatụ nke ịlụso ozizi ụgha ọgụ ná ndụ ya nile. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ maara mkpa ọ dị iji ịdọ aka ná ntị nke Pọl onyeozi mee ihe, nke bụ: “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iwere ịhụ amamihe n’anya na aghụghọ efu nke ya bụrụ onye na-ezu unu n’obi, ịhụ amamihe n’anya nke dị ka ihe ozizi mmadụ nyere idebe, dị ka ozizi mbụ nke ụwa, ma ọ dịghị ka Kraịst si dị.”—Ndị Kọlọsi 2:8; 1 Timoti 4:7.
Mmalite Ndụ na Ije Ozi Ya
Ọ bụ nanị ihe dị nta ka a maara banyere mmalite ndụ na akụkọ ihe mere eme nke onwe onye banyere Irenaeus. Ọ bụ ihe a na-eche n’ebe nile na ọ bụ onye Asia Minor, onye a mụrụ n’agbata afọ 120 O.A. na 140 O.A. n’obodo Smụana ma ọ bụ n’ebe dị ya nso. Irenaeus kwuru n’onwe ya na mgbe ya bụ onye na-eto eto, na ya maara Polycarp, bụ́ onye nlekọta n’ọgbakọ ahụ dị na Smụana.
Mgbe ọ na-amụ ihe n’okpuru Polycarp, ihe àmà gosiri na Irenaeus meere Florinus enyi. Polycarp bụ onye ka dị ndụ nke maara ndị ozi ahụ. O nyere nkọwa hiri nne nke Akwụkwọ nsọ, gbasiekwa ume ike ka ndị mmadụ rapagidesie ike n’ozizi nile nke Jisọs Kraịst na nke ndị ozi Ya. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ezi ọzụzụ Akwụkwọ nsọ nke a, Florinus mesịrị daba n’ozizi nke Valentinus, bụ onyendú a kasị mara amara nke òtù ndị Gnostic ahụ!
Irenaeus chọrọ ka a kpọghachi onye ahụ bụbu enyi ya, bụ́ Florinus n’ezi ozizi nke Akwụkwọ nsọ, napụtakwa ya site n’iso ụzọ Valentinus. Ya mere, a kpaliri Irenaeus idegara Florinus akwụkwọ ozi, na-asị: “Florinus, ozizi ndị a . . . esiteghị n’ezi nghọta; ozizi ndị a ekwekọghị n’ihe chọọchị na-ezi, ha na-edubakwa ndị na-agbaso ha n’omume enweghị nsọpụrụ kasị ukwuu; . . . ndị okenye ahụ ndị dịrị ndụ tupu oge anyị, ndị maakwara ozizi ndị ozi ahụ nke ọma enyeghị gị ozizi ndị a.”
N’ịgbalị ichetara Florinus ezi ọzụzụ ọ natara n’okpuru Polycarp ahụ a ma ama, Irenaeus gara n’ihu ikwu, sị: “Ana m echeta ihe ndị mere n’oge ahụ . . . nke na enwere m ike ọbụna ikwu ebe Polycarp ahụ a gọziri agọzi na-anọdụkarị ma na-ekwu okwu . . . Otú ọ na-esikwa ekwu okwu banyere mmekọrita chiri anya ya na Jọn nwere, nakwa nke ya na ndị ọzọ ndị hụworo Onyenwe anyị; bụ́ ndị ọ na-echetakwa okwu ha.”
E chetaara Florinus na Polycarp kuziri ihe ọ nataworo “site n’aka ndị ji anya ha hụrụ Okwu nke ndụ ahụ, [ndị] kọwokwara ihe nile n’ụzọ kwekọrọ n’Akwụkwọ nsọ. Ihe ndị a, site n’ebere Chineke, ka e nyere m, m wee nụ, rịbakwa ha ama, ọ bụghị idetu ha n’akwụkwọ, kama n’ime obi m; sitekwa n’amara Chineke, anọgidere m na-echetaghachi ihe ndị a nile n’ụzọ ziri ezi n’uche m. [Banyere iso ụzọ Valentinus] enwekwara m ike ịgba àmà n’ihu Chineke na a sị na onye okenye ahụ a gọziri agọzi nke nọrọ n’oge ndị ozi [Polycarp] nụrụ ihe dị otú ahụ, ọ gaara etiworị mkpu wee kpuchie aka ná ntị ya . . . Ọ gaara eji ọsọ gbapụ n’ebe o guzo ọtọ ma ọ bụ ebe ọ nọdụ ala wee nụ okwu ndị dị otú ahụ.”
E nweghị ihe ndekọ ọ bụla gosiri na Florinus ṅara ntị n’akwụkwọ ozi nke a na-emetụ n’ahụ, nke sikwara ike nke Irenaeus dere. Ma okwu Irenaeus na-egosipụta ezi mmetụta o nwere maka ezi enyi ya nke hapụworo ụzọ eziokwu ahụ wee daba ná mwezụga n’ezi ofufe.— Tụlee 2 Ndị Tesalọnaịka 2:3, 7-12.
A maghị mgbe Irenaeus jere biri na Gaul (France). N’afọ 177 O.A., ọ na-eje ozi dị ka onye nlekọta n’ọgbakọ ahụ dị na Lyons. A kọrọ na ije ozi ya n’ebe ahụ mịpụtara mkpụrụ dị ukwuu. N’eziokwu, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ Gregory onye Tours kọrọ na n’oge na-adịghị anya, Irenaeus nwere ike ịtọghata ndị
Lyons nile bịa n’Iso Ụzọ Kraịst. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a bụ ikwu okwu karịa otú o mere n’ezie.
Megide Ozizi Ụgha
Ihe odide bụ isi nke Irenaeus dere, bụ́ “Nguzogide na Nkwatu nke Ihe ahụ A Kpọrọ Ihe Ọmụma n’Ụzọ Ụgha,” bụ nke a na-akpọkarị aha ahụ bụ “Megide Ozizi Ụgha.” E kewara ya gaa n’akwụkwọ ise dị iche iche. Abụọ ndị nke mbụ nwere nkọwa na-eme nkatọ nke nkwenkwe dị iche iche nke òtù ozizi ụgha dị iche iche, karịsịa ozizi ụgha nke ndị òtù Valentinus. N’akwụkwọ atọ ndị fọdụrụnụ, Irenaeus gbalịrị iwepụtasị “arụmụka ndị sitere n’Akwụkwọ nsọ.”
N’okwu mmeghe dị n’akwụkwọ ya nke atọ, bụ́ “Megide Ozizi Ụgha,” Irenaeus dere, sị: “Ya mere, buru n’uche ihe m kwuworo n’akwụkwọ abụọ ndị bu ụzọ; sitekwa n’ịtụkwasị nke a na ha, ị ga-enwe aziza zuru ezu site n’aka m inye ndị ozizi ụgha nile, ị ga-enwekwa ike iguzogide ha n’ikwesị ntụkwasị obi na n’anya ike iji kwadoo otu ezi okwukwe ahụ nke na-enye ndụ, bụ́ nke Chọọchị ahụ natara n’aka ndị ozi, nke ọ na-enyekwa ụmụ ya. N’ihi na Onyenwe ihe nile nyere ndị ozi ya ike nke oziọma ahụ, anyị esiwokwa n’aka ha mụta eziokwu ahụ, ya bụ, ozizi nke Ọkpara Chineke—dị ka Onyenwe anyị gwara ha, sị, ‘Onye na-anụ olu unu na-anụkwa olu m, onye na-ajụkwa unu na-ajụkwa m, na-ajụkwa onye ahụ nke zitere m.’”
Ọ bụ ezie na Irenaeus kwetara na ya abụghị onyeọkà n’ide ihe, o kpebisiri ike ikpughe akụkụ nile nke “ozizi ọjọọ” nke usoro ọkà ihe ọmụma Gnosticism. O hotara okwu sitere n’ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ nsọ, kọwaakwa ha, jirikwa nkà rụọ ụka megide “ndị ozizi ụgha” nke “ịrọ òtù dị iche iche nke ịla n’iyi.” (2 Pita 2:1-3) O yiri ka ò siiri Irenaeus ike ịchịkọta ihe odide ya bịa n’ụdị dị mma. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ chịkọtawo ihe odide dị nnọọ ukwuu.
E mesịrị wepụta oké mkpughe nke Irenaeus mgbe e nwesịrị oké ihe mgbu na ihe ọmụmụ dị ukwuu. Arụmụka ya ndị dị nnọọ ogologo na-enye ihe ọmụma dị ukwuu banyere mmalite na ọdịdị nke usoro ọkà ihe ọmụma Gnosticism. Ihe odide nke Irenaeus bụkwa ihe nlereanya bara oké uru banyere, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ụfọdụ n’echiche Akwụkwọ nsọ nke ndị sị na ha na-agbaso Okwu Chineke ka jigidere n’oge ọgwụgwụ nke narị afọ nke abụọ O.A.
Ọtụtụ ugbo, Irenaeus kwadoro nkwenye “n’otu Chineke, bụ́ Nna Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, onye mere eluigwe, na ala, na oké osimiri nile, na ihe nile dị n’ime ha, nakwa n’otu Kraịst Jisọs, bụ́ ọkpara Chineke, onye e mere ka ọ ghọọ anụ ahụ maka nzọpụta anyị.” Ndị Gnostic ekwenyeghị n’eziokwu ndị a!
N’ikwu okwu banyere ozizi Docetism nke ndị Gnostic (ozizi nke bụ na ọ dịghị mgbe Kraịst bịara n’ụdị mmadụ), Irenaeus dere, sị: “Kraịst aghaghị ịbụ mmadụ, dị ka anyị, ka o wee nwee ike ịgbapụta anyị site ná mmebi wee mee ka anyị zuo okè. Mmehie na ọnwụ sitekwara n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ya mere, ọ bụkwa nanị site n’aka otu mmadụ ka a ga-enwe ike ihichapụ ha n’ụzọ iwu kwadoro maka abamuru nke anyị; ọ bụ ezie na nke a agaghị abụ site n’aka onye ga-abụ onye nkịtị nke sitere n’usoro ọmụmụ Adam, wee si otú a bụrụkwa onye mgbapụta dị mkpa n’onwe ya, kama ọ ga-abụ Adam nke abụọ, onye a mụrụ n’ụzọ karịrị ike mmadụ, bụ́ nna ọhụrụ nke agbụrụ anyị.” (1 Ndị Kọrint 15:45) N’aka nke ọzọ, ndị Gnostic bụkwa ndị Dualist (Ndị Kwere n’Ọdịdị Abụọ nke Ihe), na-ekwere na ihe ime mmụọ dị mma, ma na ihe nile metụtara anụ ahụ dị njọ. N’ihi ya, ha ajụwo mmadụ ahụ bụ Jisọs Kraịst.
N’iche na ihe nile metụtara anụ ahụ bụ ihe ọjọọ, ndị Gnostic ahụ jụkwara alụmdi na nwunye na ịmụ ụmụ, na-ekwu na ihe ndị a sitere n’ebe Setan nọ. Ọbụna na ha kwuru na agwọ ahụ bịara n’Iden nwere amamihe nke Chineke! Echiche nke a rụpụtara ndụ imebiga ihe ókè, mmadụ ịnapụ onwe ya ihe ụtọ nile n’otu akụkụ ma ọ bụ ịchọbiga ihe ụtọ nke anụ ahụ ókè n’akụkụ nke ọzọ. N’ikwu na nzọpụta na-abịa nanị site n’usoro ọkà ihe ọmụma Gnosticism nke dị omimi, ma ọ bụ ihe ọmụma onwe onye, ha enyeghị ohere ọ bụla maka eziokwu nke Okwu Chineke.
N’ụzọ na-eyighị nke a, arụmụka nile nke Irenaeus gụnyere nkwere o kweere n’Ọchịchị Puku Afọ ahụ, gosipụtakwa nghọta ụfọdụ nke olileanya ndụ nke ga-adị n’udo n’ọdịnihu n’elu ala. Ọ gbalịrị ijikọta òtù ndị ahụ na-abawanye ụba n’oge ya site n’iji Okwu Chineke nke dị ike mee ihe. A na-echetakwa ya n’ebe nile maka ezi iche echiche ya, nghọta doro anya ọ na-enwe, na ezi mkpebi ndị ọ na-eme.
Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị na-ekwu na Irenaeus (onye nwụrụ n’ihe dị ka afọ 200 O.A.) mere ihe iji kwalite ezi ozizi nke okwukwe ndị na-eso ụzọ Kraịst, a ghaghị icheta na oge ya bụ oge mgbanwe na nke ndapụ n’ezi ofufe ahụ e buru n’amụma. Mgbe ụfọdụ, arụmụka ya anaghị apụtacha ìhè, ọbụna na-emegiderịta onwe ha. Otú o sina dị, anyị na-agụ ya n’ihe dị oké ọnụ ahịa, bụ́ ịgba àmà nke mmadụ ndị ji anya ike kwuwaa okwu iji kwadoo Okwu Chineke e dere site n’ike mmụọ ya kama ịkwado omenala dị iche iche nke mmadụ.