Ihe Mgbapụta n’Ọnọdụ Ọtụtụ Mmadụ
NA MARCH 31, 1970, e jidere otu ụgbọ elu jet n’ebe dị nso Ugwu Fuji na Japan. Mmadụ itoolu so n’òtù ahụ a maara dị ka Japanese Red Army Faction kpọọrọ 120 ndị njem na ndị ọrụ ụgbọ elu ahụ dị ka ndị e ji eji, kwuokwa na ha chọrọ ka e bulaa ha n’udo ruo North Korea.
Mgbe ụgbọ elu ahụ fedara na Seoul, Republic of Korea, onye Japan na-esote minista okwu ime njem dị n’aka bụ́ Shinjiro Yamamura wepụtara onwe ya itinye ndụ ya n’ihe ize ndụ n’ihi ndị ahụ e ji eji. N’ikweta na ha ga-anakwere ya dị ka onye ha ga-eji nweta nchebe nke ha, ndị njide ahụ tọhapụrụ ndị nile e ji eji e wezụga ndị ọrụ ụgbọ elu ahụ. Mgbe ahụ ha fegara na Pyongyang, bụ́ ebe ha chịliiri ndị isi ọchịchị North Korea aka. Maazi Yamamura na onye na-anya ụgbọ elu ahụ mesịrị laghachi na Japan n’emerụghị ahụ.
N’ọnọdụ nke a, otu onye jere ozi dị ka ihe mgbapụta maka ndụ nke ihe karịrị 120 ndị e ji eji. Nke a pụrụ inyere anyị aka ịhụ ụzọ otu onye pụrụ isi nye ndụ ya dị ka ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ. Ma iji ghọta ozizi Bible nke ihe mgbapụta, anyị aghaghị inyocha isiokwu nke a nke ọma karị.
Na nke mbụ, ọ dị mkpa anyị ịchọpụta otú mmehie si malite. “Mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere,” ka Bible kọwara. (Ndị Rom 5:12) Olee otú nke ahụ si mee? Mmadụ ahụ e hotara n’ebe ahụ bụ Adam, bụ́ mmadụ mbụ e kere eke. Ị pụrụ ịgụ ihe ndekọ akụkọ mere eme nke okike ya na ihe dugara ya n’inwe ntụpọ site n’ụkpụrụ Chineke. E depụtara nke a n’isi atọ ndị mbụ nke akwụkwọ Bible bụ Jenesis.
Ihe ndekọ ahụ na-ekpughe na e nwere onye nkwali a na-adịghị ahụ anya mgbe Adam mere mmehie na mbụ. Iji mezuo ọchịchọ ya inweta ike, onye nkwali ahụ mere atụmatụ ịchị Adam na ụmụ ọ bụla ọ pụrụ inwe. Onye nkwali ahụ bụ Setan bụ́ Ekwensu. A na-akpọkwa ya “agwọ ochie ahụ” n’ihi na o ji agwọ mee ihe n’iduba Adam gaa ná mmehie. (Mkpughe 12:9) Ọ bụ ezie na Onye Okike ahụ hụrụ ihe a kpọrọ mmadụ n’anya gwara Adam ka ọ sọpụrụ ikike O nwere ikpebi ezi ihe na ihe ọjọọ, agwọ ahụ rafuru nwunye Adam, bụ́ Iv, inupụrụ Chineke isi. Mgbe ahụ ọ kpaliri di ya inupụ isi. Site n’ime nke ahụ, Adam kwupụtara na ya nweere onwe ya n’ebe Chineke nọ, kpachara anya ghọọ onye na-eme mmehie, ọ bụkwa nanị ụdị ndụ dị otú ahụ ka ọ pụrụ ibufere ụmụ ya.
Anyị ka na-ata ahụhụ ihe si na nke ahụ pụta. N’ụzọ dị aṅaa? Ee, Onye Okike ahụ enyewo iwu n’ụzọ ziri ezi na ọ bụrụ na Adam na Iv ahọrọ ịma ụma nupụ isi, ihe ga-esi na ya pụta bụ ọnwụ. Ya mere, site n’ime mmehie, Adam renyere ihe nile a kpọrọ mmadụ n’ime ịbụ ohu nke mmehie na ọnwụ.—Jenesis 2:17; 3:1-7.
Olee ụzọ a pụrụ isi gbapụta agbụrụ mmadụ site n’ọnọdụ mmehie ahụ? Jisọs Kraịst bịara n’elu ala ‘inye ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ,’ nke a meghekwara ụzọ ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ.—Matiu 20:28.
Ikpuchi na Ịtọhapụ
Bible gosiri na usoro nke ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ metụtara nzọụkwụ abụọ: (1) ịzụtaghachi na (2) ịtọhapụ. Banyere okwu Grik bụ́ (lyʹtron) a sụgharịrị “ihe mgbapụta,” onye ọkà mmụta Bible bụ́ Albert Barnes dere, sị: “Okwu ahụ bụ́ ihe mgbapụta pụtara n’ụzọ nkịtị ụgwọ a kwụrụ maka mgbapụta nke ndị e ji eji. N’agha, mgbe ndị iro dọkpụụrụ ndị mkpọrọ laa, a na-akpọ ego a naara maka ntọhapụ ha ihe mgbapụta; ya bụ, ọ bụ ụzọ e si eme ka ha nwere onwe ha. Ya mere a na-akpọ ihe ọ bụla tọhapụrụ onye ọ bụla site n’ọnọdụ ntaramahụhụ, ma ọ bụ nhụjuanya, ma ọ bụ mmehie, ihe mgbapụta.”
Ee, a pụrụ ịkpọ “ihe ọ bụla tọhapụrụ onye ọ bụla” lyʹtron. Ya mere okwu Grik nke a na-emesi omume ma ọ bụ usoro nke ntọhapụ ike.a
Pọl onyeozi ji okwu yiri ya bụ́ an·tiʹly·tron mee ihe imesi abamuru nke ụgwọ a kwụrụ dị ka ihe mgbapụta ike. Na 1 Timoti 2:6 (NW), o dere na “[Jisọs] nyere onwe ya” dị ka “ihe mgbapụta ruru eru n’ihi mmadụ nile.” N’ikwu okwu banyere nke a, akwụkwọ nke Parkhurst bụ́ Greek and English Lexicon to the New Testament kwuru, sị: “Ọ na-egosipụta n’ụzọ ziri ezi ụgwọ e ji gbapụta ndị e ji eji site n’aka ndị iro; ụdị mgbanwerịta dị otú ahụ nke a nọ na ya gbapụta ndụ mmadụ site ná ndụ onye ọzọ.” Ihe a na-emesi ike n’ebe a bụ ọdịdị nke iru eru ma ọ bụ ịdị irè nke ụgwọ mgbapụta ahụ a kwụrụ ná mmezu nke ihe a kpere n’ikpe. Olee ụzọ a pụrụ isi were àjà mgbapụta Jisọs dị ka “ihe mgbapụta ruru eru”?
Ihe Mgbapụta Ruru Eru
Adam renyere ihe nile a kpọrọ mmadụ, tinyere anyị onwe anyị, n’ime mmehie na ọnwụ. Ụgwọ ọ kwụrụ bụ ndụ ya zuru okè, ya na ohere nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Iji kpuchie nke a, a ghaghị ịkwụghachi ndụ mmadụ ọzọ zuru okè—ihe mgbapụta ruru eru. Otú ọ dị, ọ dịghị onye nke ndị na-ezughị okè mụrụ nwere ike iweta ndụ mmadụ zuru okè nke a chọrọ. (Job 14:4; Abụ Ọma 51:5) Otú ọ dị, n’amamihe ya, Chineke meghere ụzọ mgbapụ site n’ihe isi ike ndị a. O bufere ndụ zuru okè nke Ọkpara ọ mụrụ nanị ya site n’eluigwe gaa n’akpa nwa nke nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, na-eme ka a mụọ ya dị ka nwoke zuru okè. (Luk 1:30-38; Jọn 3:16-18) Ozizi nke a nke ọmụmụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke mụrụ Jisọs abụghị akụkọ e chepụtara echepụta iji bulie onye malitere okpukpe elu. Kama nke ahụ, ọ na-akọwa nzọụkwụ ezi uche dị na ya ná mwepụta nke Chineke wepụtara ihe mgbapụta.
Iji wee mezuo mgbapụta ahụ, Jisọs aghaghị inwe ihe ndekọ dị ọcha n’oge nile ọ nọ n’elu ala. Nke a ka o mere. Mgbe ahụ ọ nwụrụ ọnwụ ọchụchụ àjà. N’ụzọ dị otú ahụ, Jisọs ji ndụ mmadụ ya zuru okè kwụọ ụgwọ dị ka ihe mgbapụta ịnapụta ihe a kpọrọ mmadụ. (1 Pita 1:19) Ya mere anyị pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi na “otu onye nwụrụ n’ọnọdụ mmadụ nile.” (2 Ndị Kọrint 5:14) Ee, “dị ka ọnwụ dịịrị mmadụ nile n’ime Adam, ọ bụkwa otú a ka a ga-eme ka mmadụ nile dị ndụ n’ime Kraịst ahụ.”—1 Ndị Kọrint 15:22.
Otu Onye n’Ọnọdụ Ọtụtụ Mmadụ
N’okwu banyere ụgbọ elu ahụ e jidere ejide nke e hotara na mbụ, ndị ahụ e ji eji enweghị ụzọ ọ bụla isi tọhapụ onwe ha, ọbụna ma à sị na ha bara ọgaranya. Enyemaka si ebe ọzọ dị mkpa, onye ahụ nke na-eje ozi dị ka ihe mgbanwerịta aghaghị inwezu ihe ụfọdụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ụzọ sara mbara n’ihe banyere ihe mgbapụta dị mkpa iji gbapụta ihe a kpọrọ mmadụ. Otu onye ọbụ abụ dere, sị: “Ndị . . . na-anyakwa isi n’ịba ụba nke ọgaranya ha bụ, ọ dịghị onye ọ bụla ga-agbapụta nwanne ya ma ọlị, ọ gaghị enye Chineke ihe mgbapụta ya: (n’ihi na mgbapụta mkpụrụ obi ha dị oké ọnụ ahịa, ọ ga-ahakwa ya aka ruo mgbe ebighị ebi:).” (Abụ Ọma 49:6-8) N’ezie, enyemaka si ebe ọzọ dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa. Ndụ nke otu onye ga-ezu iji gbapụta ihe nile a kpọrọ mmadụ ma ọ bụrụhaala na o nwezuru ihe ndị a chọrọ iji mezuo ikpe ziri ezi nke Chineke. Jisọs Kraịst abụwo nanị mmadụ zuru okè nke nwere iru eru ndị ahụ.
Jehova Chineke emewo ka e nwee ihe a ga-eji gbapụta ihe a kpọrọ mmadụ site n’ịkwụ ụgwọ ihe mgbapụta site n’aka Jisọs Kraịst. Ma Chineke emewo karị nke ahụ. Ọ mawo Setan bụ́ Ekwensu ikpe ọnwụ, bụ́ onye ahụ nke dubara ihe a kpọrọ mmadụ ná mmehie. (Mkpughe 12:7-9) N’oge na-adịghị anya Jehova ga-atụ onye ahụ ikpe mara mkpọrọ, n’ikpeazụ ọ ga-emezukwa ihe e kpere n’ikpe site ‘n’ịtụba ya n’ime ọdọ ọkụ na brimstone,’ nke bụ ihe atụ nke mbibi ebighị ebi. (Mkpughe 20:1-3, 7-10, 14) Site n’iwepụ ajọ mmụọ nke a e kere eke na site n’iji ihe mgbapụta ahụ mee ihe, ihe a kpọrọ mmadụ ga-enweta mgbapụta ọ bụghị nanị pụọ ná njide nke mmehie na ọnwụ kamakwa pụọ ná mmetụta nke Setan. N’ịbụ ndị si otú a nwere onwe ha na site n’iji uru nke àjà mgbapụta Kraịst mee ihe n’ụzọ zuru ezu, ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga-eru n’izu okè nke mmadụ.
Ndokwa Ihe Mgbapụta na Gị
Mgbe ha mụtara banyere àjà mgbapụta nke Jisọs Kraịst, ọtụtụ ndị nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa enwewo ekele miri emi banyere ihe Chineke mewooro ha. Kazuo nọ dị ka ihe atụ. Ọ na-ebi ndụ nke ikuru ihe e ji agbaze ágbá na ịbụ onye nke ahụ na-egbu egbu. Mgbe ọ na-anya ụgbọ ala n’okpuru ike ya, ọ kpọkasịrị ụgbọ ala ya ọtụtụ mgbe. Ndị enyi ya atọ gburu onwe ha mgbe ha bibisịworo ahụ ike ha. Kazuo gbalịkwara igbu onwe ya. E mesịa, ọ malitere ịmụ Bible. N’ịbụ onye eziokwu ọ mụtara kpaliri, o kpebiri imezi ndụ ya. Ọ gbalịrị ịkwụsị àgwà ya nke iji ihe e ji agbaze ágbá na-emetọ ahụ ya, ma e nwere ọtụtụ ndaghachi. Ọ nọ n’etiti ihe isi ike nke imezu ọchịchọ anụ ahụ ya na ọchịchọ nke ime ihe ziri ezi. Lee obi ụtọ o nwere inwe ike ikpegara Chineke ekpere maka mgbaghara site n’uru nke àjà mgbapụta Jisọs Kraịst! Site n’ekpere na site n’enyemaka nke ndị enyi ya bụ́ ndị Kraịst, Kazuo kwụsịrị ajọ omume ya, ọ na-ejekwara Jehova ozi ugbu a dị ka onye ozi na-enwe obi ụtọ site n’akọ na uche dị ọcha.
Ì chetara Chisako, onye e hotara ná mmalite nke isiokwu bu ụzọ? Site n’ọmụmụ nke Bible, ya onwe ya mesịkwara ghọta ndokwa ịhụnanya nke ihe mgbapụta ahụ. A kpaliri ya n’ụzọ miri emi mgbe ọ mụtara na Chineke nyere Ọkpara ya ịtọhapụ ihe a kpọrọ mmadụ site ná mmehie. Chisako raara ndụ ya nye Jehova. Ọbụna ugbu a, n’afọ ndụ nke 77, ọ na-etinye ihe dị ka 90 hour kwa ọnwa n’ịgwa ndị ọzọ banyere ịhụnanya dị ukwuu nke Jehova na obi ebere na-erughịrị mmadụ nke ọ na-egosi.
Ihe mgbapụta ahụ kwesịkwara ịbụ ihe dị mkpa nye gị onwe gị. Site na ya, Chineke ga-emeghepụrụ ihe a kpọrọ mmadụ ụzọ inweta ezi nnwere onwe—nnwere onwe pụọ ná mmehie na ọnwụ. Ọdịnihu dị mma nke ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala bụ́ paradaịs na-echere ndị ahụ na-anakwere àjà mgbapụta nke Jisọs Kraịst. Biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova, jirikwa aka gị nyochaa ụzọ ị pụrụ isi nweta nnwere onwe pụọ ná mmehie na ọnwụ site na ndokwa ịhụnanya nke ihe mgbapụta.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, a na-asụgharị pa·dhahʹ na okwu ndị yiri ya dị ka “mgbapụta” ma ọ bụ “ụgwọ mgbapụta,” na-emesi ntọhapụ nke e nwetara ike.—Deuterọnọmi 9:26.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 5]
Site n’ikike nke Mainichi Shimbun