Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 9/8 p. 24-25
  • Ànyị Kwesịrị Ịta Setan Ụta Maka Mmehie Anyị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ànyị Kwesịrị Ịta Setan Ụta Maka Mmehie Anyị?
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Guzogide Ekwensu
  • Ụzọ Isi ‘Guzogide Ekwensu’
  • Ọgụ Anyị Na-alụ n’Ime
  • Nakwere Ụta
  • “Na-eguzogidenụ Ekwensu” Dị Ka Jizọs Mere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Guzogide Setan, Ọ Ga-agbapụkwa!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ì Kweere n’Ezie na Ekwensu Dị Adị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ekwensu—Ọ Bụghị Nkwenkwe Ụgha Nkịtị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 9/8 p. 24-25

Echiche Nke Bible

Ànyị Kwesịrị Ịta Setan Ụta Maka Mmehie Anyị?

A TARA Setan ụta maka mmehie mbụ nke mmadụ. “Agwọ ahụ rafuru m, m wee rie,” ka Iv kwuru. (Jenesis 3:13) Kemgbe ahụ, “agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan” anọgidewo na-akpa ike megide ihe a kpọrọ mmadụ, ‘na-eme ka anya nke uche ndị mmadụ kpuo ìsì,’ ma “na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9; 2 Ndị Kọrint 4:4) Ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ịgbanahụ nrụgide ya, ma nke a ọ̀ pụtara na anyị apụghị iguzogide mmetụta ya? Mgbe anyị mehiekwara, ọ̀ bụ ya na-akpata ya mgbe nile?

Bible na-akọwa na Setan duhiere Iv n’ezie. (1 Timoti 2:14) E duhiere ya iche na site n’imebi iwu Chineke na ọ pụrụ inweta nghọta na nnwere onwe yiri nke Chineke. (Jenesis 3:4, 5) N’inwe echiche ahụ, o mehiere. Otú ọ dị, Chineke tara ya ụta ma maa ya ikpe ọnwụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ ezie na Setan ghara ụgha, Iv maara nke ọma ihe iwu Chineke bụ. Ọ dịghị mgbe a manyere ya inupụ isi; kama nke ahụ, ọ ka pụrụ ikpebi ihe ọ ga-eme, o nwere ikike zuru ezu iguzogide mmetụta Setan.

Guzogide Ekwensu

Anyị bụ́ mmadụ pụrụ iguzogide Ekwensu. Ná Ndị Efesọs 6:12, a gwara anyị na “ịgba mgba anyị” bụ megide “ndị agha mmụọ nke ajọ ihe n’ebe dị n’eluigwe.” Ya mere, o doro anya na Chineke na-atụ anyị anya n’aka ịlụso mmetụta Setan ọgụ. Ma olee otú mmadụ pụrụ isi lụọ ọgụ megide ike Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya bụ́ nke karịrị ike mmadụ? À na-agwa anyị ka anyị lụọ ọgụ nke ike otu onye ka ibe ya, bụ́ nke anyị ji n’aka na a ga-emeri anyi? Ee e, n’ihi na Chineke adịghị agwa anyị ka anyị lụsoo Ekwensu ọgụ n’ike nke onwe anyị. Jehova na-enye anyị ụzọ dị iche iche anyị pụrụ isi guzogide ihe nrata dị iche iche nke Ekwensu ma nwee mmeri. Bible na-agwa anyị onye Ekwensu bụ, otú o si arụ ọrụ, na otú anyị pụrụ isi chebe onwe anyị.—Jọn 8:44; 2 Ndị Kọrint 2:11; 11:14.

Ụzọ Isi ‘Guzogide Ekwensu’

Akwụkwọ Nsọ na-atụ aro nzọụkwụ abụọ maka iguzogide Ekwensu. A dụrụ anyị ọdụ, sị: “Ya mere doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma guzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.” (Jemes 4:7) Nzọụkwụ mbụ n’ido onwe anyị n’okpuru Chineke na-agụnye nrubeisi nye iwu ya nile. Anyị ịmara mgbe nile ịdị adị nke Chineke, ịdị mma ya, ike na ịbụisi ya dị ebube, na ụkpụrụ ya ndị dị elu ga-enye anyị ume iguzogide Setan. Ịnọgide na-ekpegara Chineke ekpere dịkwa mkpa.—Ndị Efesọs 6:18.

Tụlee oge Ekwensu nwara Jisọs. Ichetaghachi na ihota iwu dị iche iche sitere n’aka Chineke nyeere Jisọs aka n’ezie iguzogide. N’ịbụ onye dara n’ịrabanye Jisọs ná mmehie, Setan hapụrụ ya. Mgbe ahụmahụ ọjọọ ahụ gasịrị, Jehova, site n’aka ndị mmụọ ozi ya, wusikwuru Jisọs ike. (Matiu 4:1-11) N’ihi ya, Jisọs pụrụ iji obi ike gbaa ndị na-eso ụzọ ya ume ịrịọ Chineke ka ọ ‘dọpụta ha n’aka ajọ onye ahụ.’—Matiu 6:13.

Chineke ịgbapụta anyị apụtaghị na ọ na-etinye ọta nchebe gburugburu anyị. Kama nke ahụ, ọ na-agwa anyị ka anyị chụsoo àgwà Chineke, dị ka eziokwu, ezi omume, udo, na okwukwe. Àgwà ndị a na-arụ ọrụ dị ka “ihe agha,” na-enyere anyị aka “iguzogide ihe nile ekwensu na-ezupụta.” (Ndị Efesọs 6:11, 13-18) Ya mere site n’enyemaka Chineke, ọ ga-ekwe omume ịgabiga ọnwụnwa Ekwensu.

Nzọụkwụ nke abụọ a tụrụ aro ya na Jemes 4:7 bụ ‘iguzogide Ekwensu.’ Nke a na-agụnye ọrụ dị ike, isi ná mmetụta ya na-emerụ ahụ gbapụ. Mmadụ aghaghị izere ikpughe onwe ya nye ike aghụghọ ya ma jụ nkà ihe ọmụma nke ịhụ ihe onwunwe n’anya na nke rụrụ arụ bụ́ ndị jupụtara n’ụwa taa. Nguzogide dị otú ahụ megide Ekwensu tinyere ndụ a raara nye ime ihe na-atọ Chineke ụtọ bara uru nke ukwuu n’ọgụ anyị megide Setan. Ma mmehie nile ọ̀ bụ kpọmkwem ihe mmetụta Ekwensu na-akpata?

Ọgụ Anyị Na-alụ n’Ime

Onye so dee Bible bụ́ Jemes na-akọwa, sị: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe agụụ ihe ọjọọ nke aka ya na-adọkpụfu ya, e wee rafuo ya. Mgbe ahụ agụụ ihe ọjọọ ahụ, mgbe ọ tụwooro ime, o wee mụpụta mmehie.” (Jemes 1:14, 15) N’ụzọ dị mwute, anyị apụghị imeri adịghị ike na ezughị okè e ketara eketa kpam kpam. (Ndị Rom 5:12) “Ọ dịghị onye ezi omume n’ụwa, nke na-eme ezi ihe, na-adịghị emehiekwa,” ka Bible na-ekwu.—Eklisiastis 7:20.

Nke a apụtaghị na mmehie nile karịrị ikike anyị kpam kpam. N’ọnọdụ ụfọdụ, anyị na-ewetara onwe anyị ọnwụnwa site ná nhọrọ anyị ndị na-ezighị ezi. Ya mere, ọ bụ ezie na ọchịchọ na-ezighị ezi nwere ike ịbụ n’ihi ezughị okè nke anyị ma ọ bụ mmetụta Setan, ma ànyị na-azụ ya ma ọ bụ na-ajụ ya bụ kpam kpam ihe dịịrị anyị. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Pọl onyeozi dere, sị: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi.”—Ndị Galetia 6:7.

Nakwere Ụta

Ọtụtụ mgbe ọ na-esiri ụmụ mmadụ ike ikweta adịghị ike, ọdịda, amaghị eme nke ha—ee, mmehie ha. (Abụ Ọma 36:2) Otu ihe nke pụrụ inyere anyị aka ịnakwere ụta maka mmehie anyị bụ ihe ọmụma nke bụ́ na Chineke adịghị achọ ka anyị zuo okè ugbu a. “Ọ bụghị dị ka mmehie nile anyị si dị ka O meworo anyị, ọ bụghịkwa dị ka ajọ omume nile anyị si dị ka O mesoworo anyị,” ka onye ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid kwupụtara. (Abụ Ọma 103:10) Ọ bụ ezie na Chineke na-agbaghara mmehie, ọ na-atụkwa anya n’aka anyị ịlụsi ọgụ ike, inye onwe anyị ọzụzụ, megide ihe nrata nile nke Ekwensu na ọchịchọ anyị ime mmehie.—1 Ndị Kọrint 9:27.

Anyị aghaghị ịghọta na ọ bụ ezie na Chineke matara na Ekwensu pụrụ inwe mmetụta n’ebe omume anyị dị ma na-eburu ụta ka ukwuu maka ọnọdụ mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ, nke a emeghị ka anyị bụrụ ndị na-agaghị aza ajụjụ n’onwe anyị. N’ihi ya, Ndị Rom 14:12 na-asị: “Onye ọ bụla n’etiti anyị ga-aza ajụjụ banyere onwe ya nye Chineke.”

Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị ‘na-akpọ ajọ ihe asị’ ma “na-arapara ezi ihe n’ahụ,” anyị pụrụ imeri ihe ọjọọ. (Ndị Rom 12:9, 21) Nwanyị mbụ ahụ, bụ́ Iv, emeghị nke ahụ, a takwara ya ahụhụ maka nnupụisi ya; ọ pụrụ iguzogideworịị ma rubere Chineke isi. (Jenesis 3:16) Otú ọ dị, Chineke elegharaghị òkè Ekwensu keere n’iduhie ya anya. A bụrụ Ekwensu ọnụ, maakwa ya ikpe mbibi nke ga-emesị were ọnọdụ. (Jenesis 3:14, 15; Ndị Rom 16:20; Ndị Hibru 2:14) N’isi nso, anyị agaghịkwa na-agbaso mmetụta ọjọọ ya mgba.—Mkpughe 20:1-3, 10.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]

Erich Lessing/Art Resource, NY

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya