Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Baịbụl Ọ̀ Bụ Okwu Chineke?
    Ụlọ Nche—2010 | Mach 1
    • “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie, na iji ya nye ọzụzụ n’ezi omume, ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.”—2 TIMOTI 3:16, 17.

      IHE A Pọl onyeozi kwuru gosiri nnọọ na Baịbụl bara ezigbo uru! N’ezie, ọ na-ekwu kpọmkwem banyere akwụkwọ Baịbụl ndị e nwere n’oge ya, bụ́ ihe odide ndị mmadụ na-akpọ Agba Ochie mgbe ụfọdụ. Ma, ihe o kwuru metụtakwara nnọọ akwụkwọ iri isii na isii niile dị na Baịbụl, tinyere ndị nke ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ntụkwasị obi dere na narị afọ mbụ Oge Anyị.

      Ì ji Baịbụl kpọrọ ihe otú ahụ Pọl ji ya kpọrọ? Ì chere na ndị dere Baịbụl si n’ike mmụọ nsọ Chineke dee ya n’ezie? Ndị Kraịst narị afọ mbụ kweere otú ahụ. Ha akwụsịghị ikwere ya n’ọtụtụ narị afọ sochirinụ. Dị ka ihe atụ, ụkọchukwu bụ́ onye Ịngland nke dịrị ndụ na narị afọ nke iri na anọ, bụ́ Jọn Wiklif, weere Baịbụl dị ka “ụkpụrụ eziokwu nke e kwesịrị ịtụkwasị obi.” Mgbe akwụkwọ bụ́ The New Bible Dictionary na-ekwu banyere okwu Pọl e dere n’elu, o kwuru na “ebe ọ bụ na Baịbụl si n’ike mmụọ nsọ [Chineke], ihe niile o kwuru bụ eziokwu.”

  • Baịbụl Bụ n’Ezie Okwu Chineke E Si n’Ike Mmụọ Nsọ Dee
    Ụlọ Nche—2010 | Mach 1
    • OLEE kpọmkwem ihe Pọl onyeozi bu n’uche mgbe o kwuru na Baịbụl si “n’ike mmụọ nsọ Chineke”? (2 Timoti 3:16) Ebe ọ bụ na Pọl dere akwụkwọ ahụ n’asụsụ Grik, otú o si dee okwu ahụ bụ “Chineke kunyere ume.” N’ihi ya, ihe okwu Pọl pụtara bụ na Chineke ji mmụọ nsọ ya duzie ndị dere Baịbụl ka ha dee naanị ihe Ọ chọrọ ka ha dee.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya