IHE ỌMỤMỤ NKE 52
Ndụmọdụ Dị Irè
NDỊ Kraịst bụ́ ndị okenye aghaghị inwe ike “ịdụsi ọdụ ike site n’ozizi na-enye ezi ndụ.” (Taị. 1:9) Mgbe ụfọdụ, a ghaghị ime nke a n’ọnọdụ ndị siri nnọọ ike. Ọ dị mkpa inye ndụmọdụ kwekọrọ ná nduzi Akwụkwọ Nsọ. N’ihi ya, ndị okenye aghaghị ịṅa ntị na ndụmọdụ bụ́: “Nọgide na-etinyesi mgbalị ike . . . n’inye ndụmọdụ.” (1 Tim. 4:13) Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị okenye ma ọ bụ ndị na-achọ iru eru maka ihe ùgwù a ka a na-agwa okwu kpọmkwem n’ebe a, e nwere mgbe ndị mụrụ ụmụ na-aghaghị ịdụ ụmụ ha ọdụ ma ọ bụ mgbe ọ ga-adị mkpa ka ndị na-eduzi ọmụmụ Bible dụọ ndị ha na-amụrụ Bible ọdụ. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ụkpụrụ nduzi ndị yiri ndị a ga-adị irè.
Ọnọdụ Ndị Na-eme Ka Ọ Dị Mkpa. Iji kpebie mgbe ndụmọdụ dị mkpa, inyocha ọnọdụ ndị e dekọrọ na Bible bụ́ ebe ndị e nyere ndụmọdụ na ha na-enye aka. Pita onyeozi dụrụ ndị okenye ọdụ ka ha tinye uche n’ọrụ ha nke ịbụ ndị na-azụ ìgwè atụrụ Chineke. (1 Pita 5:1, 2) Pọl dụrụ Taịtọs ọdụ ka o nye ụmụ okorobịa ndụmọdụ ka ha ‘nwee uche zuru okè.’ (Taị. 2:6) Pọl gbara Ndị Kraịst ibe ya ume ka ha “na-ekwu otu ihe” ma zere ndị na-achọ iweta nkewa n’etiti ụmụnna. (1 Kọr. 1:10; Rom 16:17; Fil. 4:2) Ọ bụ ezie na Pọl jara ndị nọ n’ọgbakọ Tesalonaịka mma maka ihe ọma ha na-eme, ọ dụrụ ha ọdụ ka ha na-etinye ntụziaka ha natara n’ọrụ ọbụna karị. (1 Tesa. 4:1, 10) Pita rịọrọ Ndị Kraịst ibe ya ka ha “nọgide na-esepụ aka n’ọchịchọ anụ ahụ́.” (1 Pita 2:11) Jud dụrụ ụmụnna ya ọdụ “ịlụsi ọgụ ike maka okwukwe ahụ” n’ihi mmetụta nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke bụ́ ndị na-etinye aka n’omume rụrụ arụ. (Jud 3, 4) A gbara Ndị Kraịst ume n’ozuzu ha ka ha na-adụrịta ibe ha ọdụ ka onye ọ bụla ghara ịbụ onye aghụghọ nke mmehie mere ka obi ya kpọọ nkụ. (Hib. 3:13) Pita gbara ndị Juu bụ́ ndị na-etinyebeghị okwukwe na Kraịst ume, sị: “Bụrụnụ ndị a ga-azọpụta n’ọgbọ a gbagọrọ agbagọ.”—Ọrụ 2:40.
Àgwà dịgasị aṅaa ka a chọrọ iji na-adụsi ọdụ ike n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ? Olee otú onye na-adụ ọdụ pụrụ isi mee ka ndụmọdụ ya bụrụ nke a ga-eme ihe banyere ya ozugbo ma n’abụghị onye aka ike ma ọ bụ onye obi ọjọọ?
“N’ịdabere n’Ịhụnanya.” Ọ bụrụ na anyị ‘adabereghị n’ịhụnanya’ nye ndụmọdụ anyị, ọ pụrụ iyi nke gafere ókè. (Faị. 9) N’eziokwu, mgbe a chọrọ ka e mee ihe ozugbo, otú ọkà okwu si ekwu okwu kwesịrị igosi otú ọnọdụ ahụ si chọọ ime ihe ngwa ngwa. Ikwu okwu n’ụzọ dị nwayọọ pụrụ iyi ịrịọ arịrịọ. N’otu mgbe ahụ, e kwesịrị iji mmetụta ọmịiko nye agbamume ahụ n’ụzọ iji ihe kpọrọ ihe. Agbamume e ji ịhụnanya nye yikarịrị ka ọ ga-akpali ndị na-ege gị ntị. Mgbe ọ na-ekwu ọnụ ya nakwa nke ndị ibe ya, Pọl gwara ndị Tesalonaịka, sị: “Unu maara nke ọma otú anyị, dị ka nna si eme ụmụ ya, si nọgide na-adụsi onye ọ bụla n’ime unu ọdụ ike.” (1 Tesa. 2:11) Ndị Kraịst ahụ bụ́ ndị nlekọta jiri ịhụnanya gbaa ụmụnna ahụ ume. Ka ihe ị na-ekwu bụrụ n’ihi ezi nchegbu i nwere maka ndị na-ege gị ntị.
Dị akọ. Emela ihe ga-eme ka ndị ị na-agbalị ịkpali ime ihe ghara inwekwa mmasị n’ihe ị na-ekwu. N’otu oge ahụ, ahapụla ịgwa ndị na-ege gị ntị “nzube nile nke Chineke.” (Ọrụ 20:27) Ndị nwere obi ekele agaghị ewe iwe ma ọ bụ kwụsị ịhụ gị n’anya n’ihi na i ji obiọma gbaa ha ume ime ihe ziri ezi.—Ọma 141:5.
Ọtụtụ mgbe, ọ na-aba uru ibu ụzọ nye ịja mma a kapịrị ọnụ, nke sitere n’obi eziokwu, tupu a na-enye ndụmọdụ. Chee echiche banyere ihe ọma ụmụnna gị na-eme—ihe Jehova na-aghaghị inwe nnọọ obi ụtọ na ha: okwukwe nke ọrụ ha na-egosipụta, ịhụnanya nke na-akpali ha ịdọgbu onwe ha n’ọrụ, na ntachi obi ha n’agbanyeghị ọnọdụ ndị bụụrụ ha ọnwụnwa. (1 Tesa. 1:2-8; 2 Tesa. 1:3-5) Nke a ga-enyere ụmụnna gị aka inwe mmetụta na e ji ha kpọrọ ihe ma na-aghọta ha, ọ ga-emekwa ka ha nwee ike ịnabata ndụmọdụ ga-esochi.
“Na-eji Ogologo Ntachi Obi Nile.” E kwesịrị ‘iji ogologo ntachi obi nile’ nye ndụmọdụ. (2 Tim. 4:2) Gịnị ka nke a na-agụnye? Ogologo ntachi obi na-agụnye iji ndidi na-atachi obi ná mmejọ ma ọ bụ mkpasu iwe. Onye nwere ogologo ntachi obi na-anọgide na-enwe olileanya na ndị na-ege ya ntị ga-etinye ihe ọ na-ekwu n’ọrụ. Iji mmụọ a na-adụ ọdụ ga-eme ka ndị na-ege gị ntị ghara iche na ị na-eche na o nwetụghị ebe ha dị mma. Obi ike i nwere na ụmụnna gị ndị nwoke na ndị nwanyị chọrọ iji ikike ha nile jeere Jehova ozi ga-akpali ha ịchọ ime ihe ziri ezi.—Hib. 6:9.
“Site n’Ozizi Na-enye Ezi Ndụ.” Olee otú onye okenye pụrụ isi ‘dụsie ọdụ ike site n’ozizi na-enye ezi ndụ’? Site ‘n’ijidesi okwu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi aka ike n’ihe metụtara nkà izi ihe ya.’ (Taị. 1:9) Kama ịdị na-ekwu echiche nke gị, mee ka Okwu Chineke bụrụ ebe agbamume gị dabeere. Kwee ka Bible kpụzie echiche gị banyere ihe i kwesịrị ikwu. Kọwapụta uru ndị dị n’itinye ihe Bible na-ekwu banyere okwu ahụ a na-atụle n’ọrụ. Buru nnọọ n’uche ihe ndị pụrụ isi n’emeghị ihe kwekọrọ n’Okwu Chineke pụta—ma ugbu a ma n’ọdịnihu—jirikwa ha mee ka ndị na-ege gị ntị kweta ná mkpa ọ dị ime ihe kwesịrị ekwesị.
Jide n’aka na ị kọwaara ndị na-ege gị ntị ihe ha kwesịrị ime na otú ha kwesịrị isi mee ya n’ụzọ doro anya. Mee ka o doo anya na ihe ị na-ekwu gbadosiri ụkwụ ike n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụrụ na Akwụkwọ Nsọ nyetụrụ ohere ná mkpebi ọ bụla a ga-eme, kọwapụta otú ohere ahụ haruru. Mgbe ahụ, n’okwu mmechi gị, nye agbamume ikpeazụ nke ga-ewusi mkpebi ndị na-ege gị ntị mere ime ihe ike.
Ná “Nkwuwa Okwu.” Iji dụọ ndị ọzọ ọdụ n’ụzọ dị irè, mmadụ aghaghị inwe “nkwuwa okwu . . . n’okwukwe.” (1 Tim. 3:13) Gịnị na-eme ka mmadụ nwee ike inwe nkwuwa okwu? Ọ bụ eziokwu ahụ bụ́ na “ihe nlereanya [nke ya] nke ezi ọrụ” kwekọrọ n’ihe ọ na-agba ụmụnna ume ka ha mee. (Taị. 2:6, 7; 1 Pita 5:3) N’ebe ọ dị otú a, ndị a na-agba ume ime ihe ga-aghọta na onye na-adụ ha ọdụ adịghị atụ anya ka ha mee ihe ya onwe ya na-adịghị eme. Ha ga-ahụ na ha pụrụ iṅomi okwukwe ya ọbụna ka ya onwe ya na-agbalị iṅomi Kraịst.—1 Kọr. 11:1; Fil. 3:17.
Ndụmọdụ nke dabeere n’Okwu Chineke, nke e jikwa ịhụnanya nye, pụrụ ịrụpụta ọtụtụ ihe ọma. Ndị e nyere ọrụ inye ndụmọdụ dị otú ahụ kwesịrị itinye mgbalị iji nye ya n’ụzọ dị mma.—Rom 12:8.