-
Nọgide Na-eme Ihe Ndị Ị MụtaworoỤlọ Nche—2002 | Septemba 15
-
-
Jụ ‘Akụkọ Ụgha’
8. (a) Olee otú Setan si achọ imebi okwukwe anyị taa? (b) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa nke Pọl ka a na-achọta na 2 Timoti 4:3, 4?
8 Setan na-agbalị imebi iguzosi ike n’ezi ihe anyị site n’ime ka anyị malite inwe obi abụọ banyere ihe ndị a kụziwooro anyị. Taa, dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, ndị si n’ezi ofufe dapụ na ndị ọzọ na-achọ imebi okwukwe nke ndị aka ha dị ọcha. (Ndị Galeshia 2:4; 5:7, 8) Mgbe ụfọdụ, ha na-eji usoro mgbasa ozi agbasa ihe ọmụma ndị a gwagburu agwagbu ma ọ bụ ọbụna ụgha ọcha banyere ụzọ ndị Jehova si eme ihe na ebumnobi ha. Pọl dọrọ aka ná ntị na a ga-ewezụga ụfọdụ n’eziokwu ahụ. “A ga-enwe oge,” ka o dere, “mgbe ha na-agaghị anagide ozizi ahụ na-enye ezi ndụ, kama, n’ikwekọ n’ọchịchọ nke ha, ha ga-akpọkọjuru onwe ha ndị ozizi iji mee ka ntị ha na-akọ ha ọkọ; ha ga-ewepụkwa ntị ha n’ebe eziokwu ahụ dị, ebe a ga-eme ka ha chigharịa gaa n’akụkọ ụgha.”—2 Timoti 4:3, 4.
9. Gịnị ka ọ pụrụ ịbụ na Pọl bu n’uche mgbe o kwuru banyere ‘akụkọ ụgha’?
9 Kama ijide ụkpụrụ nke okwu ahụ na-enye ezi ndụ, ‘akụkọ ụgha’ dọọrọ mmasị ụfọdụ ndị. Gịnị bụ akụkọ ụgha ndị a? Ikekwe ihe Pọl bu n’uche bụ akụkọ mgbe ochie ndị e chepụtara echepụta, dị ka ndị a na-achọta n’akwụkwọ apọkrịfa bụ́ Tobit.a Akụkọ ụgha ndị ahụ pụkwara ịgụnye kepu kepu ndị na-akpali akpali a na-ejighị n’aka. N’oge ahụ kwa, ụfọdụ—“n’ikwekọ n’ọchịchọ nke ha”—pụrụ ịbụwo ndị ndị na-akwado echiche nke mmadụ idebe ụkpụrụ Chineke ndị masịrị ha ma ọ bụ ndị na-akatọkarị ndị na-edu ndú n’ọgbakọ duhiere. (3 Jọn 9, 10; Jud 4) N’agbanyeghị ihe mkpọbi ụkwụ ọ bụla e nwere, o doro anya na ụfọdụ họọrọ ụgha karịa eziokwu nke Okwu Chineke. N’oge na-adịghị anya, ha kwụsịrị ime ihe ndị ha mụtaworo, nke a merụkwara ha ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ.—2 Pita 3:15, 16.
10. Olee ụfọdụ akụkọ ụgha e nwere n’oge a, oleekwa otú Jọn si kọwapụta mkpa ọ dị ịmụrụ anya?
10 Anyị pụrụ izere ịbụ ndị akụkọ ụgha dọtara taa ma ọ bụrụ na anyị na-eme nnyocha nke ọma ma na-ahọrọ ihe ndị anyị na-ege ntị na ha na ihe ndị anyị na-agụ ahọrọ. Dị ka ihe atụ, usoro mgbasa ozi na-akwalitekarị omume rụrụ arụ. Ọtụtụ mmadụ na-agba ume ka a ghara ịchọ ịmara ma Chineke ọ̀ dị ma ọ bụkwanụ ka a ghara ikwere ma ọlị na ọ dị. Ndị oké nkatọ Bible na-akwa ihe Bible kwuru, bụ́ na e dere ya n’ike mmụọ nsọ Chineke, emo. Ndị si n’ezi ofufe dapụ n’oge a nọgidekwara na-agbalị ịkụnye mkpụrụ nke obi abụọ iji mebie okwukwe nke Ndị Kraịst. Banyere ihe ize ndụ yiri ya nke ndị amụma ụgha kpatara na narị afọ mbụ, Jọn onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu ekwerela okwu nile sitere ná mkpali nke mmụọ, kama nwaleenụ okwu ndị sitere ná mkpali nke mmụọ ịhụ ma hà sitere na Chineke, n’ihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha abawo n’ime ụwa.” (1 Jọn 4:1) Ya mere, ọ dị anyị mkpa ịdị na-elezi anya.
11. Olee otu ụzọ anyị ga-esi nwalee ma hụ ma anyị nọ n’okwukwe ahụ?
11 Banyere nke a, Pọl dere, sị: “Nọgidenụ na-anwale ma ùnu nọ n’okwukwe ahụ.” (2 Ndị Kọrint 13:5) Onyeozi ahụ gbara anyị ume ịnọgide na-anwale onwe anyị iji mata ma anyị na-agbaso nkwenkwe nile nke Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na anyị na-adị na-ege ndị na-adịghị enwe afọ ojuju ntị, ọ dị anyị mkpa iji ekpere nyochaa onwe anyị. (Abụ Ọma 139:23, 24) Ànyị na-atụchakarị ndị Jehova? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Okwu ọnụ ma ọ bụ omume nke otu onye ò wutewo anyị? Ọ bụrụ otú ahụ, ànyị na-ele ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị? Mkpagbu ọ bụla anyị pụrụ iche ihu n’usoro ihe a ga-adị nwa oge. (2 Ndị Kọrint 4:17) Ọ bụrụgodị na anyị ezute ọnwụnwa ụfọdụ n’ọgbakọ, gịnị mere anyị ga-eji kwụsị ijere Chineke ozi? Ọ bụrụ na anyị na-ewe iwe n’ihi otu ihe, ọ̀ bụ na ọ kaghị nnọọ mma ime ihe anyị pụrụ ime iji dozie okwu ahụ ma hapụzie ya n’aka Jehova?—Abụ Ọma 4:4; Ilu 3:5, 6; Ndị Efesọs 4:26.
12. Olee otú ndị Beria si setịpụrụ anyị ezi ihe nlereanya?
12 Kama ịdị na-eme nkatọ, ka anyị nọgide na-ele ihe ọmụma ndị anyị na-enweta n’ọmụmụ ihe onwe onye na ná nzukọ ọgbakọ anya otú kwesịrịnụ n’ụzọ ime mmụọ. (1 Ndị Kọrint 2:14, 15) Kamakwa inwewe obi abụọ banyere Okwu Chineke, lee ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya karị inwe àgwà ndị Beria narị afọ mbụ nwere bụ́ ndị nyochara Akwụkwọ Nsọ nke ọma! (Ọrụ 17:10, 11) Ya mere, ka anyị na-eme ihe anyị na-amụta, na-ajụ akụkọ ụgha ma na-arapagidesi ike n’eziokwu ahụ.
13. Olee otú anyị pụrụ isi na-agbasa akụkọ ụgha n’amaghị ama?
13 E nwere ụdị akụkọ ụgha ọzọ nke ọ dị mkpa ka anyị nọrọ na nche megide. A na-agbasa ọtụtụ akụkọ ndị na-akpali akpali, ọtụtụ mgbe site n’ozi E-mail. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịkpachara anya banyere akụkọ ndị dị otú ahụ, karịsịa ma ọ bụrụ na anyị amaghị ebe ihe ọmụma ahụ sitere. Ọ bụrụgodị na ọ bụ Onye Kraịst nwere ezi aha zitere otu ahụmahụ ma ọ bụ akụkọ, ọ pụrụ ịbụ na onye ahụ ejighị anya ya hụ otú ihe ahụ si mee. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ịkpachara anya banyere ịkọrọ onye ọzọ ma ọ bụ izipụ akụkọ a na-achọpụtaghị ma ọ̀ bụ eziokwu. N’ezie, anyị agaghị achọ ịkọrọ ndị ọzọ “akụkọ ifo ndị na-emegide Chineke,” ma ọ bụ “akụkọ ụgha bụ́ ndị na-emerụ ihe dị nsọ.” (1 Timoti 4:7; New International Version) Ebe ọ bụ na anyị nwekwara ibu ọrụ ịgwarịta ibe anyị eziokwu, anyị ga-abụ ndị na-eme ihe n’ụzọ amamihe site n’izere ihe ọ bụla ga-eme ka anyị na-agbasa ihe ndị na-abụghị eziokwu, ọbụna n’amaghị ama.—Ndị Efesọs 4:25.
-
-
Nọgide Na-eme Ihe Ndị Ị MụtaworoỤlọ Nche—2002 | Septemba 15
-
-
a Tobit, nke e dere ma eleghị anya na narị afọ nke atọ T.O.A., na-agụnye akụkọ jupụtara na nkwenkwe ụgha banyere otu onye Juu aha ya bụ Tobias. E kwuru na o nwere ike inweta ikike ịgwọ ọrịa na nke ịchụpụ mmụọ ọjọọ site n’iji obi, òlùlù, na imeju nke otu azụ dị egwu eme ihe.
-