-
Tụkwasị Jehova Obi Mgbe NiileỤlọ Nche—2015 | Eprel 15
-
-
2 O yiri ka ọ̀ bụ n’oge ahụ ihe na-esiri Ndị Kraịst ike ka a tụrụ Pọl onyeozi mkpọrọ nke ugboro abụọ na Rom. Ụmụnna hà ga-abịa nyere ya aka? O nwere ike ịbụ ihe Pọl nọ na-eche, n’ihi na o degaara Timoti akwụkwọ ozi, sị: “Mgbe m na-azara ọnụ m na nke mbụ ya, ọ dịghị onye dịnyeere m, kama ha niile malitere ịgbahapụ m—ya esola n’ihe a ga-agụkọrọ ha.” Ma, Pọl ghọtara na a hapụghị ya ka ọ nọrọ naanị ya. O dere, sị: “Ma, Onyenwe anyị guzoro m nso ma nye m ike.” N’eziokwu, Jizọs nyere ya ike idi nsogbu ya. O doro anya na ọ baara Pọl uru. O dere, sị: “A napụtakwara m n’ọnụ ọdụm.”—2 Tim. 4:16, 17.a
3 Pọl chetara otú Jehova si nyere ya aka n’oge gara aga. Obi sikwara ya ike na Jehova ga-enye ya ike ọ ga-eji die nsogbu ọ nọ na ya nakwa ndị ga-abịa n’ọdịnihu. O kwuru ozugbo, sị: “Onyenwe anyị ga-anapụta m n’ajọ ọrụ niile.” (2 Tim. 4:18) N’eziokwu, Pọl mụtara na ọ bụrụgodị mgbe ụmụ mmadụ na-enweghị ike inyere ya aka, Jehova na Jizọs ga-enyere ya aka.
-
-
Tụkwasị Jehova Obi Mgbe NiileỤlọ Nche—2015 | Eprel 15
-
-
‘ỌNỤ ỌDỤM’
10-12. (a) Olee ihe nwere ike ime ka o siere Onye Kraịst ike ilekọta onye ezinụlọ ya na-arịa ọrịa? (b) Olee otú ịtụkwasị Jehova obi mgbe ihe siri ike ga-esi metụta adịm ná mma anyị na ya? Nye ihe atụ.
10 Mgbe ị nọ ná nnukwu nsogbu, o nwere ike ịdị gị ka ị̀ nọ “n’ọnụ ọdụm” otú ahụ ọ dị Pọl. N’ụdị oge ahụ, ịtụkwasị Jehova obi na-esi ezigbo ike. Ma, ọ bụ ihe anyị kwesịrị ime. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ị na-elekọta onye ezinụlọ unu na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala. I kpeela ekpere, rịọ Jehova ka o nye gị amamihe na ike.b I mechaa ihe niile i nwere ike ime, ọ̀ bụ na obi agaghị eru gị ala na Jehova na-ahụ gị nakwa na ọ ga-eme ka i nwee ike ịna-atachi obi?—Ọma 32:8.
-
-
Tụkwasị Jehova Obi Mgbe NiileỤlọ Nche—2015 | Eprel 15
-
-
a “Ọnụ ọdụm” ahụ nwere ike ịbụ nsogbu ndị siri ike ma ọ bụ ezigbo ọnụ ọdụm.
-