-
Ige Akọnuche Gị NtịỤlọ Nche—2007 | Ọktoba 15
-
-
Ige Akọnuche Gị Ntị
“Ihe nile dị ọcha nye ndị dị ọcha. Ma nye ndị rụrụ arụ na ndị na-enweghị okwukwe, ọ dịghị ihe dị ọcha.” —TAỊTỌS 1:15.
1. Olee ihe jikọrọ Pọl na ọgbakọ ndị dị na Krit?
MGBE Pọl onyeozi jesịrị njem ozi ala ọzọ atọ, a kpọchiri ya ma mesịa ziga ya na Rom, bụ́ ebe a tụrụ ya mkpọrọ afọ abụọ. Gịnị ka o mere mgbe a tọhapụrụ ya? Ka oge ụfọdụ gasịrị, ya na Taịtọs letara Krit bụ́ obodo mmiri gbara gburugburu, Pọl degaara Taịtọs akwụkwọ, sị: ‘M hapụrụ gị na Krit, ka i nwee ike idozi ihe ndị gahiere agahie, nweekwa ike ịhọpụta ndị okenye.’ (Taịtọs 1:5) Taịtọs ịrụ ọrụ ahụ e nyere ya rụọ gụnyere iso ndị akọnuche ha na-arụ ọrụ nke ọma na ndị nke ha na-anaghị arụ ọrụ nke ọma mekọọ ihe.
2. Olee nsogbu ndị Taịtọs doziri na Krit mmiri gbara gburugburu?
2 Pọl gwara Taịtọs ihe ndị a chọrọ n’aka ndị okenye ọgbakọ ma kwuzie na e nwere “ọtụtụ ndị isi ike, ndị na-ekwu okwu na-abaghị uru, na ndị na-eduhie uche.” Ndị a “na-ekpu ezinụlọ dum ihu site n’izi ihe ndị ha na-ekwesịghị izi.” Taịtọs ‘ga-anọgide na-adọ ha aka ná ntị.’ (Taịtọs 1:10-14; 1 Timoti 4:7) Pọl kwuru na uche ha na akọnuche ha “rụrụ arụ,” jiri okwu nwere ike ịpụta ihe nwere ntụpọ mee ihe, dị ka ihe e ji esiji ákwà pụrụ igbu ákwà mara mma. (Taịtọs 1:15) Ụfọdụ ndị ikom ahụ nwere ike ịbụ ndị Juu, n’ihi na ha “na-arapara n’obibi úgwù.” Ndị ikom dị otú ahụ anakarịghị eduhie ọgbakọ dị iche iche taa; n’agbanyeghị nke ahụ, anyị pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe site na ndụmọdụ ahụ Pọl nyere Taịtọs.
Ndị Akọnuche Ha Rụrụ Arụ
3. Olee ihe Pọl deere Taịtọs banyere akọnuche?
3 Rịba ihe mere Pọl ji kwuo okwu banyere akọnuche ama. “Ihe nile dị ọcha nye ndị dị ọcha. Ma nye ndị rụrụ arụ na ndị na-enweghị okwukwe, ọ dịghị ihe dị ọcha, kama ma uche ha ma akọ na uche ha rụrụ arụ. Ha na-ekwupụta n’ihu ọha na ha maara Chineke, ma ha na-agọnarị ya site n’ọrụ ha.” O doro anya na ọ dị ụfọdụ ndị oge ahụ mkpa ime mgbanwe iji mee ka ha “dị ike n’okwukwe.” (Taịtọs 1:13, 15, 16) Nsogbu ha nwere bụ ịmata ọdịiche dị n’etiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha, nke a bụkwa n’ihi otú akọnuche ha dị.
4, 5. Olee ntụpọ ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ dị iche iche nwere, oleekwa otú nke a si metụta ha?
4 Ihe karịrị afọ iri tupu mgbe ahụ, òtù na-achị isi nke Ndị Kraịst kpebiri na ọ dịghị mkpa ka e bie mmadụ úgwù tupu ya aghọọ ezi Onye Kraịst, ha gwakwara ọgbakọ dị iche iche banyere ya. (Ọrụ 15:1, 2, 19-29) N’agbanyeghị nke ahụ, ụfọdụ ndị nọ na Krit ka “na-arapara n’obibi úgwù.” Ha jụrụ mkpebi ahụ òtù na-achị isi mere n’ihu ọha, ‘na-ezi ihe ndị ha na-ekwesịghị izi.’ (Taịtọs 1:10, 11) Ebe ọ bụ na a gwagburu echiche ha agwagbu, ha nwere ike ịdị na-akwalite ihe Iwu ahụ kwuru banyere nri na ememe okpukpe ndị metụtara ịdị ọcha. O nwedịrị ike ịbụ na ha nọ na-agbakwụnye ihe n’ihe Iwu ahụ kwuru, dị ka ndị oge Jizọs mere tupu mgbe ahụ, o nwekwara ike ịbụ na ha nọ na-akụzi akụkọ ifo ndị Juu na iwu mmadụ.—Mak 7:2, 3, 5, 15; 1 Timoti 4:3.
5 Echiche dị otú ahụ mebiri ụzọ ha si ele ihe anya na omume ha, ya bụ akọnuche ha. Pọl dere, sị: “Nye ndị rụrụ arụ na ndị na-enweghị okwukwe, ọ dịghị ihe dị ọcha.” Akọnuche ha ghọrọ nke na-eduhie eduhie nke na ọ naghị agwa ha eziokwu n’ihe banyere omume na mkpebi ha. Ọzọkwa, ha kpere Ndị Kraịst ibe ha ikpe n’ihe ndị na-agbasaghị ha, bụ́ ihe ndị Onye Kraịst nke ọ bụla nwere ike ịhọrọ ime otú o si chọọ. N’akụkụ a, ndị Krit a lere ihe dị nnọọ ọcha anya dị ka ihe rụrụ arụ. (Ndị Rom 14:17; Ndị Kọlọsi 2:16) Ọ bụ ezie na ha na-ekwupụta na ha maara Chineke, ọrụ ha gosiri na ha amaghị ya.—Taịtọs 1:16.
‘Ihe Dị Ọcha Nye Ndị Dị Ọcha’
6. Olee ụdị ndị abụọ Pọl kwuru okwu banyere ha?
6 Olee otú anyị nwere ike isi rite uru n’ihe Pọl deere Taịtọs? Ọ dị mma, lee ọdịiche dị n’okwu a anya: “Ihe nile dị ọcha nye ndị dị ọcha. Ma nye ndị rụrụ arụ na ndị na-enweghị okwukwe, ọ dịghị ihe dị ọcha, kama ma uche ha ma akọ na uche ha rụrụ arụ.” (Taịtọs 1:15) Ihe Pọl na-ekwu abụghị na ihe nile dị nnọọ ọcha ma dị mma n’anya Onye Kraịst omume ya dị ọcha. Ihe anyị ji mara nke ahụ bụ na Pọl mere ka o doo anya n’akwụkwọ ozi ya ọzọ na onye na-akwa iko, onye na-ekpere arụsị, onye mgbaasị, na onye na-eme omume ọjọọ ndị ọzọ “agaghị eketa alaeze Chineke.” (Ndị Galeshia 5:19-21) N’ihi ya, anyị aghaghị ikwubi na Pọl na-ekwu okwu banyere ụdị ndị abụọ, ndị dị ọcha n’omume na n’ofufe ha na-efe Chineke na ndị na-adịghị ọcha.
-
-
Ige Akọnuche Gị NtịỤlọ Nche—2007 | Ọktoba 15
-
-
Olu Dị Iche Iche, Mkpebi Dị Iche Iche
9. Olee ọrụ akọnuche na-arụ, ma ọ bụrụ na “ihe nile dị ọcha”?
9 Ma olee ihe Pọl na-ekwu mgbe o kwuru na “ihe nile dị ọcha nye ndị dị ọcha”? Pọl na-ekwu banyere Ndị Kraịst merela ka echiche ha na omume ha kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke, bụ́ ndị dị n’Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ. Ndị Kraịst dị otú ahụ maara na n’ọtụtụ ihe Bible na-akagbughị kpọmkwem, ndị kwere ekwe ibe ha nwere ike ikpebi ime ihe dị iche iche. Kama ịkatọ ha, ha ghọtara na ihe ndị Chineke na-akagbughị dị “ọcha.” Ha anaghị atụ anya na echiche ha na mmadụ nile ga-ekwekọcha n’ihe ndị Bible na-akapịghị ọnụ. Ka anyị tụlee ụfọdụ ihe atụ.
-