Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
■ Jehova Chineke ọ̀ gwara Adam okwu n’onwe ya, ka ò sitere n’Okwu ahụ, bụ́ Ọkpara Chineke ọ mụrụ nanị ya kwuo okwu?
Bible enyeghị anyị kpọmkwem ihe bu azịza nye ajụjụ nke a. Ọ bụ ezie na Chineke pụrụ ịgwaworị ọkpara ya zuru okè bụ mmadụ okwu n’onwe ya n’lden, o yikarịrị ka Ọ gwara Adam okwu site n’Okwu ya.
Bible na-ekwukarị banyere Chineke ime ihe mgbe n’ezie o mere ha site n’otu mmụọ ozi ma ọ bu karịa. Dị ka ihe atụ, Jenesis 1:1 na-agwa anyị: “Na mbụ Chineke kere eluigwe na ụwa.” A sị na ọ gwụla ihe Bible gwara anyị banyere mmalite nke elu na ala, anyị pụrụ ikwubi na Chineke kere ya n’onwe ya, dị ka a ga-asị na o ji aka ya mee ha. Otú ọ dị, akụkụ Akwụkwọ nsọ Grik nke ndị Kraịst na-eme ka nghọta anyị sakwuo mbara. Anyị na-agụ, sị: “N’ime [Ọkpara nke Chineke] ka e kere ihe nile, nke dị n’ime eluigwe na nke dị n’elu ụwa, ihe a pụrụ ịhụ anya na ihe a na-apụghị ịhụ anya, . . . e sitewo n’aka ya kee ihe nile, e kewokwaara ya ihe nile.” (Ndị Kọlọsi 1:16, 17) Amaokwu ndị ọzọ na-emesi òkè Ọkpara ahụ keere n’okike nke eluigwe na ala ike. (Jọn 1:3, 10; Ndị Hibru 1:1, 2) N’agbanyeghị nke ahụ, òkè o keere bụ dị ka onye ọrụ e doro n’okpuru Jehova, bú onye malitere, nye ikike, ma duzie okike ihe ahụ.—Abụ Ọma 19:1.
Chineke gwara nwoke mbụ ahụ, sị: “Mkpụrụ nke sitere n’osisi nile ọ bụla nke ubi a gbara ogige ka ị ga na-eri.” (Jenesis 2:15, 17) Ọ dịghị Jehova mkpa iji ngwa ọrọ eletrik ọ bụla mee ihe dị ka ígwè okwu na-eme ka okwu daa ụda ma ọ bụ redio na-adọta okwu. Dị ka Ụlọ Nche nke August 1, 1989, si kwuo: “Nwoke ahụ ahụghị onye na-ekwu okwu ahụ. Olu ahụ sitere n’ebe a na-apụghị ịhụ anya, ọ na-agwakwa ya okwu. Ọ bu olu nke Onye Mere mmadụ, Onye Kere ya! . . . Ọ dịghị nwoke ahụ mkpa inwe redio ọgbara ọhụrụ e mepụtara site n’ọkà mmụta sayensi iji nụ olu Chineke ahụ. Chineke sooro ya nwee mkparịta ụka ọnụ na ọnụ.”
Chineke ò kwuru okwu site na mmụọ ozi, ma eleghị anya site n’ọnụ Logos, onye ghọrọ Jisọs? Ọ pụrụ ịdị otú ahụ kpọmkwem. N’abụghị n’ihi ịnụ ọkụ n’obi gabiga ókè, C. T. Russell dere, sị: “Ma eleghị anya Jisọs bụ Onye Nnọchianya Chineke n’Ogige Iden n’ebe Adam nọ.” (Ụlọ Nche, [Bekee] mbipụta nke February 1, 1915) Ọkpara mbụ nke Chineke ejewo ozi eri ogologo oge n’ọkwá ahụ e buliri elu nke “Okwu,” ma ọ bụ Onye Na-ekwuchitere Nna ya, nye ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ. (Jọn 1:1; 12:49, 50; Mkpughe 1:1, 2) Ya mere ọ bụrụgodi na ihe ndekọ Jenesis na-enye echiche nke na Chineke kwuru okwu n’onwe ya gwa Adam nọ nanị ya, nke ahụ adịghị akagbu echiche nke na O kwuru okwu site n’ọnụ otu mmụọ ozi, tinyere Okwu ya, bụ́ Ọkpara Jehova nke eluigwe. Nke a ga-adị otú ahụ karịsịa mgbe a tụlere na Jehova jiri Logos ahụ mee ihe ike mmadụ n’ọnọdụ mbụ, ‘ihe na-atọkwa onye nke a ụtọ dịkwa n’ebe ụmụ mmadụ nọ.’—Ilu 8:22, 31; Jọn 1:3.
Dị ka ihe atụ, tụlee ihe mere mgbe Moses rịgoro n’Ugwu Saịnaị. Ọpụpụ 19:21-24 na-akọ, sị: “Jehova wee sị Moses . . . Moses wee sị Jehova . . . Jehova sị ya.” E mesịa a malitere ihe ndekọ nke inye Iwu Iri ahụ n’ụzọ dị otú a: “Chineke wee kwuo okwu ndị a nile.” (Ọpụpụ 20:1) Nke ahụ ò na-eyi ka Chineke ò ji ọnụ ya kwuo okwu Iwu ndị ahụ? A pụrụ ịkwado echiche dị otú ahụ n’ihi na a gwara anyị na Chineke gwara Moses okwu “ihu na ihu.”—Ọpụpụ 31:11.
Ma, anyị nwere mkpughe ọzọ banyere nke a. Pọl onyeozi dere banyere Iwu ahụ, sị: “E sitekwara n’aka ndị mmụọ ozi nye iwu ahụ site n’aka onye ogbugbo.” (Ndị Galetia 3:19) E mesịa, Pọl jiri ndụmọdụ ndị Chineke nyere n’lwu ahụ tụnyere ihe ndị Kraịst natara site n’aka Jisọs: “À sị na e mere okwu e kwuru site n’ọnụ ndị mmụọ ozi ka o guzosie ike, à sikwa na njehie nile ọ bụla na-aṅaghị ntị nile ọ bụla natara nnyeghachi nke ụgwọ ọrụ . . . ; anyị onwe anyị ga-esi aṅaa gbanarị, ma ọ bụrụ na anyị lefuuru oké nzọpụta dị otú a anya? bụ́ nzọpụta nke e buru ụzọ kwuo site n’ọnụ Onyenwe anyị [Jisọs], ndị nụrụ ya wee mee ka o guzosie ike ruo ebe anyị nọ.” (Ndị Hibru 2:2, 3) Ya mere Chineke ekwughị okwu Iwu ndị ahụ site n’ọnụ nke onwe ya, o jighịkwa Logos ahụ mee ihe. Kama, ọ họọrọ iji ndị mmụọ ozi ndị ọzọ mee ihe.
Otú ọ dị, gịnị bụ isi ihe a na-aghọta? Ọtụtụ mgbe mgbe anyị na-agụ banyere Chineke ịgwa ndị mmadụ okwu, anyị na-arịba ama na o mere otú ahụ site ná ndị mmụọ e kere eke na-erube isi bụ́ ndị kwuchiteere ya ọnụ ya. (Tụlee Jenesis 18:2, 3, 33; 19:1; Ọpụpụ 3:2-4; Ndị Ikpe 6:11, 12, 20-22.) Ịkpọ Jisọs Okwu ahụ na-enye echiche nke na ọ bụ onye Chineke na-ejikarị eme ihe ịgwa ihe ndị ọzọ o kere eke okwu. Nke ahụ ọ̀ gụnyere ọkpara zuru okè nke Chineke, bụ́ Adam? O yikarịrị ka ọ dị otú ahụ.—Luk 3:38.
Ọ bu ezie na mgbe Logos ahụ mesịrị bịa n’elu ụwa, Nna ahụ kwuru okwu ugbo atọ n’ụzọ dara ụda ka “Adam ikpeazụ” nke a wee nụ. (1 Ndị Kọrint 15:45; Matiu 3:16, 17; 17:1-5; Jọn 12:28-30) N’oge ndị a, gịnị mere Chineke ga-eji kwuo okwu ma ọ bu gwa Ọkpara ya dị oké ọnụ ahịa okwu site n’ọnụ mmụọ ozi nke bụ onye ogbugbo? N’ụzọ ezi uche dị na ya karị, Jehova ga-ekwu okwu n’onwe ya; Ọkpara ya zuru okè na ọbụna ndị mmadụ na-ezughị okè nọ nso, nụrụ olu Chineke n’onwe ya. Ya mere, mgbe e kere mmadụ ahụ zuru okè bụ Adam, Nna ya na-ahụ n’anya pụrụ imesoworị ihe okike ọhụrụ nke a ihe kpọmkwem n’onwe ya. Otú ọ dị, n’ihi ihe ndị e kwuworo, o yikarịrị ka o jiri Okwu ahụ mee ihe.