Nọgide ‘n’Obodo Mgbaba’ Wee Dịrị Ndụ!
“N’ime obodo mgbaba ya ka ọ ga-ebi ruo mgbe ọnwụ onye isi nchụàjà . . . gasịrị.”—ỌNỤ ỌGỤGỤ 35:28.
1. Ònye bụ Onye Ọ́bọ̀ ọbara, gịnịkwa ka ọ gaje ime n’isi nso?
ONYE ỌBỌ ọbara nke Jehova, bụ́ Jisọs Kraịst, na-achọ ịkpa ike. Ya na ìgwè ndị agha ya bụ́ ndị mmụọ ozi, Onye Ọ́bọ̀ a ga-eme ihe n’isi nso megide ndị nile ikpe ọbara mara n’enweghị nchegharị. Ee, Jisọs ga-eje ozi dị ka Onye Na-emezu Ikpe nke Chineke n’oge “mkpagbu ukwu” ahụ ji ọsọ na-abịaru nso. (Matiu 24:21, 22; Aịsaịa 26:21) Mgbe ahụ ihe a kpọrọ mmadụ ga-eche ikpe ọmụma ọbara ha ihu.
2. Olee ezi ebe mgbaba e nwere nanị ya, oleekwa ajụjụ ndị chọrọ azịza?
2 Ụzọ nchebe bụ ịbanye n’okporo ụzọ nke obodo mgbaba ihe atụ ma gbalaga maka ndụ gị! Ọ bụrụ na a nabata mmadụ n’obodo ahụ, onye gbara ọsọ ndụ gaje ịnọgide n’ebe ahụ, n’ihi na ọ gwụla ebe ahụ bụ ezi ebe mgbaba e nwere. Ma ị pụrụ ịjụ sị, ‘Ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị adịbeghị mgbe anyị gburu mmadụ, ànyị nwere ikpe ọmụma ọbara n’ezie? N’ihi gịnị ka Jisọs ji bụrụ Onye Ọ́bọ̀ ọbara? Gịnị bụ obodo mgbaba nke oge a? Ọ̀ dị onye pụrụ mgbe ọ bụla ịhapụ ya n’enwetaghị mmerụ ahụ?’
Ànyị Nwere Ikpe Ọmụma Ọbara n’Ezie?
3. Olee ihe dị n’Iwu Mosis nke ga-enyere anyị aka ịhụ na ọtụtụ ijeri ndị bi n’ụwa na-ekerịta ikpe ọmụma ọbara?
3 Otu ihe dị n’Iwu Mosis ga-enyere anyị aka ịhụ na ọtụtụ ijeri ndị bi n’ụwa na-ekerịta ikpe ọmụma ọbara. Chineke tụkwasịrị ụmụ Israel ibu ọrụ e nwekọrọ ọnụ maka mwụfu ọbara. Ọ bụrụ na a chọta onye e gburu egbu ma a maghị onye gburu ya, ndị ikpe gaje ịtụ ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị anya nke obodo ndị dị gburugburu iji mata obodo kasị nso. Iji kpochapụ ikpe ọmụma, ndị okenye obodo ahụ o yiri ka ikpe ọbara mara gaje ịgbaji olu nke otu nwa agbọghọ ehi a na-ejibeghị rụọ ọrụ na ndagwurugwu mmiri na-eru nke a na-arụghị ọrụ ubi na ya. A na-eme nke a n’ihu ndị nchụàjà ebo Livaị ‘n’ihi na Jehova họpụtara ha ikpezi okwu n’otiti ihe ọ bụla.’ Ndị okenye obodo ahụ ga-akwọ aka ha n’elu nwa agbọghọ ehi ahụ wee sị: “Aka anyị awụsịghị ọbara nke a, anya anyị ahụghịkwa ya. Jehova, kpuchiere ndị Gị mmehie ha, bụ́ Israel, nke Ị gbapụtaworo, ekwela ka ọbara nke na-emeghị ihe ọjọọ dị n’etiti ndị Gị, bụ́ Israel.” (Deuterọnọmi 21:1-9) Jehova Chineke achọghị ka ala Israel bụrụ nke e ji ọbara metọọ ma ọ bụ ka ndị ya na-ebukọ ikpe ọmụma ọbara e nwekọrọ ọnụ.
4. Olee ihe ndekọ ikpe ọmụma ọbara nke Babilọn Ukwu ahụ nwere?
4 Ee, e nwere ihe bụ ikpe ọmụma ọbara e nwekọrọ ọnụ, ma ọ bụ nke ọha. Chee banyere oké ikpe ọmụma ọbara dịkwasị Babilọn Ukwu ahụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Ee, ọbara ndị ohu Jehova na-aba ya n’anya dị ka mmanya! (Mkpughe 17:5, 6; 18:24) Okpukpe nile nke Krisendọm na-azọrọ ịdị na-eso Onyeisi Udo ahụ, ma agha, njụta okwukwe nke okpukpe, na agha ntụte ndị na-eweta ọnwụ emewo ka ikpe ọbara ma ya n’ihu Chineke. (Aịsaịa 9:6; Jeremaịa 2:34) N’ezie, ọ ghaghị inwe ikpe ọmụma kanụ n’ihi ọnwụ nke ọtụtụ nde mmadụ n’agha ụwa abụọ nke narị afọ a. Ya mere, ndị nọsiri ike n’okpukpe ụgha nakwa ndị na-akwado na ndị na-ekere òkè n’obubu agha ụmụ mmadụ nwere ikpe ọmụma ọbara n’ihu Chineke.
5. Olee otú ụfọdụ ndị siworo dị ka ogbu mmadụ n’ọghọm n’Israel?
5 Ụfọdụ ndị amawo ụma ma ọ bụ site n’elezighị anya kpata ọnwụ mmadụ. Ndị ọzọ ekerewo òkè n’iso n’ìgwè gbuo mmadụ, ma eleghị anya bụrụ ndị ndị ndú okpukpe mere ka ha kweta na nke a bụ uche Chineke. Ndị ọzọkwa akpagbuwo ma gbuo ndị ohu Chineke. Ma, a sịgodị na anyị emebeghị ihe ndị dị otú ahụ, anyị na-ekerịta ibu ọrụ nke ọha nwekọrọ ọnụ n’ihi mfu nke ndụ mmadụ n’ihi na anyị amaghị iwu na uche Chineke. Anyị dị ka onye ahụ gburu mmadụ n’ọghọm ‘onye gburu mmadụ ibe ya n’amaghị ama, ma ya onwe ya akpọghị ya asị na mgbe gara aga.’ (Deuterọnọmi 19:4) Ndị dị otú ahụ kwesịrị ịrịọ Chineke maka ebere, kwesịkwa ịgbaga n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ. Ma ọ bụghị ya ha ga-ezute Onye Ọ́bọ̀ ọbara n’ụzọ na-eweta ọnwụ.
Òkè Ndị Dị Mkpa Jisọs Na-ekere
6. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Jisọs bụ onye ikwu kasị nso nke ihe a kpọrọ mmadụ?
6 N’Israel onye ọ́bọ̀ ọbara bụ onye ikwu kasị nso nke onye e gburu. Iji bọọ ọ́bọ̀ ndị nile e gburu n’ụwa na karịsịa ndị ohu Jehova e gburu, Onye Ọ́bọ̀ ọbara nke oge a aghaghị ịbụ onye ikwu nke ihe nile a kpọrọ mmadụ. Jisọs Kraịst emezuwo òkè ahụ. A mụrụ ya dị ka nwoke zuru okè. Jisọs nyere ndụ ya nke na-enweghị mmehie n’ọnwụ dị ka àjà mgbapụta, mgbe o bilitesịkwara n’ọnwụ laa n’eluigwe, o chere uru ya n’ihu Chineke n’ihi ụmụ Adam na-eme mmehie bụ́ ndị na-anwụ anwụ. Kraịst si otú a ghọọ Onye Mgbapụta nke ihe a kpọrọ mmadụ, onye ikwu anyị kasị nso—Onye Ọ́bọ̀ ọbara n’izi ezi. (Ndị Rom 5:12; 6:23; Ndị Hibru 10:12) A kọwara Jisọs dị ka nwanne nwoke nye ụmụazụ ya e tere mmanụ ndị na-eso ijeụkwụ ya. (Matiu 25:40, 45; Ndị Hibru 2:11-17) Dị ka Eze eluigwe ọ na-aghọ “Nna Nke bụ Nna mgbe nile ebighị ebi” nke ndị ga-erite uru n’àjà ya dị ka ndị ọ ga-achị n’elu ụwa. Ndị a ga-adị ndụ ebighị ebi. (Aịsaịa 9:6, 7) Ya mere n’ụzọ kwesịrị ekwesị Jehova ahọpụtawo Onye Ikwu a nke ihe a kpọrọ mmadụ dị ka Onye Ọ́bọ̀ ọbara.
7. Dị ka Onyeisi Nchụàjà ukwu, gịnị ka Jisọs na-emere ụmụ mmadụ?
7 Jisọs bụkwa Onyeisi Nchụàjà nke na-enweghị mmehie, nke a nwaworo, nke dị ọmịiko. (Ndị Hibru 4:15) N’ọkwá nke a ọ na-eji uru nke àjà ya na-ekpuchi mmehie eme ihe n’isi ihe a kpọrọ mmadụ. E guzobere obodo mgbaba ndị ahụ maka ‘ụmụ Israel na maka ndị ọbịa na maka onye bi n’etiti ha.’ (Ọnụ Ọgụgụ 35:15) Ya mere Onyeisi Nchụàjà ukwu ahụ bu ụzọ jiri uru nke àjà ya mee ihe n’isi ụmụazụ ya e tere mmanụ, bụ́ “ụmụ Israel.” Ugbu a a na-eji ya eme ihe maka ‘ndị ọbịa’ na ‘ndị bi ebi’ n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ. “Atụrụ ọzọ” a nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-ele anya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ụwa.—Jọn 10:16; Abụ Ọma 37:29, 34.
Obodo Mgbaba nke Taa
8. Gịnị bụ obodo mgbaba ihe atụ ahụ?
8 Gịnị bụ obodo mgbaba ihe atụ ahụ? Ọ bụghị ebe ọ bụla n’elu ụwa dị ka Hebrọn, otu n’ime obodo mgbaba isii nke ndị Livaị na ebe obibi nke onye isi nchụàjà Israel. Obodo mgbaba nke taa bụ ndokwa Chineke maka ichebe anyị pụọ n’ọnwụ n’ihi imebi ihe o nyere n’iwu banyere ịdị nsọ nke ọbara. (Jenesis 9:6) Ma ọ bụ nke a ma ụma ma ọ bụ nke mere n’ọghọm, onye ọ bụla mebiri ihe ahụ e nyere n’iwu aghaghị ịchọ mgbaghara Chineke na nkachapụ nke mmehie ya site n’okwukwe n’ọbara Onyeisi Nchụàjà ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị nwere olileanya eluigwe na “oké ìgwè mmadụ” ahụ nwere olileanya elu ụwa ejiwo uru nke àjà mkpuchi mmehie nke Jisọs meere onwe ha ihe, ha nọkwa n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ.—Mkpughe 7:9, 14; 1 Jọn 1:7; 2:1, 2.
9. Olee otú Sọl nke Tasọs si mebie ihe Chineke nyere n’iwu banyere ọbara, ma olee otú o si gosipụta mgbanwe nke omume?
9 Tupu ọ ghọọ onye Kraịst, Pọl onyeozi emebiwo ihe e nyere n’iwu banyere ọbara. Dị ka Sọl nke Tasọs, ọ kpagburu ụmụazụ Jisọs na ọbụna kwado ogbugbu ha. “Otú ọ dị,” ka Pọl kwuru, “O meere m ebere, n’ihi na emere m ya n’amaghị ama n’ime ekweghị ekwe.” (1 Timoti 1:13; Ọrụ 9:1-19) Sọl nwere àgwà nchegharị, nke e mesịrị nwapụta site n’ọtụtụ ọrụ okwukwe. Ma a chọrọ ihe karịrị okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ iji banye n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ.
10. Olee otú o si ekwe omume inweta ezi akọ na uche, gịnịkwa ka a na-aghaghị ime iji jigide ya?
10 Onye gburu mmadụ n’ọghọm pụrụ ịnọ n’otu n’ime obodo mgbaba ndị nke Israel nanị ma ọ bụrụ na ọ pụrụ ịnwapụta na ya nwere ezi akọ na uche n’ebe Chineke nọ banyere ịwụfu ọbara. Iji nweta ezi akọ na uche, anyị aghaghị inwe okwukwe n’àjà Jisọs, chegharịa ná mmehie nile anyị, gbanweekwa ụzọ anyị. Ọ dị anyị mkpa ịrịọ maka ezi akọ na uche ná nraranye e ji ekpere mee nye Chineke site na Kraịst, na-egosipụta nke a site na baptism ime mmiri. (1 Pita 3:20, 21) Ezi akọ na uche nke a na-enye anyị ohere iso Jehova nwee mmekọrịta dị ọcha. Ụzọ e nwere nanị ya isi nọgide na-enwe ezi akọ na uche bụ irube isi n’ihe ndị Chineke chọrọ ma rụọ ọrụ e kenyere anyị n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ, ọbụna dị ka ndị gbara ọsọ ndụ n’obodo mgbaba ndị nke oge ochie na-aghaghị irube isi n’Iwu ahụ ma rụzuo ọrụ ndị e kenyere ha. Ọrụ bụ isi maka ndị Jehova taa bụ nke ikwusa ozi Alaeze ahụ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ịrụ ọrụ ahụ ga-enyere anyị aka ịbụ ndị bara uru bi n’obodo mgbaba nke taa.
11. Gịnị ka a na-aghaghị izere ma ọ bụrụ na anyị ga-anọgide na nchebe n’ime obodo mgbaba nke taa?
11 Isi n’obodo mgbaba nke taa pụọ bụ ikpughepụ onwe anyị nye mbibi, n’ihi na n’isi nso Onye Ọ́bọ̀ ọbara ga-abanye ọrụ megide ndị nile ikpe ọbara mara. Nke a abụghị oge ịbụ onye a nwụdere n’èzí obodo a dị nchebe ma ọ bụ n’ebe dị ize ndụ dịdewere ókèala ala ịta nri ya nile. Anyị ga-enweta onwe anyị n’èzí nke obodo mgbaba ihe atụ ahụ ma ọ bụrụ na anyị enwekwaghị okwukwe n’àjà mkpuchi mmehie nke Onyeisi Nchụàjà ahụ. (Ndị Hibru 2:1; 6:4-6) Anyị agaghịkwa anọ ná nchebe ma ọ bụrụ na anyị agbasoo ụzọ ụwa, guzo n’ọnụ ọnụ nke nzukọ Jehova, ma ọ bụ kpapụ site n’ụkpụrụ ezi omume nile nke Nna anyị nke eluigwe.—1 Ndị Kọrint 4:4.
Ndị A Tọhapụrụ Site n’Obodo Mgbaba Ahụ
12. Ogologo oge hà aṅaa ka ndị nweburu ikpe ọmụma ọbara na-aghaghị ịnọgide n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ?
12 Onye gburu mmadụ n’ọghọm n’Israel aghaghị ịnọgide n’obodo mgbaba “ruo mgbe ọnwụ onye isi nchụàjà.” (Ọnụ Ọgụgụ 35:28) Ya mere ruo ogologo oge hà aṅaa ka ndị nweburu ikpe ọmụma ọbara ga-anọgide n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ? Ruo mgbe ha na-enwekwaghị mkpa maka ije ozi Onyeisi Nchụàjà ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. “[Ọ pụrụ] ịzọpụtachasị ndị na-esite n’aka Ya abịakwute Chineke,” ka Pọl kwuru. (Ndị Hibru 7:25) Ruo ogologo oge ntetọ ọ bụla nke mmehie na ikpe ọmụma ọbara gara aga na-adịgide, ije ozi nke Onyeisi Nchụàjà ahụ dị mkpa ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè wee nwee ike inwe ezi nguzo n’ihu Chineke.
13. Olee ndị bụ “ụmụ Israel” nke taa, ogologo oge hà aṅaa ka ha na-aghaghịkwa ịnọgide n’ime “obodo mgbaba” ahụ?
13 Cheta na e guzobere obodo mgbaba ndị nke oge ochie maka “ụmụ Israel,” ndị ọbịa, na ndị bi ebi. “Ụmụ Israel” bụ ndị Israel ime mmụọ. (Ndị Galetia 6:16) Ha aghaghị ịnọgide n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ ruo ogologo oge nile ha bi n’elu ụwa. N’ihi gịnị? N’ihi na ha ka nọ n’anụ ahụ na-ezughị okè, n’ihi ya kwa nwee mkpa nke uru mkpuchi mmehie nke Onyeisi Nchụàjà ha nke eluigwe. Ma mgbe ndị Kraịst a e tere mmanụ nwụrụ, a kpọlitekwa ha gaa ná ndụ ịbụ mmụọ n’eluigwe, ha adịkwaghị enwe mkpa nke ije ozi mkpuchi mmehie nke Onyeisi Nchụàjà; ha ga-ahapụworị ruo mgbe ebighị ebi anụ ahụ na ikpe ọmụma ọbara e jikọtara ya na ya. N’ebe ndị dị otú ahụ e tere mmanụ bụ́ ndị e si n’ọnwụ kpọlite nọ, Onyeisi Nchụàjà ahụ ga-anwụworị n’ọkwá nke mkpuchi mmehie, nke nchebe.
14. Olee ihe ọzọ na-achọ ka ndị nwere olileanya eluigwe nọgide n’obodo mgbaba nke taa?
14 Inwe ọdịdị mmadụ kpọmkwem na-achọ ka ndị ga-abụ “ndị ha na Kraịst na-ekekọ” n’eluigwe nọgide n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ ruo mgbe ha ji ikwesị ntụkwasị obi jesịa ozi elu ụwa ha n’ọnwụ. Mgbe ha nwụrụ, ha ga-achụ ọdịdị mmadụ n’àjà ruo ebighị ebi. (Ndị Rom 8:17; Mkpughe 2:10) Àjà Jisọs dịịrị nanị ndị nwere ọdịdị mmadụ. N’ihi ya, Onyeisi Nchụàjà ahụ na-anwụ n’ebe ndị Israel ime mmụọ nọ mgbe a kpọlitere ha n’ọnwụ dị ka ụmụ mmụọ e kere eke bụ́ ndị ga-ebi ruo ebighị ebi n’eluigwe dị ka “ndị na-enwekọ ihe O ji bụrụ Chineke.”—2 Pita 1:4.
15. Olee ndị bụ ‘ndị ọbịa’ na ‘ndị bi ebi’ nke oge a, oleekwa ihe Onyeisi Nchụàjà ukwu ahụ ga-emere ha?
15 Olee mgbe Onyeisi Nchụàjà ahụ “ga-anwụ” n’ihe banyere ‘ndị ọbịa’ na ‘ndị bi ebi’ nke oge a, na-enye ha ohere ịhapụ obodo mgbaba ihe atụ ahụ? Ndị a so n’oké ìgwè mmadụ ahụ apụghị isi n’obodo mgbaba a pụta ozugbo mkpagbu ukwu ahụ gasịrị. N’ihi gịnị? N’ihi na ha ka ga-anọ n’anụ ahụ ha na-ezughị okè, nke na-emehie emehie, ọ ga-adịkwa ha mkpa ịnọgide n’okpuru nchebe nke Onyeisi Nchụàjà ahụ. Site n’iji ije ozi mkpuchi mmehie ya meere onwe ha ihe n’oge ọbụbụeze na ịbụ onye nchụàjà ya nke otu puku afọ, ha ga-enweta izu okè mmadụ. Jisọs ga-enyefezi ha n’aka Chineke maka ule ikpeazụ, nke mkpebi ebighị ebi maka iguzosi ike n’ezi ihe ha site ná ntọhapụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ruo nwa oge. N’ihi na ha gabigara ule a na-enwe nnwapụta Chineke, Jehova ga-agụ ha ná ndị ezi omume. Otú a ha ga-eru nnọọ uju nke izu okè mmadụ.—1 Ndị Kọrint 15:28; Mkpughe 20:7-10.a
16. Olee mgbe ndị lanarịrị mkpagbu ukwu ahụ na-agakwaghị enwe mkpa ije ozi mkpuchi mmehie nke Onyeisi Nchụàjà ahụ?
16 Ya mere, ndị lanarịrị mkpagbu ukwu ahụ gaje ijigide ezi akọ na uche site n’ịnọgide n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ ruo ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst. Dị ka ụmụ mmadụ e mere ka ha zuo okè, ha agakwaghị enwe mkpa nke ije ozi mkpuchi mmehie nke Onyeisi Nchụàjà ahụ, ha ga-esikwa n’okpuru nchebe ya pụta. Mgbe ahụ Jisọs ga-anwụ n’ebe ha nọ dị ka Onyeisi Nchụàjà, n’ihi na ọ gaghị adịkwa ya mkpa iji ọbara na-eme ka a dị ọcha nke àjà ya mee ihe n’isi ha. N’oge ahụ ha ga-esi n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ pụta.
17. N’ihi gịnị ka ọ na-agaghị eji adị mkpa ndị a kpọlitere n’ọnwụ n’oge Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst ịbanye n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ ma nọgide n’ime ya?
17 Ọ̀ bụ iwu na ndị a kpọlitere n’oge Ọchịchị Puku Afọ nke Jisọs ga-abanyerịrị n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ ma nọgide n’ebe ahụ ruo ọnwụ nke onye isi nchụàjà? Ee e, n’ihi na site n’ịnwụ ha kwụrụ ụgwọ maka ha ịbụ ndị mmehie. (Ndị Rom 6:7; Ndị Hibru 9:27) Ka o sina dị, Onyeisi Nchụàjà ahụ ga-enyere ha aka iru izu okè. Ọ bụrụ na ha alanarị ule ikpeazụ ahụ nke ọma mgbe Narị Afọ Iri ahụ gasịrị, Chineke ga-agụkwa ha ná ndị ezi omume na-enwe nkwa e ji n’aka nke ndụ agwụghị agwụ n’elu ụwa. Otú ọ dị, erubeghị isi n’ihe ndị Chineke chọrọ ga-eweta ikpe ọmụma na mbibi n’isi mmadụ nile ọ bụla na-alafereghị ule ikpeazụ ahụ dị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe.
18. Banyere ọbụbụeze na ịbụ onye nchụàjà nke Jisọs, gịnị ga-adịgidere ihe a kpọrọ mmadụ ruo ebighị ebi?
18 Ndị isi nchụàjà Israel mesịrị nwụọ. Ma Jisọs “bụrụ onye isi nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro nke Melkizedek si dị.” (Ndị Hibru 6:19, 20, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche; 7:3) Ya mere nkwụsị nke ọkwá Jisọs dị ka Onyeisi Nchụàjà bụ́ onye ogbugbo n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ adịghị eweta ndụ ya ná njedebe. Mmetụta ọma nile nke ije ozi ya dị ka Eze na Onyeisi Nchụàjà ga-adịgidere ihe a kpọrọ mmadụ ruo mgbe ebighị ebi, ụmụ mmadụ ga-enwekwa obi ekele ruo ebighị ebi nye ya maka ya ijewo ozi n’ọkwá ndị a. Ọzọkwa, ruo mgbe nile ebighị ebi Jisọs ga-ebute ụzọ n’ofufe dị ọcha nke Jehova.—Ndị Filipaị 2:5-11.
Ihe Mmụta Ndị Bara Uru Nye Anyị
19. Ihe mmụta dị aṅaa banyere ịkpọasị na ịhụnanya ka a pụrụ ịmụta site ná ndokwa nke obodo mgbaba?
19 Anyị pụrụ ịmụta ihe dị iche iche site ná ndokwa nke obodo mgbaba. Dị ka ihe atụ, ọ dịghị ogbu mmadụ nwere ịkpọasị nke na-akpata igbu ọchụ maka onye o gburu nke e kwere ka o biri n’obodo mgbaba. (Ọnụ Ọgụgụ 35:20, 21) Ya mere olee otú mmadụ ọ bụla nọ n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ ga-esi kwere ka ịkpọasị maka otu nwanna tolite n’obi ya? “Onye ọ bụla nke na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ,” ka Jọn onyeozi dere, “unu matakwara na ọ dịghị ogbu mmadụ ọ bụla nwere ndụ ebighị ebi na-adịgide n’ime ya.” Ya mere ka anyị “hụrịta onwe anyị n’anya: n’ihi na ịhụnanya bụ ihe si na Chineke pụta.”—1 Jọn 3:15; 4:7.
20. Maka nchebe pụọ n’aka Onye Ọ́bọ̀ ọbara ahụ, gịnị ka ndị nọ n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ na-aghaghị ime?
20 Maka nchebe pụọ n’aka onye ọ́bọ̀ ọbara, ndị gburu mmadụ n’ọghọm aghaghị ịnọgide n’ime obodo mgbaba ma ghara ịkpapụ gabiga ala ịta nri ya. Gịnị banyere ndị nọ n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ? Maka nchebe pụọ n’aka Onye Ọ́bọ̀ ọbara ukwu ahụ, ha agaghị apụ n’obodo ahụ ma ọlị. N’ezie, ọ dị ha mkpa ịnọ na nche megide ihe ụrà dị iche iche ịga n’ọnụ ọnụ nke ala ịta nri ndị ahụ, dị ka a pụrụ ikwu ya. Ha aghaghị ilezi anya ịghara ikwe ka ịhụnanya maka ụwa Setan tolite n’ime obi ha. Nke a pụrụ ịchọ ekpere na mgbalị, ma ndụ ha dabeere na ya.—1 Jọn 2:15-17; 5:19.
21. Ọrụ dị aṅaa na-enyeghachi ụgwọ ọrụ ka ndị nọ n’obodo mgbaba nke taa na-arụ?
21 Ndị gburu mmadụ n’ọghọm n’obodo mgbaba ndị nke oge ochie aghaghị ịbụ ndị ọrụ na-arụpụta ihe. N’otu aka ahụ, “ụmụ Israel” e tere mmanụ esetịpụwo ihe nlereanya ọma dị ka ndị ọrụ owuwe ihe ubi na ndị nkwusa Alaeze. (Matiu 9:37, 38; Mak 13:10) Dị ka ‘ndị ọbịa’ na ‘ndị bi ebi’ n’obodo mgbaba nke taa, ndị Kraịst nwere olileanya elu ụwa nwere ihe ùgwù nke iso ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa na-arụ ọrụ a na-azọpụta ndụ. Leekwa aha ọrụ na-enyeghachi ụgwọ ọrụ ọ bụ! Ndị na-arụ ọrụ n’ikwesị ntụkwasị obi n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ ga-alanarị ọnwụ ebighị ebi n’aka Onye Ọ́bọ̀ ọbara ahụ. Kama nke ahụ, ha ga-enweta uru ebighị ebi site n’ije ozi ya dị ka Onyeisi Nchụàjà ukwu nke Chineke. Ị̀ ga-anọgide n’ime obodo mgbaba ahụ ma dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ọtụtụ ijeri ndị bi n’ụwa nwere ikpe ọmụma ọbara?
◻ Òkè dịgasị aṅaa ka Jisọs Kraịst na-emezu n’ihe banyere ihe a kpọrọ mmadụ?
◻ Gịnị bụ obodo mgbaba ihe atụ ahụ, oleekwa ụzọ mmadụ si abanye n’ime ya?
◻ Olee mgbe a ga-atọhapụ ndị mmadụ pụọ n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ?
◻ Ihe mmụta dịgasị aṅaa dị mkpa ka anyị pụrụ ịmụta site ná ndokwa nke obodo mgbaba?
[Foto dị na peeji nke 16]
Ị̀ maara òkè ndị dị mkpa Jisọs Kraịst na-emezu?