Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ịghọta Ọrụ Pụrụ Iche Jizọs Na-arụ ná Nzube Chineke
    Ụlọ Nche—2008 | Disemba 15
    • “Nnukwu Onye Nchụàjà”

      15. Olee otú ọrụ Jizọs dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà si dị iche na nke ndị ọzọ jerela ozi dị ka nnukwu ndị nchụàjà?

      15 E nweela ọtụtụ ụmụ nwoke ndị jere ozi dị ka ndị nchụàjà n’oge ochie, ma ọrụ Jizọs dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà pụrụ nnọọ iche. Olee otú o si pụọ iche? Pọl kọwara nke a, sị: “Ọ dịghị ya mkpa, dị ka ọ dị nnukwu ndị nchụàjà ahụ, ịdị na-achụ àjà kwa ụbọchị, nke mbụ maka mmehie nke ya, mgbe ahụzi maka mmehie nke ndị ya: (n’ihi na nke a ka o mere naanị otu ugboro mgbe ọ chụrụ onwe ya n’àjà;) n’ihi na Iwu ahụ na-ahọpụta ndị ikom nwere adịghị ike ka ha bụrụ nnukwu ndị nchụàjà, ma ihe ahụ e ji ịṅụ iyi kwuo mgbe Iwu ahụ gasịrị họpụtara otu Ọkpara, bụ́ onye a na-eme ka o zuo okè ruo mgbe ebighị ebi.”—Hib. 7:27, 28.b

      16. Gịnị mere àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ ji pụọ nnọọ iche?

      16 Jizọs bụ nwoke zuru okè, dị nnọọ ka Adam zuru tupu ya emehie. (1 Kọr. 15:45) N’ihi ya, Jizọs bụ naanị mmadụ ruru eru ịchụ àjà zuru okè, nke bụ́ àjà na-adịghị mkpa ka a chụọ ya ọzọ. Iwu Mozis kwuru ka a na-achụ àjà kwa ụbọchị. Ma àjà niile ahụ a chụrụ na ozi niile ndị nchụàjà jere bụ naanị ihe ndị na-egosi ihe Jizọs ga-arụzu. (Hib. 8:5; 10:1) N’ihi ya, ọrụ Jizọs dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà pụrụ nnọọ iche n’ụdị na ọ na-arụzu ihe karịrị ihe nnukwu ndị nchụàjà ndị ọzọ rụrụ nakwa n’ihi na ọ ga-anọgide na-arụ ọrụ a.

  • Ịghọta Ọrụ Pụrụ Iche Jizọs Na-arụ ná Nzube Chineke
    Ụlọ Nche—2008 | Disemba 15
    • b Dị ka otu ọkà mmụta Baịbụl si kwuo, okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ, “naanị otu ugboro” kọwara otu ihe dị mkpa Baịbụl na-akụzi nke “na-egosi nnọọ otú ọnwụ Kraịst si bụrụ ihe gbapụrụ iche, ihe pụrụ nnọọ iche, ma ọ bụ ihe na-enweghị nke yiri ya.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya