-
“Ihe A Na-achọsi Ike” Na-ejupụta n’Ụlọ JehovaỤlọ Nche—2000 | Jenụwarị 15
-
-
9. N’ihi gịnị ka Jisọs na-apụghị iji banye n’eluigwe dị ka mmadụ, oleekwa otú e si dozie ọnọdụ a?
9 N’agbanyeghị na ọ bụ Ọkpara Chineke e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, nwoke ahụ bụ́ Jisọs apụghị inweta ndụ n’eluigwe. N’ihi gịnị? N’ihi na anụ ahụ na ọbara apụghị iketa Alaeze eluigwe nke Chineke. (1 Ndị Kọrint 15:44, 50) Ebe ọ bụ na anụ ahụ Jisọs dị ka mmadụ bụ ihe mgbochi, ákwà mgbochi ahụ nke kewara Ebe Nsọ ahụ pụọ n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile n’ụlọ nsọ ochie nke Chineke sere onyinyo ya nke ọma. (Ndị Hibru 10:20) Ma ụbọchị atọ mgbe ọ nwụsịrị, Chineke mere ka Jisọs si n’ọnwụ bilie dị ka mmụọ. (1 Pita 3:18) Mgbe ahụ, ọ pụrụ ịbanye n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke—eluigwe n’onwe ya. Nke a bụkwa kpọmkwem ihe merenụ. Pọl na-ede, sị: “Kraịst abaghị n’ebe nsọ [ihe àmà na-egosi na ọ na-ezo aka n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile] e ji aka mee, bụ́ ihe atụ yiri ebe nke bụ́ ebe nsọ n’ezie; kama Ọ bara n’eluigwe onwe ya, igosi Onwe ya n’ihu Chineke n’ihi anyị ugbu a.”—Ndị Hibru 9:24.
10. Gịnị ka Jisọs mere mgbe ọ laghachiri n’eluigwe?
10 N’eluigwe, Jisọs ‘fesasịrị ọbara’ nke àjà ya site n’igosi Jehova uru nke ọbara ndụ ya bara n’ịgbapụta mmadụ. Ma, Jisọs mere ihe ọzọ. N’oge na-adịghị anya tupu ọnwụ ya, ọ gwara ụmụazụ ya, sị: “Ana m aga idoziri unu ebe. Ọ bụrụkwa na Mụ agaa idoziri unu ebe, agaje m ịbịa ọzọ, M ga-anarakwa unu nye Onwe m; ka unu onwe unu wee nọọkwa ebe Mụ onwe m nọ.” (Jọn 14:2, 3) Ya mere, site n’ịbanye n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile, ma ọ bụ n’eluigwe, Jisọs megheere ndị ọzọ ụzọ. (Ndị Hibru 6:19, 20) Ndị a, bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha ga-adị 144,000, ga-eje ozi dị ka ndị nchụàjà nọ n’okpuru ná ndokwa ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke. (Mkpughe 7:4; 14:1; 20:6) Dị nnọọ ka onyeisi nchụàjà nke Israel na-ebu ụzọ were ọbara oké ehi ahụ banye n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile iji kpuchie mmehie nke ndị nchụàjà, ndị nchụàjà 144,000 a nọ n’okpuru bu ụzọ nweta uru nke ọbara Jisọs wụsịrị.b
-
-
“Ihe A Na-achọsi Ike” Na-ejupụta n’Ụlọ JehovaỤlọ Nche—2000 | Jenụwarị 15
-
-
b N’adịghị ka onyeisi nchụàjà nke Israel, Jisọs enweghị mmehie ọ bụla nke chọrọ mkpuchi. Otú ọ dị, ndị nchụàjà ibe ya nwere mmehie n’ihi na e si n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie gbata ha.—Mkpughe 5:9, 10.
-