Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w20 Julaị p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Unu Ga-abụ “Alaeze nke Ndị Nchụàjà”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Jehova Buru Amụma Banyere Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Ahụ
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
  • Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Chineke Na-eru Nso Mmezu Ya
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Jiri Ihe Ọma Meere Gị Ife Jehova n’Ụlọ Nsọ Ihe Atụ Ya Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
w20 Julaị p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee mgbe Jizọs ghọrọ Nnukwu Onye Nchụàjà, oleekwa mgbe e mere ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị irè?

E nwere ihe ndị mere ka anyị ghọta na Jizọs ghọrọ Nnukwu Onye Nchụàjà mgbe e mere ya baptizim n’afọ 29. Olee ihe ndị ha bụ? Mgbe e mere Jizọs baptizim, o gosiri na ọ dị njikere iji onwe ya chụọ àjà n’ebe ịchụàjà. Ebe ịchụàjà ahụ pụtara “uche” Chineke. (Gal. 1:4; Hib. 10:5-10) Ebe ọ bụ na ebe ịchụàjà dị mkpa n’ụlọ nsọ ọ bụla, o nwere ike ịbụ na ụlọ nsọ ihe atụ ahụ malitekwara ịdị mgbe e mere Jizọs baptizim. Ụlọ nsọ ihe atụ Jehova nọchiri anya ihe niile na-enyere anyị aka ife ya otú ọ chọrọ n’ihi àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ.—Mat. 3:16, 17; Hib. 5:4-6.

E kwesịrị inwe nnukwu onye nchụàjà n’ụlọ nsọ ihe atụ ahụ. N’ihi ya, Jehova ji “mmụọ nsọ na ike” họpụta Jizọs ka ọ bụrụ Nnukwu Onye Nchụàjà n’ụlọ nsọ ihe atụ ahụ. (Ọrụ 10:37, 38; Mak 1:9-11) Ma, olee otú anyị ga-esi jide n’aka na a họpụtara Jizọs ka ọ bụrụ Nnukwu Onye Nchụàjà tupu ọnwụ ya na mbilite n’ọnwụ ya? Ihe ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a bụ ileba anya n’akụkọ Erọn na nnukwu ndị nchụàjà ndị ọzọ nọchiri ya.

Iwu Jehova nyere Mozis kwuru na ọ bụ naanị nnukwu onye nchụàjà ga-aba n’Ebe Kasị Nsọ n’ụlọikwuu. Mgbe a rụrụ ụlọ nsọ, ọ bụkwa naanị ya na-abanye n’Ebe Kasị Nsọ n’ụlọ nsọ. E ji ákwà mgbochi kewaa Ebe Kasị Nsọ na Ebe Nsọ. Ọ bụ naanị n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie ka nnukwu onye nchụàjà na-agafe ákwà mgbochi ahụ. (Hib. 9:1-3, 6, 7) E tere Erọn na ndị nọchiri ya mmanụ ịbụ nnukwu ndị nchụàjà tupu ha agafere ákwà mgbochi ahụ banye n’Ebe Kasị Nsọ. N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na e tere Jizọs mmanụ ịbụ Nnukwu Onye Nchụàjà tupu ya anwụọ ma ‘gabiga ákwà mgbochi ahụ, ya bụ, anụ ahụ́ ya,’ banye n’eluigwe. (Hib. 10:20) Ọ bụ ihe a mere Pọl onyeozi ji sị na Jizọs bịara “dị ka nnukwu onye nchụàjà,” nakwa na o si “n’ụlọikwuu ka ukwuu, nke zukwara okè karị, nke a na-ejighị aka rụọ,” banye “n’ime eluigwe.”—Hib. 9:11, 24.

Olee mgbe e mere ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị irè? Mgbe Jizọs lara n’eluigwe gosi Nna ya ndụ ya zuru okè ọ chụrụ n’àjà maka anyị, o mere ihe mbụ n’ime ihe atọ ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị irè. Olee ihe ndị o mere?

Nke mbụ, Jizọs gosiri Jehova onwe ya. Nke abụọ, o gosiri Jehova uru àjà ọ chụrụ bara. Nke atọ, Jehova nabatara àjà ahụ Jizọs chụrụ. Ọgbụgba ndụ ahụ adịghị irè mgbe a na-emebeghị ihe atọ ndị a.

Baịbụl agwaghị anyị kpọmkwem mgbe Jehova nabatara àjà ahụ Jizọs chụrụ. N’ihi ya, anyị agaghị ekwuli hoo haa mgbe ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ malitere dịwa irè. Ma, anyị ma na Jizọs lara eluigwe abalị iri tupu ụbọchị Pentikọst. (Ọrụ 1:3) Ọ ga-abụ n’ime obere oge ahụ ka o gosiri Jehova uru àjà ọ chụrụ bara, Jehova anabatakwa ya. (Hib. 9:12) Ihe mere na Pentikọst nke afọ 33 mere ka anyị mata na ihe a bụ eziokwu. (Ọrụ 2:1-4, 32, 33) O doro anya na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ adịla irè n’oge ahụ.

Ná nchịkọta, ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dịwara irè mgbe Jehova nabatachara àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ. Ọ bụkwa Jizọs, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà ya, bụ onye ogbugbo ya.—Hib. 7:25; 8:1-3, 6; 9:13-15.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya