Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ka Anyị Dị n’Etiti Ndị Kwere Ekwe
    Ụlọ Nche—1999 | Disemba 15
    • Iji Okwu Chineke Eme Ihe n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

      6. Olee ebe Pọl nọ na-ehota mgbe o dere okwu ndị ahụ e dekọrọ ná Ndị Hibru 10:38?

      6 Pọl wulitekwara okwukwe n’ime ndị kwere ekwe ibe ya site n’ụzọ nkà o si jiri Akwụkwọ Nsọ mee ihe. Dị ka ihe atụ, o dere, sị: “Ma onye ezi omume nke m ga-esite n’okwukwe dị ndụ: ọ bụrụkwa na ọ ga-ewezụga onwe ya, ihe ya adịghị mkpụrụ obi m ezi mma.” (Ndị Hibru 10:38) N’ebe a Pọl na-ehota okwu Habakuk onye amụma.a O yikarịrị ka ndị na-agụ akwụkwọ Pọl, bụ́ ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst bụ́ ndị maara akwụkwọ amụma ndị ahụ nke ọma, hà maara okwu ndị a nke ọma. N’ịtụle ihe mgbaru ọsọ ya—iwusikwu okwukwe ndị Kraịst nọ n’ime nakwa na nso Jerusalem n’ihe dị ka afọ 61 O.A., ike—nhọrọ ọ họọrọ ihe atụ Habakuk bụ nke dabara adaba. N’ihi gịnị?

      7. Olee mgbe Habakuk dekọrọ amụma ya, oleekwa ọnọdụ ndị dị na Juda n’oge ahụ?

      7 Ihe àmà na-egosi na Habakuk dere akwụkwọ ya n’ihe ji ntakịrị gafetụ iri afọ abụọ tupu mbibi Jerusalem na 607 T.O.A. N’ọhụụ, onye amụma ahụ hụrụ ndị Kaldea (ma ọ bụ, ndị Babilọn), bụ́ “mba ahụ dị ilu nke na-emekwa ngwa ngwa,” ka ha na-awakpo Juda, na-ebibikwa Jerusalem, na-elomi ndị mmadụ na mba dị iche iche ka nke ahụ na-eme. (Habakuk 1:5-11) Ma e buwo amụma ọdachi dị otú ahụ kemgbe ụbọchị Aịsaịa, ihe karịrị otu narị afọ tupu mgbe ahụ. N’oge Habakuk, Jehoiakim nọchiri ezigbo Eze Josaịa, ajọ omume jupụtakwara ọzọ na Juda. Jehoiakim kpagburu, ọbụna gbuokwa ndị na-ekwu okwu n’aha Jehova. (2 Ihe E Mere 36:5; Jeremaịa 22:17; 26:20-24) Ọ bụghị ihe ijuanya na onye amụma bụ́ Habakuk bụ́ onye ihe a na-egbu mgbu n’obi tiri mkpu, sị: “Jehova, ruo ole mgbe?”—Habakuk 1:2.

      8. N’ihi gịnị ka ihe nlereanya Habakuk ji bụrụ nke bara uru nye ndị Kraịst na narị afọ mbụ nakwa taa?

      8 Habakuk amaghị ókè mbibi Jerusalem dịruru nso. N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị Kraịst oge mbụ amaghị mgbe usoro ihe nke ndị Juu ga-agwụ. Anyị onwe anyị kwa taa amaghị “ụbọchị na oge awa” ahụ mgbe ikpe Jehova ga-abịakwasị ajọ usoro ihe a. (Matiu 24:36) Mgbe ahụ, ka anyị rịba azịza gbara mkpị nke Jehova nyere Habakuk ama. Nke mbụ, o mesiri onye amụma ahụ obi ike na ọgwụgwụ ga-abịa nnọọ n’oge. “Ọ gaghị anọ ọdụ,” ka Chineke kwuru, ọ bụ ezie na site n’ụzọ mmadụ si ele ihe anya, ọ pụrụ iyi ka ọ na-egbu oge. (Habakuk 2:3) Nke abụọ, Jehova chetaara Habakuk, sị: “Onye ezi omume ga-eji okwukwe ya dị ndụ.” (Habakuk 2:4) Lee eziokwu mara mma ma dị mfe nghọta okwu ndị a bụ! Ihe kasị mkpa abụghị mgbe ọgwụgwụ ga-abịa, kama ọ bụ ma ànyị ga-anọgide na-ebi ndụ nke okwukwe.

      9. Olee otú ndị ohu Jehova na-erube isi si nọgide na-adị ndụ site n’ikwesị ntụkwasị obi ha (a) na 607 T.O.A.? (b) na 66 O.A.? (ch) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị mee ka okwukwe anyị sikwuo ike?

      9 Mgbe e bibiri Jerusalem na 607 T.O.A., Jeremaịa, odeakwụkwọ ya bụ́ Beruk, Ebed-melek, na ndị Rikab na-eguzosi ike n’ihe hụrụ eziokwu nke nkwa Jehova kwere Habakuk. Ha ‘dịrị ndụ’ site n’ịlanarị mbibi ahụ dị egwu nke Jerusalem. N’ihi gịnị? Jehova nyere ha ụgwọ ọrụ maka ikwesị ntụkwasị obi ha. (Jeremaịa 35:1-19; 39:15-18; 43:4-7; 45:1-5) N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ aghaghị imeghachiwo omume n’ụzọ dị mma nye ndụmọdụ Pọl, n’ihi na mgbe usuu ndị agha Rom wakporo Jerusalem na 66 O.A. ma mesịa laa n’ụzọ a na-apụghị ịkọwa ihe kpatara ya, ndị Kraịst ahụ ji ikwesị ntụkwasị obi ṅaa ntị na ndụmọdụ Jisọs bụ́ ịgbapụ. (Luk 21:20, 21) Ha nọgidere na-adị ndụ n’ihi ikwesị ntụkwasị obi ha. N’otu aka ahụ kwa, anyị ga-anọgide na-adị ndụ ma ọ bụrụ na a hụta anyị dị ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi mgbe ọgwụgwụ ruru. Lee ihe dị mkpa ọ bụ mere anyị ga-eji mee ka okwukwe anyị sikwuo ike ugbu a!

  • Ka Anyị Dị n’Etiti Ndị Kwere Ekwe
    Ụlọ Nche—1999 | Disemba 15
    • a Pọl hotara nsụgharị Septuagint nke Habakuk 2:4, bụ́ nke gụnyere nkebi ahịrịokwu bụ́ “ọ bụrụkwa na ọ ga-ewezụga onwe ya, ihe ya adịghị mkpụrụ obi m ezi mma.” Okwu a apụtaghị n’ihe odide Hibru ọ bụla dị adị. Ụfọdụ enyewo echiche na Septuagint ahụ dabeere n’ihe odide Hibru ndị bu ụzọ bụ́ ndị na-adịghịzi adị. Otú o sina dị, Pọl tinyere ya n’ebe a ná mkpali nke mmụọ nsọ Chineke. Ya mere o nwere nkwado Chineke.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya