Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Mee Ka Okwukwe I Nwere n’Ihe Ị Na-ele Anya Ya Sie Ike
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2016 | Ọktoba
    • 2 Ọtụtụ ndị nwekwara ihe ha na-ele anya ya n’ụwa Setan, ma o nwere ike ịna-eme ha obi abụọ ma hà ga-emecha nweta ya. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ nde ndị na-agba chaa chaa nwere ike ibu n’obi na ha ga-erite ego, ma obi anaghị esi ha ike na ọ ga-eru ha aka. Ma, ezigbo okwukwe bụ ‘atụmanya Ndị Kraịst ji n’aka’ na ọ ga-emezurịrị. (Hib. 11:1) I nwere ike ịna-eche, sị, ‘Olee otú obi ga-esi sikwuo m ike na ihe m na-atụ anya ya ga-emerịrị? Olee uru inwe okwukwe siri ike n’ihe ndị m na-ele anya ha ga-abara m?’

      3. Olee ihe mere ezi Ndị Kraịst ji nwee okwukwe?

      3 Ụmụ mmadụ na-ezughị okè anaghị ebu okwukwe apụta ụwa; ha anaghịkwanụ anọkata nwee ya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe okwukwe, anyị kwesịrị ikwe ka mmụọ nsọ Chineke na-eduzi obi anyị. (Gal. 5:22) Baịbụl ekwughị na Jehova nwere okwukwe ma ọ bụ na o kwesịrị inwe ya. Ebe Jehova bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, marakwa ihe karịa onye ọ bụla, o nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara imezu ihe o kwere ná nkwa. N’ihi otú obi si sie Nna anyị nke eluigwe ike na ihe ọma niile o kwere ná nkwa ga-emezu, o weere ha ka ihe mezurulanụ. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Ha emezuwo!” (Gụọ Mkpughe 21:3-6.) Ihe mere Ndị Kraịst ji nwee okwukwe bụ na Jehova bụ ‘Chineke kwesịrị ntụkwasị obi.’ Ọ na-emezu nkwa ọ bụla o kwere.—Diut. 7:9.

      IHE ANYỊ GA-AMỤTA N’AKA NDỊ NWERE OKWUKWE N’OGE OCHIE

      4. Olee olileanya ndị nwoke na ndị nwaanyị fere Jehova tupu Jizọs abịa n’ụwa nwere?

      4 Ná Ndị Hibru isi 11, e dere aha mmadụ iri na isii nwere okwukwe, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị. Pọl kwuru gbasara ha na ọtụtụ ndị ọzọ “a gbara àmà banyere ha site n’okwukwe ha.” (Hib. 11:39) Obi siri ha niile ezigbo ike na Chineke ga-ezite “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa, onye ga-ewepụ nsogbu nnupụisi Setan kpatara, mezuokwa ihe Jehova bu n’obi kee ụwa. (Jen. 3:15) Ndị ahụ niile kwesịrị ntụkwasị obi nwụrụ tupu Jizọs Kraịst, bụ́ “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa, emee ka ndị mmadụ nwewe olileanya ịga eluigwe. (Gal. 3:16) Ma, ebe ọ bụ na nkwa Jehova kwere ga-emezurịrị, a ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha nwee ike ịbụ ndị zuru okè mgbe ụwa ga-abụ paradaịs.—Ọma 37:11; Aịza. 26:19; Hos. 13:14.

  • Mee Ka Okwukwe I Nwere n’Ihe Ị Na-ele Anya Ya Sie Ike
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2016 | Ọktoba
    • 7. Gịnị na gịnị ka Jehova nyere anyị iji mee ka okwukwe anyị na-esi ike, gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji ihe ndị ahụ na-eme?

      7 Jehova nyere anyị Okwu ya bụ́ Baịbụl iji mee ka okwukwe anyị na-esi ike. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ‘ịna-enwe obi ụtọ,’ ‘ihe ana-agakwara anyị nke ọma,’ anyị ga na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị. (Ọma 1:1-3; gụọ Ọrụ Ndịozi 17:11.) Anyị kwesịkwara ịna-echebara nkwa ndị Chineke kwere echiche ma na-erubere iwu ya isi otú ahụ ndị fere ya tupu oge Ndị Kraịst mere. Jehova si n’aka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” ‘na-enye anyị nri n’oge kwesịrị ekwesị.’ (Mat. 24:45) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ejiri ihe Jehova si n’aka ha na-akụziri anyị kpọrọ ihe, anyị ga-eme ka ndị nwere okwukwe n’oge ochie, ndị obi siri ezigbo ike na Alaeze ahụ ha na-ele anya ya ga-eru ha aka.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya