Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • “O Mere Ihe Dị Chineke Ezi Mma”
    Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2017 | Nke 1
    • ‘E WEGARA YA EBE ỌZỌ KA Ọ GHARA ỊHỤ ỌNWỤ’

      Olee otú Inọk si nwụọ? Baịbụl kwuru ihe ole na ole banyere otú o si bie ndụ, ma otú o si nwụọ edoghị ndị mmadụ anya. Naanị ihe Jenesis 5:24 kwuru bụ: “Inọk wee soro ezi Chineke na-eje ije. Ma ọ nọkwaghị, n’ihi na Chineke kpọpụrụ ya.” Olee otú Chineke si kpọpụ Inọk? Pọl onyeozi mechara kwuo, sị: “Ọ bụ okwukwe Inọk mere e ji wega ya ebe ọzọ ka ọ ghara ịhụ ọnwụ, ọ dịghịkwa ebe a hụrụ ya n’ihi na Chineke wegara ya ebe ọzọ; n’ihi na tupu e wega ya ebe ọzọ, a gbara àmà banyere ya na o mere ihe dị Chineke ezi mma.” (Ndị Hibru 11:5) Gịnị ka Pọl bu n’obi mgbe o kwuru na ‘e wegara ya ebe ọzọ ka ọ ghara ịhụ ọnwụ’? Baịbụl ụfọdụ kwuru na Chineke kpọọrọ ya gaa eluigwe. Ma, ọ bụghị eziokwu n’ihi na Baịbụl kwuru na Jizọs Kraịst bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ gaa n’eluigwe.—Jọn 3:13.

      Oleezi otú e si ‘kpọpụ’ Inọk ka “ọ ghara ịhụ ọnwụ”? Jehova mere ka o jiri nwayọọ nwụọ ka ọ ghara ịnụ ụfụ ọnwụ. Ma tupu Inọk anwụọ, “a gbara àmà banyere ya na o mere ihe dị Chineke ezi mma.” Olee otú e si gbaara ya àmà a? O nwere ike ịbụ na obere oge tupu ya anwụọ, Chineke gosiri ya ọhụụ otú ụwa ga-adị ma ọ ghọọ paradaịs. Mgbe Jehova gosichara Inọk otú paradaịs ga-adị iji mee ka ọ mata na ihe ya dị ya mma, Inọk nwụrụ. Mgbe Pọl onyeozi na-ekwu gbasara Inọk na ndị ọzọ fere Chineke n’oge ochie, ọ sịrị: “Ndị a niile nwụrụ n’okwukwe.” (Ndị Hibru 11:13) Ọ ga-abụ na mgbe ọ nwụchara, ndị iro ya chọrọ ya elu chọọ ya ala, ma, ‘ọ dịghị ebe ha hụrụ ya.’ O nwere ike ịbụ n’ihi na Jehova ji aka ya lie ya ka ha ghara iji ozu ya mere ihe ọchị ma ọ bụkwanụ were ya mere chi.b

      Ugbu a ka anyị chebagodịrị otú o nwere ike ịbụ na Inọk si nwụọ echiche. Were ya na ị na-ahụ ka ọ na-agba ọsọ, ike agwụchaa ya. Ndị chọrọ igbu ya nọ na-achụ ya, ezigbo iwe ji ha n’ihi na ọ gwara ha na Chineke ga-ebibi ha. Inọk agbaba n’otu ebe, zoo, nọrọ ebe ahụ na-ezurutụ ike. Ma, ọ ma na ha ga-emecha kpara ya aka ma gbuo ya. Ka ọ nọ na-ezu ike, o kpere ekpere. Mgbe o kpechara ekpere, obi bịara ruo ya ala. Ọ hụrụ ọhụụ, ya adị ya ka ọ̀ nọ ebe ahụ e gosiri ya n’ọhụụ.

      Ebe Inọk zoro n’ọgba ka ndị chọrọ igbu ya gafere

      Ọ ga-abụ na a na-achọ igbu Inọk mgbe Jehova kpọpụrụ ya

      Werekwa ya na ọ nọ na-ahụ ụwa dị iche na nke ahụ o bi na ya. Ụwa a mara ya ezigbo mma ka ogige Iden, ma e nweghị ndị cherọb na-eche ya nche ka ndị mmadụ ghara ịbanye na ya. Ọtụtụ ndị juru na ya. Ahụ́ siri ha niile ike, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị. Ha niile nwere ike okorobịa. Udo dị ebe niile. E nweghị onye kpọrọ ibe ya asị ma ọ bụ na-emegide ibe ya maka na ọ na-efe Chineke. Ihe a Inọk na-ahụ mere ka obi sie ya ike na Jehova kwụ ya n’azụ ma hụ ya n’anya. O doro ya anya na Jehova ga-emecha mee ka o biri ebe ahụ. Obi bịara jiri nwayọọ nwayọọ ruo ya ala, ya emechie anya ya hiwe ezigbo ụra, sizie na ya nwụọ.

      Ọ bụ otú ahụ ka o nwere ike ịbụ na o si nwụọ ruo taa. Ma, Jehova Chineke ka na-echeta ya. Jizọs mechara kwuo na otu ụbọchị, ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya, pụta. Ha ga-emeghe anya ha hụzie onwe ha n’ụwa ọhụrụ mara mma, udo juru na ya.—Jọn 5:28, 29.

  • “O Mere Ihe Dị Chineke Ezi Mma”
    Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2017 | Nke 1
    • b Ọ bụkwa otu ihe ahụ mere Chineke ji ghara ikwe ka ndị mmadụ jiri ozu Mozis na Jizọs mere ihe ndị oge Inọk gaara achọ iji ozu ya eme.—Diuterọnọmi 34:5, 6; Luk 24:3-6; Jud 9.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya