Ònye Mere Ihe A Nile?
KA Ọ na-egbupere onwe ya ụzọ n’ime oké ọhịa dị na Cambodia, Henri Mouhot, onye France na-eme nchọpụta na narị afọ nke 19, rutere n’otu olulu mmiri sara mbara nke gbara otu ụlọ nsọ gburugburu. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu kilomita site n’ebe o guzo, ụlọ elu ise nke ụlọ nsọ ahụ dị ihe karịrị mita 60 n’ịdị elu. Ọ bụ Angkor Wat, ihe ncheta okpukpe kasị ibu n’ụwa. O guzogideworị ọtụtụ ọnọdụ ihu igwe ndị dị oké njọ ruo narị afọ asaa mgbe Mouhot chọpụtara ya.
Mouhot pụrụ ịmata ozugbo ọ hụrụ ya na ihe owuwu ndị ahụ ahịhịa ruchiri bụ ọrụ aka mmadụ. “N’ịbụ nke otu onye oge ochie nwere nkà Michelangelo wuru, ọ dị ebube karịa ihe ọ bụla Gris ma ọ bụ Rom hapụụrụ anyị,” ka o dere. N’agbanyeghị mgbahapụ a gbahapụrụ ha ruo ọtụtụ narị afọ, o nweghị obi abụọ ọ bụla na ihe owuwu ndị ahụ magburu onwe ha nwere onye wuru ha.
N’ụzọ na-akpali mmasị, otu akwụkwọ amamihe e dere ọtụtụ narị afọ gara aga ji arụmụka yiri nke ahụ kọwaa ihe mere ụwa gbara anyị gburugburu na-aghaghị ịbụ ihe Onye Omenkà mepụtara. A ghaghị ikeworị ya eke. Pọl onyeozi dere, sị: “N’ihi na ezinụlọ ọ bula nwere onye rụrụ ya; ma Onye rụrụ ihe nile bụ Chineke.” (Ndị Hibru 3:4) Ụfọdụ nwere ike ha agaghị ekwenye ná myirita a, na-asị: ‘Otú ihe e kere eke si arụ ọrụ dị iche n’ihe aka mere.’ Otú ọ dị, ọ bụghị ndị ọkà mmụta sayensị nile na-ekwenyere mgbagha ahụ. Mgbe o kwetasịrị na “usoro mmiri ọgwụ dị iche iche nke ihe ndị dị ndụ abụghị ihe ndị na-adịghị ndụ,” Michael Behe, osote prọfesọ nke mmiri ọgwụ nke ihe ndị dị ndụ na Mahadum Lehigh na-ajụ, sị: “À pụrụ iji ọgụgụ isi mepụta usoro mmiri ọgwụ ihe ndị dị ndụ?” Ọ gara n’ihu igosi na ndị ọkà mmụta sayensị nọ ugbu a na-emepụta mgbanwe ndị bụ́ isi n’ihe ndị dị ndụ site n’ụzọ ndị dị ka mgbanwegharị nke mkpụrụ ndụ ihe nketa. N’ụzọ doro anya, a pụrụ imepụta ma gbanwee ma ihe ndị na-adịghị ndụ ma ihe ndị dị ndụ! N’inyobakwu anya n’ógbè nke ihe ndị anya nkịtị na-adịghị ahụ bụ́ mkpụrụ ndụ, Behe na-ekwu banyere usoro ndị dị oké mgbagwoju anya nke ihe ndị mejupụtara ha na-adabere n’ibe ha iji rụọ ọrụ. Gịnị bụ nkwubi okwu ya? “Ihe si ná mgbalị a e mekọtara ọnụ inyocha mkpụrụ ndụ—inyocha ndụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ihe ndị dịkarịsịrị nta, pụta—bụ iji oké olu eti ‘ime nkà!’ n’ụzọ doro anya, na-adasi ụda ike.”
Ndị ọkà mmụta usoro mbara igwe na ala na ndị ọkà mmụta physics n’otu aka ahụ enyobawo anya nke ọma n’ụwa na mbara igwe, ha achọpụtawokwa ụfọdụ eziokwu ndị na-eju anya. Dị ka ihe atụ, ugbu a ha maara na ọ bụrụ na e nwere ọbụna mgbanwe dị oké nta n’ọnụ ọgụgụ nke ihe ndị na-adịgide adịgide nke eluigwe na ala, eluigwe na ala agaghị enwe ihe dị ndụ n’ime ha.a Ọkà mmụta usoro mbara igwe na ala bụ́ Brandon Carter kpọrọ ihe omume ndị a ndabakọ ndị na-eju anya. Ma ọ bụrụ na ị hụta ọtụtụ ihe ndabakọ dị omimi, ndị jikọrọ ọnụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ ị́ gaghị echewa na ọ ghaghị ịbụ na o nwere onye mere ha?
N’ezie, e nwere Omenkà mere usoro ihe a nile dị mgbagwoju anya na “ndabakọ” ndị a e doziri nke ọma. Ònye? “Ịmata omenkà ahụ site n’usoro sayensị pụrụ ịta nnọọ akpụ,” ka Prọfesọ Behe na-ekweta, ọ hapụkwaara “nkà ihe ọmụma na nkà mmụta okpukpe” ajụjụ ahụ ịgbalị ịza ya. Gị onwe gị pụrụ iche na ajụjụ ahụ adịghị mkpa nye gị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị natara ngwugwu a fụchiri nke ọma nke jupụtara n’ihe ndị dị gị mkpa kpọmkwem, ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ịmata onye ziteere gị ya?
Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, anyị anatawo ụdị ngwugwu ahụ—ngwugwu jupụtara n’onyinye ndị dị ebube na-eme ka o kwe omume anyị ịdị ndụ ma na-anụ ụtọ ndụ. Ngwugwu ahụ bụ ụwa, ya na usoro ya nile dị ịrịba ama maka ịkwagide ndụ. Ọ̀ bụ na o kwesịghị ekwesị ka anyị chọpụta onye nyere anyị onyinye ndị a?
N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Onye Zitere ngwugwu ahụ tinyere akwụkwọ ozi na ya. “Akwụkwọ ozi” ahụ bụ akwụkwọ amamihe ochie ahụ e hotaburu—Bible. N’okwu mmalite ya, Bible na-aza ajụjụ banyere onye nyere anyị ngwugwu ahụ n’ụzọ dị mfe ma doo anya: “Na mbụ, Chineke kere eluigwe na ụwa.”—Jenesis 1:1.
‘N’akwụkwọ ozi’ ya Onye Okike kpọrọ onwe ya aha: “Otú a ka Chineke, bụ́ Jehova, sịrị, bụ́ Onye keworo eluigwe . . . , Onye meworo ụwa na ihe nile nke si n’ime ya apụta ka ọ saa mbara; Onye na-enye ndị bi n’elu ya ume ha na-eku.” (Aịsaịa 42:5, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Ee, Jehova bụ aha Chineke onye mere eluigwe na ala ma kee ndị ikom na ndị inyom n’ụwa. Ma ònye bụ Jehova? Ụdị Chineke dị aṅaa ka ọ bụ? N’ihi gịnịkwa ka o ji kwesị ekwesị ka ndị nile nke ụwa gee ya ntị?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a “Ihe ndị na-adịgide adịgide” bụ ọnụ ọgụgụ ndị na-eyighị ka ha ga-agbanwe n’eluigwe na ala. Ihe atụ abụọ bụ ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ nke ìhè na njikọ dị n’etiti ike ndọda na otú ihe hà n’ibu.
[Foto dị na peeji nke 3]
Ọ bụ ndị mmadụ wuru Angkor Wat
[Foto dị na peeji nke 4]
Mgbe ị natara onyinye, ị́ dịghị achọ ịmata onye zitere ya?