Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Obiọma Bụ Àgwà Dị Mkpa n’Anya Chineke
    Ụlọ Nche—2012 | Septemba 1
    • E nwere ezigbo ihe mere Chineke ji gwa anyị ka anyị ‘na-enwe obiọma n’ebe ibe anyị nọ.’ (Ndị Efesọs 4:32) Nke mbụ bụ na ọ na-amasị ụmụ mmadụ imere ndị ọzọ ihe ọma. Nke abụọ abụrụ na Chineke chọrọ ka anyị na-eme otú ahụ. Baịbụl gwakwara anyị, sị: “Unu echefula ile ọbịa,” ma ọ bụ ‘unu echefula imere ndị unu na-amaghị ihe ọma.’—Ndị Hibru 13:2.

  • Obiọma Bụ Àgwà Dị Mkpa n’Anya Chineke
    Ụlọ Nche—2012 | Septemba 1
    • Mgbe Pọl onyeozi gwachara anyị ka anyị na-emere ndị anyị na-amaghị ihe ọma, o kwukwara, sị: “Ụfọdụ lere ndị mmụọ ozi ọbịa n’amaghị ama.” Olee otú obi ga-adị gị ma i lee ndị mmụọ ozi ọbịa? Ma ihe Pọl na-ekwu bụ na ndị ahụ lere ndị mmụọ ozi ọbịa “n’amaghị ama.” Nke a pụtara na ọ bụrụ na anyị na-emere ndị ọzọ ihe ọma, ma ndị anyị na-amaghị, Chineke nwere ike ịgọzi anyị n’ụzọ ndị anyị na-atụghị anya ha.

      Ọtụtụ Baịbụl nwere ihe e dere n’etiti peeji ha nke ọ bụla. Ihe ndị ahụ na-egosi ebe ndị ọzọ mmadụ nwere ike ịgụ na Baịbụl ka ọ ghọtakwuo ihe ọ na-agụ. Ọtụtụ Baịbụl ndị dị otú ahụ gosiri na mgbe Pọl gwara anyị ka anyị na-ele ọbịa, o bu ihe e dere na Jenesis isi nke 18 na nke 19 n’obi. Ebe ndị ahụ kọrọ banyere Ebreham na Lọt ma kwuo na ndị mmụọ ozi bịara zie ha ozi dị mkpa. Ma n’oge ahụ, ha amaghị na ndị ahụ bụ ndị mmụọ ozi. Mgbe ha bịakwutere Ebreham, ha gwara ya na n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-emezu nkwa o kwere ya nke bụ́ na ọ ga-amụta nwa nwoke. Ndị mmụọ ozi ahụ gwakwara Lọt na ha bịara ịkpọpụta ya na ezinụlọ ya ka a ghara ibibi ha mgbe ha na-ebibi Sọdọm na Gọmọra.—Jenesis 18:1-10; 19:1-3, 15-17.

      Ọ bụrụ na ị gụọ ebe ndị ahụ n’Akwụkwọ Nsọ, ị ga-ahụ na ma Ebreham ma Lọt lere ndị na-agafe agafe ha na-amaghị ọbịa. N’oge ahụ, ndị mmadụ na-ele ndị njem na ndị na-agafe agafe ọbịa, ma ndị ahụ hà bụ ndị ikwu ha na ndị enyi ha ma ọ bụ na ha abụghị. Chineke gwadịrị ndị Izrel n’iwu o nyere ha ka ha na-enyere ndị ọbịa bi n’ala ha aka. (Diuterọnọmi 10:17-19) Ma ihe Ebreham na Lọt meere ndị ahụ ha na-amaghị karịrị ihe e mechara gwa ụmụ Izrel ka ha na-eme. Ebreham na Lọt gbara ezigbo mbọ lee ndị ahụ ọbịa pụrụ iche, Chineke gọzikwara ha maka ya.

      Ihe ọma ahụ Ebreham mere mere ka a gọzie ya, ya amụta nwa nwoke. Nke ahụ mekwara ka a gọzie anyị. Olee otú nke ahụ si mee ka a gọzie anyị? Chineke ji Ebreham na nwa ya Aịzik mezuo uche ya. E si n’ezinụlọ ha mụta Mesaya ahụ, bụ́ Jizọs. Ihe Ebreham na Aịzik mere gosiri ihe Chineke mechara mee iji zọpụta ụmụ mmadụ. Chineke mere ihe ahụ n’ihi na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, bụrụkwa Chineke obiọma.—Jenesis 22:1-18; Matiu 1:1, 2; Jọn 3:16.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya