Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Mmekọahụ?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • Isi nke 41. Ebe nwoke na nwaanyị ji ibe ha aka.

      ISI NKE 41

      Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Mmekọahụ?

      Ahụ́ anaghị eru ọtụtụ ndị ala ikwu gbasara mmekọahụ. Ma, mgbe ọ bụla Baịbụl kwuru gbasara mmekọahụ, ọ na-ekwu ya otú dị mma ná ntị, ya edookwa onye ukwu na onye nta anya. Ihe o kwuru na-abara anyị uru. Ọ bụkwa otú o kwesịrị ịdị n’ihi na Baịbụl si n’aka Jehova, bụ́ Onye kere anyị. Ebe ọ bụ ya kere anyị, ọ ma ihe ga-akacha abara anyị uru. Ọ na-agwa anyị ihe anyị ga na-eme ka obi na-atọ ya ụtọ nakwa ihe anyị ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.

      1. Olee otú Jehova si ele mmekọahụ anya?

      Mmekọahụ bụ onyinye Jehova nyere ụmụ mmadụ. Ọ chọrọ ka di na nwunye jiri ya na-eme onwe ha obi ụtọ. Di na nwunye nwere ike inwe mmekọahụ iji mụta ụmụ, ha nwekwara ike inwe ya iji mee onwe ha obi ụtọ ma si otú ahụ gosi na ha hụrụ ibe ha n’anya. Ọ bụ ya mere Okwu Chineke ji gwa nwoke, sị: “Ka gị na nwunye ị lụrụ n’okorobịa na-aṅụrị ọṅụ.” (Ilu 5:18, 19) Jehova chọrọ ka ndị di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ghara ịgba n’èzí, ya bụ, ha ekwesịghị ịga kwaa iko.​—Gụọ Ndị Hibru 13:4.

      2. Gịnị bụ ịkwa iko?

      Baịbụl gwara anyị na “ndị na-akwa iko . . . agaghị eketa Alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrịnt 6:​9, 10) Ihe ndị dere Baịbụl n’asụsụ Grik kpọrọ ịkwa iko bụ por·neiʹa. Ọ pụtara (1) nwoke na nwaanyị na-abụghị di na nwunye inwe mmekọ,a (2) nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọ, na (3) mmadụ na anụmanụ inwe mmekọ. Ọ bụrụ na anyị ‘aghara ịna-akwa iko,’ ọ ga-abara anyị uru, meekwa Jehova obi ụtọ.​—1 Ndị Tesalonaịka 4:3.

      MỤTAKWUO IHE

      Chọpụta otú i nwere ike isi zere ịkwa iko nakwa uru ị ga-erite ma ọ bụrụ na ị naghị eme omume rụrụ arụ.

      Ebe Josef si ebe nwunye Pọtịfa nọ na-agbapụ, ya adọrọ uwe Josef.

      3. Gbaara ịkwa iko ọsọ

      Mgbe otu nwaanyị gwara otu ohu Chineke aha ya bụ Josef ka ha kwaa iko, Josef ekweghị. Gụọnụ Jenesis 39:1-12. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Gịnị mere Josef ji gbaa ọsọ?​—Leruonụ anya n’amaokwu nke 9.

      • Ì chere na ihe a Josef mere dị mma? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?

      Olee otú ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa n’oge a nwere ike isi mee ka Josef ma gbaara ịkwa iko ọsọ? Kpọnyenụ VIDIO a.

      VIDIO: Gbaara Omume Rụrụ Arụ Ọsọ (5:06)

      Jehova chọrọ ka anyị ghara ịna-akwa iko. Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 6:18. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Olee ihe ụfọdụ nwere ike ime ka mmadụ kwaa iko?

      • Olee otú i nwere ike isi gbaara ịkwa iko ọsọ?

      4. Ị ga-emerili ọnwụnwa

      Ọnwụnwa bịara anyị ka anyị kwaa iko, gịnị nwere ike ime ka imeri ya siere anyị ike? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      VIDIO: Na-agụ Baịbụl Ka I Nwee Ike Imeri Ọnwụnwa (3:02)

      • Mgbe nwanna a anyị lere na vidio chọpụtara na ihe ndị ọ na-eche na ihe ndị ọ na-eme nwere ike ime ka ọ gbawa n’èzí, gịnị ka o mere?

      Ezigbo Ndị Kraịst nwedịrị ike iche ihe na-adịghị mma mgbe ụfọdụ. Gịnị ga-enyere gị aka ka ị ghara ịnọgịde na-eche ihe na-adịghị mma? Gụọnụ Ndị Filipaị 4:8. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Olee ụdị ihe ndị anyị kwesịrị ịna-eche?

      • Olee otú ịgụ Baịbụl na ịrụsi ọrụ ike n’ozi Jehova nwere ike isi nyere anyị aka ka anyị ghara ime ihe ọjọọ?

      5. Iwu dị iche iche Jehova nyere anyị na-abara anyị uru

      Jehova ma ihe ga-akacha abara anyị uru. Ọ gwara anyị ihe anyị ga-eme ka anyị ghara ime ihe ọjọọ nakwa uru irubere ya isi ga-abara anyị. Gụọnụ Ilu 7:7-27 ma ọ bụ unu akpọnye VIDIO a. Unu mechaa, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      VIDIO: Enweghị Ezi Uche (9:31)

      • Olee otú otu nwa okorobịa si mee ihe tinyere ya n’ọnwụnwa?​—Leruonụ anya n’Ilu 7:8, 9.

      • Baịbụl kwuru n’Ilu 7:23, 26 na ịkwa iko nwere ike ịkpatara mmadụ ezigbo nsogbu. Ọ bụrụ na anyị anaghị eme omume rụrụ arụ, olee nsogbu ndị na-agaghị abịara anyị?

      • Olee otú izere omume rụrụ arụ nwere ike isi mee ka anyị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi?

      Ụfọdụ ndị na-eche na ihe Baịbụl kwuru gbasara nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọ na-egbochi mmadụ inwe obi ụtọ. Ma, Jehova, bụ́ Chineke hụrụ anyị n’anya, chọrọ ka anyị niile na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Anyị chọọ iso ná ndị ga na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi, anyị ga na-erubere ya isi. Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 6:9-11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Ọ̀ bụ naanị nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọ ka Chineke na-achọghị ka ọ na-agụ anyị agụụ?

      Anyị kwesịrị ịgbanwe otú ụfọdụ anyị si akpa àgwà ka anyị nwee ike ịna-eme ihe dị Chineke mma. Ò nwere uru ọ ga-abara anyị? Gụọnụ Abụ Ọma 19:​8, 11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Ì chere na iwu dị iche iche Jehova nyere dị mma? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?

      Foto abụọ: 1. Ebe otu nwa agbọghọ obi na-adịghị ụtọ nọ n’akụkụ enyi ya nwoke. O so ndị enyi ha na-aṅụ ma mmanya ma sịga ebe a na-eme oriri na nkwari n’abalị. 2. Otu nwa agbọghọ ahụ nọzi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze soro ụmụnna nwaanyị ndị ọzọ na-akparịta ụka, obi bụkwa ya sọ aṅụrị.

      Jehova enyerela ọtụtụ ndị aka, ha amalite idebe iwu ya. Ọ ga-enyekwara gịnwa aka

      ỤFỌDỤ NA-ASỊ na mmadụ abụọ inwe mmekọ adịghị njọ ma ọ bụrụ na ha hụrụ ibe ha n’anya.

      • Gịnị ka i chere?

      NCHỊKỌTA

      Mmekọ nwoke na nwaanyị bụ onyinye Jehova nyere ndị di na nwunye ha ga-eji na-eme onwe ha obi ụtọ.

      Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

      • Gịnị na gịnị so n’ịkwa iko?

      • Gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịkwa iko?

      • Olee uru anyị ga-erite ma anyị na-erubere Jehova isi?

      Ihe ị ga-agba mbọ mee

      IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

      Chọpụta ihe mere Chineke ji chọọ ka nwoke na nwaanyị buru ụzọ lụọ tupu ha ebiri.

      “Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Nwoke na Nwaanyị Ibikọ Ọnụ n’Alụghị Alụ?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

      Baịbụl sịrị na mmekọ nwoke na nwoke na nke nwaanyị na nwaanyị dị njọ. Chọpụta ma ọ̀ pụtara na anyị ga-akpọ ndị na-eme ya asị.

      “Mmekọ Nwoke na Nwoke ma Ọ Bụ Mmekọ Nwaanyị na Nwaanyị Ọ̀ Dị Njọ?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

      Chọpụta otú iwu dị iche iche Chineke nyere anyị gbasara ụdị mmekọahụ niile si abara anyị uru.

      “Mmadụ Iji Ọnụ Amị Ihe E Ji Bụrụ Nwoke ma Ọ Bụ Ihe E Ji Bụrụ Nwaanyị Ọ̀ Dị Njọ n’Eziokwu?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

      Gụọ isiokwu bụ́ “Ha Kwanyeere M Ùgwù,” ka ị chọpụta ihe mere otu nwoke ya na ndị nwoke ibe ya inwe mmekọ riri ahụ́ ji gbanwe ma fewe Chineke.

      “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ” (Ụlọ Nche, Eprel 1, 2011)

      a Ụfọdụ n’ime ihe so ná mmekọ a na-ekwu ebe a bụ ihe mmadụ ji bụrụ nwoke ịba n’ihe mmadụ ji bụrụ nwaanyị, isi n’ọnụ enwe mmekọ, isi n’otule enwe mmekọ, na ịdịda ihe onye ọzọ ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị aka.

  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ndị Lụrụ Di na Nwunye na Ndị Na-alụghị?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • Isi nke 42. Ebe otu nwanna nwaanyị na-alụbeghị di na otu di na nwunye ji obi ụtọ na-akparịta ụka n’ebe a na-ere nri.

      ISI NKE 42

      Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ndị Lụrụ Di na Nwunye na Ndị Na-alụghị?

      N’obodo ụfọdụ, ndị mmadụ na-ekwu na mmadụ emekataghị nwee obi ụtọ ná ndụ ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ma ọ bụ na ọ lụghị nwunye. Ma, ọ bụghị ndị niile lụrụ di ma ọ bụ ndị niile lụrụ nwunye na-enwe obi ụtọ. Ọ bụghịkwa ndị niile na-alụghị ka obi na-ajọ njọ. N’eziokwu, Baịbụl kwuru na mmadụ ịlụ di ma ọ bụ mmadụ ịlụ nwunye nakwa mmadụ ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ n’alụghị nwunye bụcha onyinye si n’aka Chineke.

      1. Olee ụfọdụ uru onye na-alụghị di ma ọ bụ onye na-alụghị nwunye na-erite?

      Baịbụl sịrị: “Onye lụrụ di ma ọ bụ onye lụrụ nwunye ga-erite uru. Ma, onye na-alụghị ga-aka erite uru.” (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:32, 33, 38.) Olee otú o si bụrụ na onye na-alụghị di ma ọ bụ onye na-alụghị nwunye “ga-aka erite uru”? Ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ na-alụghị nwunye enweghị di ma ọ bụ nwunye ha ga na-elekọta. N’ihi ya, ha ka ndị nke lụrụ di ma ọ bụ ndị nke lụrụ nwunye enwe efe ime ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ n’ime ha na-ewepụta onwe ha na-eme ọtụtụ ihe n’ozi ha na-ejere Jehova, dị ka ịkwaga ebe ọzọ a na-enwechaghị ndị na-ezi ozi ọma, ka ha nwee ike ịna-ezi ndị bi ebe ahụ ozi ọma. Nke kachanụ bụ na ha nwere ike iji oge buru ibu na-eme ka ha na Jehova dịkwuo ná mma.

      2. Olee uru ndị dị na mmadụ ịlụ di ma ọ bụ mmadụ ịlụ nwunye otú iwu obodo kwuru?

      Otú ahụ onye na-alụghị di ma ọ bụ onye na-alụghị nwunye na-erite uru ụfọdụ ka onye lụrụ di ma ọ bụ onye lụrụ nwunye na-eritekwa. Baịbụl sị na “abụọ dị mma karịa otu.” (Ekliziastis 4:9) Ndị na-akacha aghọta na ihe amaokwu Baịbụl a kwuru bụ eziokwu bụ ezigbo Ndị Kraịst ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru n’ezinụlọ ha. Di na nwunye lụrụ otú iwu obodo kwuru na-ekwe ibe ha nkwa na ha ga-ahụ ibe ha n’anya, na-akwanyere ha ùgwù ma jiri ha kpọrọ ihe. Ha anaghị echegbu onwe ha otú ndị bi n’alụghị otú iwu obodo kwuru na-echegbu onwe ha na e nwere ike ịgbahapụ ha. Obi na-esikwa ụmụ ha ike na nne ha ma ọ bụ nna ha agaghị agbahapụ ha otu ụbọchị.

      3. Olee otú Jehova si ele alụmdi na nwunye anya?

      Mgbe Jehova jikọrọ di na nwunye mbụ, ọ sịrị: ‘Nwoke ga-ahapụ nne ya na nna ya ma rapara n’ahụ́ nwunye ya.’ (Jenesis 2:24) Jehova chọrọ ka di na nwunye hụ ibe ha n’anya ma ghara ịhapụ ibe ha n’oge niile ha dị ndụ. Naanị ihe Jehova kwuru nwere ike ime ka ha hapụ ibe ha bụ ịkwa iko. O kwuru na e nwee onye n’ime ha kwara iko, onye nke ọzọ nwere ike ikpebi ịgba onye nke kwara iko alụkwaghịm.a (Matiu 19:9) Jehova achọghị ka Onye Kraịst nwee karịa otu di ma ọ bụ karịa otu nwunye.​—1 Timoti 3:2.

      MỤTAKWUO IHE

      Ma ị̀ lụrụ di ma ị̀ lụrụ nwunye ma ọ bụ na ị́ lụghị, chọpụta ihe ị ga-eme ka i nwee ike ịna-enwe obi ụtọ ma na-eme ka Jehova ṅụrịa.

      4. Jiri oge ị na-alụbeghị di ma ọ bụ ị na-alụbeghị nwunye mee ihe bara uru

      Jizọs ma na alụghị di ma ọ bụ alụghị nwunye bụ onyinye si n’aka Chineke. (Matiu 19:11, 12) Gụọnụ Matiu 4:23. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Olee otú Jizọs si jiri oge ọ na-alụghị nwunye jeere Nna ya ozi ma nyere ndị ọzọ aka?

      Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike ịna-enwe obi ụtọ ma ha jiri oge ahụ na-eme ihe Jizọs ji ụdị oge ahụ mee. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      VIDIO: Ụmụnna Anyị Jí Obi Ha Dum Efe Jehova ma Ha Alụbeghị Di ma Ọ Bụ Nwunye (3:11)

      • Olee ihe ndị bara uru Ndị Kraịst nwere ike iji oge ha na-alụbeghị di ma ọ bụ oge ha na-alụbeghị nwunye mee?

      Ị̀ ma ihe a?

      Baịbụl ekwughị afọ ole ọ ga-abụ mmadụ ruo ya abụrụ na o toruola ịlụ di ma ọ bụ ịlụ nwaanyị. Ma, o kwuru na ọ dị mma ka mmadụ lụọ di ma ọ bụ nwunye mgbe ‘ọ na-abụghịzi nwata.’ Oge ahụ bụ mgbe mmadụ ga-ejideli onwe ya ka agụụ mmekọ nwoke na nwaanyị ghara imegharị ya anya, ya emee ihe ọ ga-emecha kwaara ụta.​—1 Ndị Kọrịnt 7:36.

      5. Saa anya ná mmiri họrọ onye ị ga-alụ

      Ịhọrọ onye ị ga-alụ bụ otu n’ime ihe kacha mkpa i nwere ike ikpebi ná ndụ. Gụọnụ Matiu 19:4-6, 9. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Olee ihe mere na ịlụ di ma ọ bụ ịlụ nwunye ekwesịghị ịdị Onye Kraịst ọkụ ọkụ?

      Baịbụl ga-enyere gị aka ịchọpụta ma onye ị chọrọ ịlụ ọ̀ na-akpakwa ezigbo àgwà. Ihe kacha mkpa ị ga-agba mbọ mee bụ ịchọpụta ma onye ị chọrọ ịlụ ọ̀ hụrụ Jehova n’anya.b Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 7:39 na 2 Ndị Kọrịnt 6:14. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Olee ihe mere anyị ji kwesị ịlụ naanị Onye Kraịst ibe anyị?

      • Olee otú i chere obi ga-adị Jehova ma anyị lụọ onye na-ahụghị ya n’anya?

      Ebe e ji yok osisi kekọta otu oké ehi siri ike na otu obere jakị, ha abụọ ana-adọga.

      Ọ bụrụ na e jiri yok kekọta anụ abụọ na-abụghị otu ụdị anụ, ha abụọ ga-ata ahụhụ. Ọ dị ka mgbe Onye Kraịst gara lụrụ onye na-abụghị Onye Kraịst, ya na ọtụtụ nsogbu ga na-alụ

      6. Na-ele alụmdi na nwunye anya otú Jehova si ele ya

      N’oge ochie, ihe mere ndị Izrel ụfọdụ ji gbaa ndị nwunye ha alụkwaghịm bụ iji nweta ihe na-agụ anụ ahụ́ ha. Gụọnụ Malakaị 2:13, 14, 16. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Gịnị mere o ji ewute Jehova ma anyị jiri maka ihe na-enweghị isi gbaa di anyị ma ọ bụ nwunye anyị alụkwaghịm?

      Ebe otu nwaanyị obi gbawara na-ele di ya ka o si n’ụlọ ha na-akwapụ, nwa ha nwaanyị ebere ákwá bịa makụọ mama ya.

      Ịkwa iko na ịgba alụkwaghịm ya na ya so na-agbawa di ma ọ bụ nwunye aka ya dị ọcha na ụmụ ya obi

      Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      VIDIO: Onye Lụọ Di ma Ọ Bụ Nwunye, Ọ Lụchaala (4:30)

      • Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị abụghị Onye Kraịst, olee ihe ị ga-eme ka unu na-ebi n’udo?

      7. Na-eme ihe Jehova chọrọ ka di ma ọ bụ nwunye na-eme n’ezinụlọ

      O nwere ike isiri mmadụ ike ime ihe Jehova chọrọ ka di ma ọ bụ nwunye na-eme n’ezinụlọ.c Ma, Jehova na-agọzi ndị na-agba mbọ na-eme ihe ha kwesịrị ime. Kpọnyenụ VIDIO a.

      VIDIO: Ị Ga-emeli Ihe Jehova Chọrọ Ka Ndị Bụ́ Di na Ndị Bụ́ Nwunye Na-eme (4:14)

      Gụọnụ Ndị Hibru 13:4. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Ì chere na ihe Jehova chọrọ ka di ma ọ bụ nwunye na-eme n’ezinụlọ dị mma? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?

      Jehova chọrọ ka Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye dejupụta akwụkwọ na-egosi na ha bụ di na nwunye. Ọ chọkwara ka ha dejupụta nke na-egosi na ha gbara alụkwaghịm mgbe ọ bụla ha gbara alụkwaghịm. Anyị kwesịrị ime ihe abụọ a maka na ha bụ ihe ndị ọchịchị chọrọ ka a na-eme n’ọtụtụ ebe n’ụwa. Gụọnụ Taịtọs 3:1. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Ọ bụrụ na ị lụọla di ma ọ bụ na ị lụọla nwunye, ì meela ihe ndị ọchịchị kwuru a ga-eme ka ha mara na unu alụọla?

      MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe mere ọ ga-eji gaa lụwa di ma ọ bụ nwunye ebe ọ bụ na nwoke na nwaanyị nwere ike biri n’alụghị alụ.

      • Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?

      NCHỊKỌTA

      Ma ịlụ di ma ọ bụ ịlụ nwunye ma alụghị alụ bụcha onyinye si n’aka Jehova. Ma mmadụ ọ̀ lụrụ ma ọ bụ na ọ lụghị, o nwere ike ịna-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ọ na-ebi ndụ otú Jehova si chọọ.

      Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

      • Olee otú mmadụ ga-esi jiri oge ọ na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye mee ihe bara uru?

      • Gịnị mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị na-alụ Ndị Kraịst ibe anyị?

      • Gịnị ka Baịbụl kwuru bụ naanị ihe ga-eme ka mmadụ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm?

      Ihe ị ga-agba mbọ mee

      IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

      Gịnị ka mmadụ ịlụ “naanị onye na-eso ụzọ Onyenwe anyị” pụtara?

      “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” (Ụlọ Nche, Julaị 1, 2004)

      Lee obere vidio abụọ ga-enyere gị aka ikpebi ihe na-agaghị aghọ gị ahịa mgbe gị na onye ị chọrọ ịlụ na-akpa.

      Ịkwadebe Maka Alụmdi na Nwunye (11:53)

      Chọpụta ihe mere otu nwanna nwoke ji kwuo na ihe Jehova meere ya karịrị ihe ya hapụrụ iji fee ya.

      M Nọ Na-eche na Ọ Ga-emecha Bụrụ Onyeàmà Jehova (1:56)

      Gịnị na gịnị ka mmadụ kwesịrị ichebara echiche tupu ya achọwa ịgba di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm ma ọ bụ chọwa ka ha kewaa?

      “Na-akwanyere ‘Ihe Chineke Kekọtara’ Ùgwù” (Ụlọ Nche, Disemba 2018)

      a Gụọ Ihe nke 4 E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A gbasara ihe ga-eme ka mmadụ hapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya mgbe ọ na-akwaghị iko.

      b N’ebe ụfọdụ, ọ bụ ndị nne na nna na-achọtara ụmụ ha di ma ọ bụ nwunye. Ọ bụrụ otú ọ dị n’obodo unu, unu ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya, ihe unu kwesịrị ịchọpụta bụ ma onye ahụ ọ̀ hụrụ Jehova n’anya, ọ bụghị ụdị ego o nwere ma ọ bụ otú o si buru onye ukwu n’obodo.

      c Ọ bụrụ na onye gị na ya bi ugbu a abụghị di gị ma ọ bụ nwunye gị, ọ bụ gịnwa ga-ekpebi ma ị̀ ga-ahapụ ya ma ị̀ ga-alụwa ya.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya