Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Ọrụ na Ego
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • 2. Olee otú dị mma anyị kwesịrị isi na-ele ego anya?

      Ọ bụ eziokwu na Baịbụl gwara anyị na ego “na-echebe mmadụ,” ma ọ gwakwara anyị na naanị ego agaghị eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ. (Ekliziastis 7:12) Ọ bụ ya mere o ji gwa anyị ka anyị ghara ịhụ ego n’anya, kama ‘ka ihe ndị dị ugbu a ju anyị afọ.’ (Gụọ Ndị Hibru 13:5.) Ọ bụrụ na ihe anyị nwere eju anyị afọ, anyị agaghị na-eche na anyị enweghị ọtụtụ ihe, ike ụwa agaghịkwa na-agwụ anyị. Anyị agaghị na-eji ụgwọ na-enweghị isi na ọdụ. (Ilu 22:7) Anyị agaghịkwa abanye ná nsogbu maka na anyị gara gbaa chaa chaa ma ọ bụ na anyị tinyere aka n’azụmahia zụọ taa, baa echi.

  • Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Ọrụ na Ego
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • 5. Ihe anyị nwere iju anyị afọ na-abara anyị uru

      Ego anaghị eju ọtụtụ ndị eju. Ma, Baịbụl gwara anyị ka ọ ghara ịdị anyị otú ahụ. Gụọnụ 1 Timoti 6:6-8. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Gịnị ka Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ime?

      Anyị nwere ike ịna-enwe obi ụtọ, ọ bụrụgodị na anyị enweghị ọtụtụ ihe. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      VIDIO: “Na-enwe Afọ Ojuju n’Ihe Ndị Dị Ugbu A” (3:20)

      • Gịnị mere ezinụlọ ndị a ji enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na ha enweghị ego?

      Gịnị ga-eme anyị ma ọ bụrụ na anyị enweela ego ma ka na-achọ ka anyị nwetakwuo? Jizọs mere ihe atụ gosiri ihe nwere ike ime anyị. Gụọnụ Luk 12:15-21. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Gịnị ka ị mụtara n’ihe atụ a Jizọs mere?—Leruonụ anya n’amaokwu nke 15.

      Gụọnụ Ilu 10:22 na 1 Timoti 6:10. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Ịbụ enyi Jehova na inwe ego, olee nke ka mkpa? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?

      • Olee nsogbu ịchụ ego ọnwụ ọnwụ na-akpata?

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya