-
Iji Obi Umeala Na-edo Onwe Anyị n’Okpuru Ndị Ọzụzụ Atụrụ Na-ahụ n’AnyaỤlọ Nche—2007 | Eprel 1
-
-
7. Olee ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere banyere otú anyị kwesịrị isi na-akpaso ndị nlekọta e nwere n’ọgbakọ àgwà?
7 Ndị Ọzụzụ Atụrụ anyị nọ n’eluigwe, bụ́ Jehova Chineke na Jizọs Kraịst, na-atụ anya ka anyị na-erubere ndị okenye, bụ́ ndị e nyere ọrụ ha ga na-arụ n’ọgbakọ, isi ma na-edo onwe anyị n’okpuru ha. (1 Pita 5:5) Mmụọ nsọ kpaliri Pọl onyeozi ide, sị: “Na-echetanụ ndị na-edu ndú n’etiti unu, bụ́ ndị gwaworo unu okwu Chineke, ka unu na-ahụkwa ihe na-esi n’omume ha apụta, na-eṅominụ okwukwe ha. Na-eruberenụ ndị na-edu ndú n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru, n’ihi na ha na-eche mkpụrụ obi unu nche dị ka ndị ga-aza ajụjụ; ka ha wee jiri ọṅụ na-eme nke a, ọ bụghị n’ịsụ ude, n’ihi na nke a ga-ebibiri unu ihe.”—Ndị Hibru 13:7, 17.
8. Gịnị ka Pọl na-agwa anyị ka anyị ‘na-ahụ,’ oleekwa otú anyị kwesịrị isi ‘na-erube isi’?
8 Rịba ama na Pọl gwara anyị ka anyị ‘na-ahụ,’ ma ọ bụ ka anyị na-eleru anya iji chọpụta, ihe si n’ikwesị ntụkwasị obi nke ndị okenye apụta ma na-eṅomi okwukwe ha. Tụkwasị na nke ahụ, ọ dụrụ anyị ọdụ ka anyị na-erube isi ma na-anakwere nduzi nke ndị ikom ndị a a họpụtara ahọpụta. Ọkà mmụta Bible bụ́ R. T. France na-akọwa na n’asụsụ Grik mbụ e ji dee Bible, okwu a sụgharịrị ebe a ịbụ ‘na-erube isi’ abụghị “ụdị nke a na-ejikarị eme ihe mgbe a na-ekwu okwu banyere nrubeisi, kama ọ pụtara n’ụzọ nkịtị ‘ịbụ onye e mere ka o kwere ime ihe,’ nke na-egosi mmadụ iji obi ya nakwere nduzi nke onye na-edu ndú.” Ihe mere anyị ji erubere ndị okenye isi abụghị nanị n’ihi na a gwara anyị n’Okwu Chineke ka anyị mee otú ahụ kamakwa ọ bụ n’ihi na e mere ka anyị kwenye na ha bu ma ọdịmma Alaeze ahụ ma ọdịmma anyị n’obi. Anyị ga-enwe obi ụtọ n’ezie ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị na-anakwere nduzi ha.
-
-
Iji Obi Umeala Na-edo Onwe Anyị n’Okpuru Ndị Ọzụzụ Atụrụ Na-ahụ n’AnyaỤlọ Nche—2007 | Eprel 1
-
-
10, 11. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị nlekọta siworo ‘gwa Ndị Kraịst ibe ha okwu Chineke’ na narị afọ mbụ nakwa taa?
10 Ná Ndị Hibru 13:7, 17, bụ́ nke e hotara na paragraf nke asaa, Pọl onyeozi gwara anyị ihe anọ mere anyị ji kwesị irubere ndị okenye ọgbakọ isi ma na-edo onwe anyị n’okpuru ha. Nke mbụ bụ na ha ‘gwara anyị okwu Chineke.’ Cheta na ‘onyinye ndị ahụ Jizọs nyere ọgbakọ n’ụdị mmadụ’ bụ iji “gbazigharịa ndị nsọ.” (Ndị Efesọs 4:11, 12) Ọ gbazigharịrị echiche na àgwà nke Ndị Kraịst narị afọ mbụ site n’aka ndị okenye kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị mmụọ nsọ kpaliri ụfọdụ n’ime ha idegara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ ozi. O ji ndị nlekọta dị otú ahụ e ji mmụọ nsọ họpụta duzie ma wulie Ndị Kraịst elu na narị afọ mbụ.—1 Ndị Kọrịnt 16:15-18; 2 Timoti 2:2; Taịtọs 1:5.
11 Taa, Jizọs na-eduzi anyị site n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” bụ́ nke Òtù Na-achị Isi na ndị okenye a họpụtara ahọpụta na-anọchite anya ha. (Matiu 24:45) Iji gosi na anyị na-akwanyere “onyeisi ọzụzụ atụrụ” ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst ùgwù, anyị ga-agbaso ndụmọdụ Pọl bụ́: “Ka unu na-akwanyere ndị ahụ ùgwù, bụ́ ndị na-arụsi ọrụ ike n’etiti unu ma na-elekọta unu n’Onyenwe anyị ma na-adụ unu ọdụ.”—1 Pita 5:4; 1 Ndị Tesalonaịka 5:12; 1 Timoti 5:17.
-