Jidesie Obi Ike Gị Ike Ruo Ọgwụgwụ Ihe Nile
CHEEDỊ banyere otu ụgbọ elu nta na-efebanye n’ọnọdụ ihu igwe siri ike. Onye na-anya ya enwekwaghị ike ịhụ ihe ndị e ji amata ebe a nọ. Urukpuru gbara ọchịchịrị na-ekpuchi ya. Ọ pụghị ịhụ ụzọ gafee enyo ihu ụgbọ elu ahụ, ma o ji n’aka na ya pụrụ ịgazu njem ya n’udo. Gịnị kpatara o ji nwee obi ike?
O nwere ngwá ọrụ ziri ezi nke mere ka o nwee ike ifefe n’urukpuru ma daa n’ọchịchịrị. N’ụzọ ọ na-efefe, karịsịa ná nso ọdụ ụgbọ elu, ihe nduzi ndị na-acha ọkụ n’elu ya na-eji usoro eletrik na-eduzi ya, ya na ndị nọ n’ala bụ́ ndị na-achịkwa njem ụgbọ elu na-ekwurịta okwu.
N’ụzọ yiri ya, anyị pụrụ iji obi ike chee ọdịnihu ihu, ọ bụ ezie na ọnọdụ ụwa na-agba ọchịchịrị kwa ụbọchị karị. Njem anyị gabiga ajọ usoro ihe a pụrụ ịdị na-anọte anya karịa ka ụfọdụ tụrụ anya ya, ma anyị pụrụ inwe obi ike na anyị adịghị ehie ụzọ ma nọrọ n’ezi oge. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide nnọọ nke a n’aka? N’ihi na anyị nwere nduzi nke na-eme ka anyị nwee ike ịhụ ihe ọhụhụ ụzọ mmadụ na-apụghị.
Okwu Chineke bụ ‘ìhè dịịrị okporo ụzọ anyị,’ ọ bụkwa ihe “kwesịrị ntụkwasị obi, na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.” (Abụ Ọma 19:7; 119:105) Dị ka ihe nduzi ụgbọ elu nke na-egosi ụzọ onye na-anya ụgbọ elu ga-eso, Bible n’ụzọ ziri ezi na-edepụtasị ihe ga-eme n’ọdịnihu ma na-enye anyị ntụziaka doro anya iji jide n’aka na anyị bịarutere ebe anyị na-aga n’udo. Otú ọ dị, iji rite uru site ná nduzi Chineke, anyị aghaghị ịtụkwasị ya obi.
N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru, Pọl gbara ndị Kraịst bụ́ ndị Juu ume ‘ijidesi mmalite nke obi ike ha ike ruo ọgwụgwụ ihe nile.’ (Ndị Hibru 3:14) A pụrụ ịkwa ntụkwasị obi aka ma ọ bụrụ na anyị ‘ejidesighị ya ike.’ Ya mere ajụjụ ahụ na-ebilite, Olee otú anyị pụrụ isi jigidesie obi ike anyị na Jehova ike ruo ọgwụgwụ ihe nile?
Gosipụta Okwukwe Gị
Tupu onye na-anya ụgbọ elu enwee ike ịnya ụgbọ elu n’ahụghị ebe ọ na-aga, na-adabere kpam kpam ná ngwá ọrụ ya na nduzi nke ndị nọ n’ala, ọ chọrọ ọzụzụ zuru ezu na ọtụtụ hour nke ifegharị n’elu. N’otu aka ahụ, ọ dị onye Kraịst mkpa ịnọgide na-egosipụta okwukwe ya iji jigide obi ike ya ná nduzi Jehova, karịsịa mgbe ọnọdụ ndị siri ike dapụtara. Pọl onyeozi dere, sị: “Ebe anyị nwere otu mmụọ nke okwukwe ahụ, dị ka ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ si dị, Ekwere m, n’ihi ya ka m kwuru; anyị onwe anyị kwerekwa, ọ bụkwa n’ihi ya ka anyị na-ekwu.” (2 Ndị Kọrint 4:13) Ya mere, mgbe anyị na-ekwu banyere ozi ọma nke Chineke, anyị na-egosipụta ma na-ewusi okwukwe anyị ike.
Magdalena, bụ́ onye nọrọ afọ anọ n’ogige ịta ahụhụ n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, na-akọwa uru nke ọrụ ime nkwusa, sị: “Nne m kụziiri m na iji nọgide na-enwe okwukwe siri ike, ọ dị mkpa inwe mmasị n’ọdịmma ime mmụọ nke ndị ọzọ. M na-echeta otu ihe merenụ nke na-eme ihe atụ mmetụta anyị nwere. Mgbe a tọhapụsịrị anyị n’ogige ịta ahụhụ Ravensbrück, mụ na nne m ruru ebe obibi anyị n’ụbọchị Friday. Ụbọchị abụọ n’ihu, na Sunday, anyị sonyeere ụmụnna n’ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ekwenyesiri m ike na ọ bụrụ na anyị atụkwasị uche n’inyere ndị ọzọ aka ịtụkwasị nkwa nile nke Chineke obi, otu nkwa ndị ahụ ga-abụkwa eziokwu karị nye anyị.”—Tụlee Ọrụ 5:42.
Ijigidesi obi ike anyị ike ruo ọgwụgwụ ihe nile na-achọ ọrụ ime mmụọ n’akụkụ ndị ọzọ. Ọmụmụ ihe onwe onye bụ mmega ahụ ọzọ magburu onwe ya nke na-ewusi okwukwe ike. Ọ bụrụ na anyị eṅomie ndị Beria ma jiri ịdị uchu na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị, ọ ga-enyere anyị aka ‘inwezu olileanya anyị ruo ọgwụgwụ ihe nile.’ (Ndị Hibru 6:11; Ọrụ 17:11) N’eziokwu, ọmụmụ ihe onwe onye chọrọ oge na mkpebisi ike. Ikekwe, ọ bụ ya mere Pọl ji dọọ ndị Hibru aka ná ntị banyere ihe ize ndụ nke ịdị “umengwụ” n’okwu ndị dị otú a.—Ndị Hibru 6:12.
Àgwà umengwụ pụrụ ịrụpụta ihe dị njọ n’ọtụtụ akụkụ nke ndụ. Solomọn kwuru na “sitekwa n’ịfanye aka n’ụkwụ ka ụlọ [na-ehi] mmiri.” (Eklisiastis 10:18) N’oge na-adịghị anya mmiri ozuzo na-amalite ịtasịsị site n’elu ụlọ nke a na-adịghị elekọta. Ọ bụrụ na anyị afanye aka anyị n’ụkwụ n’ụzọ ime mmụọ ma ghara ijigide okwukwe anyị, obi abụọ pụrụ igbebata. N’aka nke ọzọ, ịtụgharị uche mgbe nile na ọmụmụ nke Okwu Chineke ga-enye okwukwe anyị ihe ọ chọrọ ma chebe ya.—Abụ Ọma 1:2, 3.
Iwulite Ntụkwasị Obi Site n’Ahụmahụ
Otú ọ dị, onye na-anya ụgbọ elu na-amụta ihe site n’ahụmahụ nakwa site n’ọmụmụ ihe na ngwá ọrụ ya kwesịrị ntụkwasị obi. N’otu aka ahụ, obi ike anyị n’ebe Jehova nọ na-eto mgbe anyị hụrụ ihe àmà nke nlekọta ịhụnanya ya n’ime ndụ nke onwe anyị. Joshua nwere ahụmahụ nke ahụ, o chetakwaara ndị Israel ibe ya, sị: “Unu amawo n’obi unu nile na n’ime mkpụrụ obi unu nile, na ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu, ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ime ya.”—Joshua 23:14.
Josefina, nwanna nwanyị a lụ alụ sitere Philippines, mụtara otu ihe ahụ. Ọ kọwara ihe ndụ dị ka ya tupu ya amụta eziokwu: “Di m na-aṅụbu oké mmanya, mgbe mmanya malitekwara igbu ya, ọ ga-ewe iwe ma tie m ihe. Alụmdi na nwunye anyị na-enweghị obi ụtọ nọkwa na-emetụta nwa anyị nwoke. Mụ na di m na-arụ ọrụ, na-akpata nnọọ ego dị ukwuu, ma anyị gbafuru ihe ka ọtụtụ n’ime ihe anyị na-akpata na chaa chaa. Di m nwere ọtụtụ ndị enyi, ma ihe ka ọtụtụ n’ime ha chọrọ ọbụbụenyi ya ka o wee kwụọrọ ha ụgwọ mmanya ndị ahụ, ọbụna ụfọdụ na-eme ka ọ ṅụbiga mmanya ókè nanị iji chịa ya ọchị.
“Ihe gbanwere mgbe anyị bịara mata Jehova ma tinye ndụmọdụ ya n’obi. Di m anakwaghị aṅụbiga mmanya ókè, anyị akwụsiwo ịgba chaa chaa, anyị nwekwara ezi ndị enyi hụrụ anyị n’anya ma na-enyere anyị aka. Alụmdi na nwunye anyị bụ nke obi ụtọ, nwa anyị nwoke na-etolitekwa ịbụ nwa okorobịa ọma. Anyị na-arụ ọrụ ruo oge dị nta karị, ma anyị nwere ego buru ibu karị. Ahụmahụ akụziworo anyị na Jehova dị ka Nna na-ahụ n’anya, onye na-edu anyị aga n’ụzọ ziri ezi mgbe nile.”
N’ihi ntụziaka e ji redio nye ma ọ bụ ntụle ngwá ọrụ, mgbe ụfọdụ ndị na-anya ụgbọ elu na-aghọta na ọ dị ha mkpa idozi ụzọ ha. N’ụzọ dịkwa otú ahụ ọ pụrụ ịbụ na anyị aghaghị ịgbanwe ụzọ anyị na-agbaso n’ikwekọ ná ntụziaka Jehova. “Ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.” (Aịsaịa 30:21) Site n’Okwu ya na site ná nzukọ ya, anyị na-anata ndụmọdụ na-eme ka anyị mata ihe ize ndụ ime mmụọ dị iche iche. Otu n’ime ndị a metụtara mkpakọrịta.
Mkpakọrịta Pụrụ Ime Ka Anyị Kpafuo
Ntakịrị ụgbọ elu pụrụ ịbụ nke hiere ụzọ n’ụzọ dị mfe ma ọ bụrụ na e meghị ndozigharị ndị dị mkpa. N’otu aka ahụ, mmetụta ndị si n’èzí na-apịakwasị ndị Kraịst taa mgbe nile. Anyị bi n’ụwa nke anụ ahụ na-achị ebe ọtụtụ na-eji ihe ime mmụọ na-emere ihe ọchị, na-ewere ego na ihe ụtọ dị ka ihe ndị dị mkpa karị. Pọl dọrọ Timoti aka ná ntị na mgbe ikpeazụ ga-adị “oké egwu.” (2 Timoti 3:1-5) Ndị nọ n’afọ iri na ụma, bụ́ ndị na-achọsi nnakwere na iwu ewu ike, bụ ndị e kpughere nye mkpakọrịta ọjọọ karịsịa.—2 Timoti 2:22.
Amanda, bụ́ onye dị afọ 17, na-akọwa, sị: “Ruo oge ụfọdụ ụmụ klas m kụdara okwukwe m ruo n’ókè ụfọdụ. Ha nọgidere na-ekwu na okpukpe m na-etinye ihe mgbochi ma bụrụ nke ezi uche na-adịghị ya, nke a malitekwara ịkụda m obi. Otú ọ dị, nne na nna m nyeere m aka ịghọta na ihe nduzi ndị Kraịst na-echebe echebe kama igbochi egbochi. Ugbu a m na-aghọta na ụkpụrụ ndị a na-enyere m aka ibi ndụ na-eju afọ karịa nke ndị ahụ bụbu ụmụ akwụkwọ ibe m. Amụtawo m ịtụkwasị ndị na-eche banyere m n’ezie obi—nne na nna m na Jehova—m na-anụkwa ụtọ ozi ọsụ ụzọ.”
N’agbanyeghị afọ ndụ anyị, anyị ga-ezute ndị na-ekwu okwu mweda n’ala banyere nkwenkwe anyị dị iche iche. Ha pụrụ iyi ndị nwere amamihe ụwa, ma n’ebe Chineke nọ ha bụ ndị anụ ahụ na-achị, ndị na-ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. (1 Ndị Kọrint 2:14) Otu òtù a ma ama na Kọrint n’oge Pọl bụ ndị Skeptic nwere amamihe ụwa. O yiri ka ozizi nke ndị ọkà ihe ọmụma a dujere ụfọdụ ndị Kraịst nọ na Kọrint ịghara inwe okwukwe n’olileanya mbilite n’ọnwụ. (1 Ndị Kọrint 15:12) “Unu ekwela ka e duhie unu,” ka Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị. “Mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.”—1 Ndị Kọrint 15:33.
N’aka nke ọzọ, mkpakọrịta ọma na-ewusi anyị ike n’ụzọ ime mmụọ. N’ime ọgbakọ ndị Kraịst, anyị nwere ohere isoro ndị na-ebi ndụ nke inwe okwukwe na-akpakọrịta. Norman, bụ́ nwanna nwoke mụtara eziokwu na 1939, ka bụ isi iyi nke agbamume dị ukwuu nye mmadụ nile. Gịnị nọgidere na-eme ka echiche ime mmụọ ya dị nkọ? “Nzukọ dị iche iche na isoro ụmụnna na-ekwesị ntụkwasị obi nwee ọbụbụenyi chiri anya dị mkpa,” ka ọ zaghachiri. “Ụdị mkpakọrịta a enyeworo m aka ịhụ nke ọma ọdịiche dị n’etiti nzukọ Chineke na nke Setan.”
Aghụghọ nke Akụ̀
Brian, bụ́ onye na-anya ụgbọ elu nweworo ahụmahụ, na-akọwa na “mgbe ụfọdụ ọ pụrụ isiri onye na-anya ụgbọ elu ike ikwenyere ngwá ọrụ ya—nanị n’ihi na amamihe ebumpụta ụwa ya ekweghị. Ndị na-anya ụgbọ elu ndị agha ndị nweworo ahụmahụ abụrụwo ndị a maara na-akpọ ụgbọ elu ha isi n’ala mgbe ha na-anya ya n’ihi na ọkụ nọ n’ala yiri nnọọ kpakpando—ọ bụ ezie na ngwá ọrụ ha gwara ha ihe megidere nke ahụ.’
N’otu aka ahụ, amamihe ebumpụta ụwa anyị na-achọ ọdịmma onwe ya nanị pụrụ iduhie anyị n’ụzọ ime mmụọ. Jisọs sịrị na akụ̀ dị “aghụghọ,” Pọl dọkwara aka ná ntị na ‘ịhụ ego n’anya eduhiewo ọtụtụ ndị n’okwukwe anyị.’—Mak 4:19; 1 Timoti 6:10.
Dị ka ọkụ na-atabi anya nke dị aghụghọ, ihe mgbaru ọsọ na-egbuke egbuke nke ihe onwunwe pụrụ iduhie anyị ụzọ. Kama ịdị na-aṅụrị ọṅụ ‘n’ihe a na-ele anya,’ anyị pụrụ ịbụ ndị oké okwu nke ụwa a na-agabiga agabiga dọpụrụ uche. (Ndị Hibru 11:1; 1 Jọn 2:16, 17) Ọ bụrụ na anyị “na-ezube” ibi ndụ ọgaranya, o yiri ka anyị ga-enwe oge dị nta fọdụrụ maka uto ime mmụọ.—1 Timoti 6:9; Matiu 6:24; Ndị Hibru 13:5.
Nwa okorobịa lụworo nwunye aha ya bụ́ Patrick kwetara na ya na nwunye ya chụrụ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ n’àjà iji bikwuo ndụ ọgaranya. Ọ na-akọwa, sị: “Ndị nwere ụgbọ ala dara oké ọnụ na ebe obibi okomoko n’ọgbakọ nwere mmetụta n’ahụ anyị. Ọ bụ ezie na anyị ewepụghị anya anyị n’olileanya Alaeze ahụ, anyị chere na anyị pụkwara ibi ndụ ntụsara ahụ. Otú ọ dị, mgbe oge na-aga anyị ghọtara na ezi obi ụtọ na-abịa site n’ijere Jehova ozi na site n’ito eto n’ime mmụọ. Ugbu a ndụ anyị dị mfe ọzọ. Anyị ebelatawo hour anyị ji na-arụ ọrụ, anyị aghọwokwa ndị ọsụ ụzọ oge nile.”
Okwukwe Na-adabere n’Obi Na-anabata Ihe
Obi na-anabata ihe na-ekerekwa òkè dị mkpa n’iwulite obi ike na Jehova. N’eziokwu, “okwukwe bụ ndabere nke ihe a na-ele anya, bụrụkwa nnwapụta [ma ọ bụ, “ihe àmà doro anya,” nkọwa ala ala peji nke NW] nke ihe a na-ahụghị anya.” (Ndị Hibru 11:1) Ma ọ gwụlakwa ma anyị nwere obi na-anabata ihe, o yighị ka ihe ọ ga-edo anyị anya. (Ilu 18:15; Matiu 5:6) N’ihi nke a Pọl onyeozi kwuru na “ọ bụghị mmadụ nile nwere okwukwe.”—2 Ndị Tesalọnaịka 3:2.
Mgbe ahụ, olee otú anyị pụrụ isi mee ka obi anyị na-anabata ihe nye ihe àmà ndị na-edo anya e nwere? Site n’ịzụlite àgwà Chineke, àgwà ndị na-emeju ma na-akpali okwukwe. Pita na-agba anyị ume ‘inyezu okwukwe anyị ịdị mma, ihe ọmụma, ijisi onwe onye ike, ntachi obi, nsọpụrụ Chineke, ịhụnanya ụmụnna, na ịhụnanya.’ (2 Pita 1:5-7; Ndị Galetia 5:22, 23) N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ nanị maka onwe anyị ma ọ bụ na-ejere Jehova ozi iji mezuo iwu, anyị apụghị ịtụ anya n’ụzọ ezi uche dị na ya ka okwukwe anyị na-eto.
Ezra “doziri obi ya” ịgụ Okwu Jehova na itinye ya n’omume. (Ezra 7:10) N’otu aka ahụ Maịka nwere obi na-anabata ihe. “Ma mụ onwe m, n’ime Jehova ka m ga-eche nche nke ọma; M ga-echere Chineke nke nzọpụta m: Chineke m ga-anụ olu m.”—Maịka 7:7.
Magdalena, onye e hotara ná mmalite, jikwa ndidi na-echere Jehova. (Habakuk 2:3) Ọ na-asị: “Anyị enweworị paradaịs ime mmụọ. Ihe ọzọ ga-esonụ, Paradaịs a na-ahụ anya, ga-abịa n’ezi nso. Ka ọ dịgodị ugbu a ọtụtụ narị puku na-esonyere oké ìgwè mmadụ ahụ. Ọ na-eme m obi ụtọ ịhụ ka ọtụtụ na-enubata ná nzukọ Chineke.”
Ilegara Chineke nke Nzọpụta Anyị Anya
Ijidesi obi ike anyị ike ruo ọgwụgwụ ihe nile chọrọ igosipụta okwukwe anyị na iji nlezianya na-aṅa ntị ná nduzi ndị anyị na-anata site n’aka Jehova na nzukọ ya. N’ezie o kwesịrị mgbalị anyị tinyere. Onye na-anya ụgbọ elu na-enwe ezi afọ ojuju mgbe o fedatara ma n’ikpeazụ gafere urukpuru ahụ rọrọ arọ ka o mesịrị njem dị anya ma sie ike. N’ebe ahụ n’ihu ya ka e nwere ala—na-acha ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ ma na-adọrọ mmasị. Okporo ụzọ ụgbọ elu si efe dị n’okpuru ya, nọ na-echere ịnabata ya.
Ahụmahụ na-akpali akpali na-echerekwa anyị. Ajọ ụwa nke a gbara ọchịchịrị ga-enyere ụwa ọhụrụ nke ezi omume ohere. Nnabata Chineke na-echere anyị. Anyị pụrụ irute n’ebe ahụ ma ọ bụrụ na anyị aṅaa ntị n’okwu nke onye ọbụ abụ ahụ: “Gị onwe gị bụ olileanya m, Onyenwe anyị Jehova: Gị bụ ntụkwasị obi m site na nwata. . . . Na Gị ka otuto m ga-adị mgbe nile.”—Abụ Ọma 71:5, 6.