Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 10/15 p. 26-29
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Gbasoo Ezi Omume?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Gbasoo Ezi Omume?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke nke Ezi Omume
  • Ụzọ nke Ezi Omume
  • A Gụrụ Ezi Ndị Kraịst ná Ndị Ezi Omume
  • Nọgide Na-agbaso Ezi Omume
  • Ịgbaso Ezi Omume—Ihe Ịma Aka
  • Ngọzi Nile nke Ezi Omume
  • Ka Ezi Omume Jehova Na-atọ Gị Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Jiri Obi Gị Dum Hụ Ezi Omume n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ịchọ Ezi Omume Ga-echebe Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Burunụ Ụzọ Na-achọ “Ezi Omume Chineke”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 10/15 p. 26-29

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Gbasoo Ezi Omume?

N’IME ụwa ahụ nke jupụtara n’ime ihe ike nke dịrị tupu Iju Mmiri ahụ, otu nwoke nọ dị ka onye pụrụ iche. Nwoke ahụ bụ Noa. Ya na ezinụlọ ya sooro Chineke jekọọ ije ebe ihe fọdụrụ n’ihe a kpọrọ mmadụ gbakụtara Ya azụ. N’ihi nke a, “Noa bụ onye ezi omume” n’ime oge ọjọọ ndị ahụ, nyekwa ndị ụwa ndị na-adịghị aṅa ntị, ọ ghọrọ “onye na-ekwusa ezi omume.”—Jenesis 6:9; 2 Pita 2:5.

N’otu mgbe, n’ihe dị ka afọ 56 nke Oge Anyị, Pọl onyeozi nọ n’ụlọ mkpọrọ na Sizaria. Mgbe e si n’ime ụlọ mkpọrọ ya kpọpụta ya n’ihu Onye Ochịchị bụ Filiks, Pọl weere ohere ahụ mee ihe ikwusara onye ọchịchị Rom nke a dị elu ozi ọma. Gịnị bụ isi ihe dị n’ihe o kwuru? “Ọ na-ekwu okwu banyere ezi omume, na imeru ihe n’ókè, na ikpe ahụ nke gaje ịbịa.” (Ọrụ 24:25) Ee, Pọl bụkwa onye na-ekwusa ezi omume.

O doro anya na nchegbu nke ndị ohu Chineke abụọ ndị a kwesịrị ntụkwasị obi gosiri maka ezi omume kwesịrị nnọọ ekwesị. Jehova bụ “Chineke nke na-eme ezi omume na onye nzọpụta.” (Aịsaịa 45:21) Ya mere, ilu ahụ nke sitere n’ike mmụọ nsọ na-agwa anyị, sị: “Ihe arụ n’anya Jehova ka ụzọ onye na-emebi iwu bụ: ma onye na-agbaso ezi omume ka ọ na-ahụ n’anya.” (Ilu 15:9) Ndị ohu Chineke nile aghaghị ịgbaso ezi omume.

Ọ bụ ihe na-adịghi enye obi ụtọ na ọtụtụ ndị taa nwere àgwà nke ejighị ihe kpọrọ ihe banyere àgwà nke a. Ha na-asị: ‘Adịghị m eme onye agbata obi m ihe ọjọọ, ya mere, eji m n’aka na ihe m na-atọ Chineke ụtọ.’ Ma ọ bụ ha pụrụ ịnọgide na-ekwu, sị: ‘E nwere ụzọ dị iche iche na-eduje n’ezi omume. Ihe nile ga-adịcha mma ya bụrụhaala na m nwere obi eziokwu n’ihe banyere okpukpe m.’ I chere na àgwà ntụsara ahụ dị otú ahụ bụ ihe Chineke na-anara nke ọma?

Ndị ọzọ pụrụ iwelite okwu dị iche. Ọ pụrụ ịbụ na ha maara banyere okwu Pọl bụ: “A gụrụ anyị ná ndị ezi omume site n’okwukwe.” (Ndị Rom 5:1) N’iburu nke a n’uche, ha pụrụ iche, sị: ‘Olee ụzọ o si bụrụ na ndị Kraịst, ndị a gụwororịị ná ndị ezi omume, ga-anọgidekwa na-agbaso ezi omume?’ Ị ga-esi aṅaa zaa ajụjụ dị otú ahụ?

Chineke nke Ezi Omume

Dị ka akwụkwọ ọkọwa okwu si kwuo, ezi omume bụ izi ezi n’ụzọ omume, ikpe ziri ezi, ikwekọ n’iwu Chineke banyere omume. Ebe Jehova bụ Chineke nke ezi omume, onye ọ bụla nke na-achọ ime ihe na-atọ ya ụtọ aghaghị inwe nchegbu banyere àgwà nke a dị oké mkpa. Onye ọbụ abụ ahụ sịrị, “Onye ezi omume ka Jehova bụ; ezi omume ka ọ hụrụ n’anya: ndị ziri ezi ga-ahụ ihu ya.” (Abụ Ọma 11:7; Deuterọnọmi 32:4) Pita onyeozi sịrị: “Anya abụọ nke [Jehova, NW] dị n’ahụ ndị ezi omume, ntị ya abụọ dịkwa n’ebe arịrịọ ha dị.”—1 Pita 3:12.

Ya mere, anyị apụghị ile okwu a anya dị ka ihe na-adịghị oké mkpa, dị ka ọtụtụ ndị Juu mere. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ezị mmadụ, ndị na-emeghị ndị agbata obi ha ihe ọjọọ ọ bụla. Ha nwekwara obi eziokwu—ọbụna na-anụ ọkụ n’obi—banyere okpukpe ha. Ma n’ime narị afọ mbụ ahụ, ihe ka ọtụtụ n’ime ha abụghị ndị ezi omume n’anya Chineke. Pọl sịrị: “Ana m agbara ha àmà na ha na-anụ ọkụ n’obi n’ebe Chineke nọ, ma ọ bụghị dị ka mmazu si dị. N’ihi na, ebe ha na-amaghị ezi omume Chineke, na-achọkwa ụzọ ime ka ezi omume nke aka ha guzoo, ha edoghị onwe ha n’okpuru ezi omume Chineke.”—Ndị Rom 10:2, 3.

Gịnị ka ndị Juu ahụ na-emezighị? Pọl kwuru na ha agbasoghị ezi omume dị ka mmazu sị dị. Ihe nlereanya ha nke bụ ihe ịdọ aka ná ntị na-agwa anyị na o zughị ezu nanị inwe ọdịdị mmadụ dị mma na izere ime ndị ọzọ ihe ọjọọ. O gosikwara na e nweghị ọtụtụ ụzọ dị iche iche ndị na-eduje n’ezi omume. N’ụzọ doro anya, e nwere ihe dị njọ n’ụzọ nke ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu họọrọ ịgbaso n’oge ndị ozi ahụ. Anyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịgbaso ezi omume nanị ma ọ bụrụ na anyị egee Chineke ntị. Akwụkwọ Ilu na-asị: “Nwa m, ọ bụrụ na ị nara okwu ọnụ m nile, ọ bụrụkwa na i zobe ihe nile m nyere n’iwu n’ebe ị nọ; mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ezi omume na ikpe, na izi ezi nile, ee, ezi ụzọ ọ bụla.”—Ilu 2:1, 9.

Ụzọ nke Ezi Omume

Malite na Mosis gbadaa ruo Jisọs, e jikọtara ime ezi omume na irube isi n’ihe ndị Chineke nyere n’iwu dị ka e depụtara ha n’Iwu Mosis ahụ. Ebe ndị Israel ahụ na-ezughị okè na-enweghị ike izere imebi iwu ndị a, ọ dịrị mkpa ka ha na-achụ àjà, na-enyekwa onyinye mgbaghara mmehie dị ka Iwu ahụ si chọọ n’aka ha ka e wee kpuchie ikpe ọmụma ha. Mosis gwara ụmụ Israel, sị: “Ezi omume ka ọ ga-abụkwara anyị, mgbe anyị ga-elezi anya ime ihe a nile e nyere n’iwu n’ihu Jehova, bụ́ Chineke anyị, dị ka o nyere anyị iwu.”—Deuterọnọmi 6:25.

Ruo ọtụtụ narị afọ, ọ dịghị onye debesịrị Iwu ahụ n’ụzọ zuru okè. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị ji obi eziokwu nwaa ịgbaso ezi omume site na ya, Bible na-ekwukwa okwu banyere ụfọdụ n’ime ndị a dị ka ndị ezi omume. Dị ka ihe atụ, a kọwara ndị mụrụ Jọn Onye na-eme baptism dị ka ndị “bụ ndị ezi omume n’ihu Chineke, na-aga n’ihe nile [Jehova, NW] nyere n’iwu na ihe nile ọ gụrụ n’ihe ziri ezi n’adịghị ịta ụta.”—Luk 1:6.

Otú ọ dị, Jisọs meghere ụzọ ọhụrụ a ga-esi gbasoo ezi omume. O debere Iwu Mosis ahụ n’ụzọ zuru okè—nanị onye meworo otú ahụ mgbe ọ bụla. Jisọs nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ, Jehova nakwerekwara uru nke ndụ ya zuru okè dị ka ihe mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ. Malite mgbe ahụ gaa n’ihu, àjà nile a na-achụ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ adịkwaghị mkpa ọzọ. Àjà zuru okè nke Jisọs kpuchiri mmehie nke ụmụ mmadụ nile obi ha ziri ezi.—Ndị Hibru 10:4, 12.

A Gụrụ Ezi Ndị Kraịst ná Ndị Ezi Omume

Ya mere, kemgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs, e jikọtawo ezi omume na itinye okwukwe ’n’Ọkpara Chineke nke a bụ onye ezi omume. (Jọn 3:16) Ọ bụ ezie na ndị na-agbaso usoro ndị Juu nke oge Pọl erughị ọ̀tụ̀tụ̀ ezi omume n’ihi na ha jụrụ ezi ihe ọmụma banyere Jisọs, anyị na-agụ banyere ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “A na-ewerekwa amara ya na-agụ ha ná ndị ezi omume n’onyinye efu site ná mgbapụta ahụ nke dị n’ime Kraịst Jisọs.”—Ndị Rom 3:24.

N’ọnọdụ okwu ahụ, okwu ndị a metụtara ndị Kraịst e tere mmanụ kpọmkwem, bụ́ ndị, n’ihi okwukwe ha nwere n’àjà Jisọs, a gụworo ná ndị ezi omume ná nzube nke ha ịbụ ndị ha na Kraịst ga-eketakọ Alaeze eluigwe ahụ. Otú ọ dị, taa, dị ka Jọn onyeozi buru ụzọ hụ, oké ìgwè ndị Kraịst ndị nwere olileanya elu ala apụtawo ìhè. Ndị a na-etinyekwa okwukwe n’àjà mgbapụta ahụ. Ha ‘na-asa uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ,’ wee sikwa otú a bụrụ ndị a gụrụ ná ndị ezi omume dị ka ndị enyi Chineke, ná nzube nke ha ịdị ndụ gabiga oké mkpagbu ahụ.—Mkpughe 7:9, 14; tụlee Jemes 2:21-26.

Nọgide Na-agbaso Ezi Omume

Ma, rịba ama na mgbaso nke ezi omume adịghị agwụsị site n’itinye okwukwe na Jisọs. Timoti abụwo onye Kraịst e tere mmanụ raara onwe ya nye ruo ọtụtụ afọ mgbe Pọl degaara ya okwu ndị a sonụ: “Na-agbaso ezi omume, nsọpụrụ Chineke, okwukwe, ịhụnanya, ntachi obi, ịdị nwayọọ. Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe ike.” (1 Timoti 6:11, 12; 2 Timoti 2:22) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka Timoti “na-agbaso ezi omume” ma ọ bụrụ na Chineke agụworịị ya n’onye ezi omume?

N’ihi na okwu ahụ bụ “ezi omume” bụkwa nke e ji mee ihe na Bible n’ụzọ sara mbara karị iji zoo aka n’onye na-adị ndụ nke ime ihe n’eziokwu, ime omume ọma na onye na-eme ihe nile ọ pụrụ ime iji rube isi n’ihe ndị Chineke nyere n’iwu. Ọ bụ n’echiche nke a ka ndị mụrụ Jọn Onye na-eme baptism bụ ndị ezi omume. (Luk 1:6) Onye ahụ nọ dị ka nna Jisọs, bụ́ Josef, na Josef onye Arimatia, bụkwa ndị ezi omume n’ụzọ dị otú a. (Matiu 1:19; Luk 23:50) Eziokwu ahụ nke bụ na a gụwo ndị Kraịst ná ndị ezi omume adịghị ewepụ ibu ọrụ ha nke ịgbaso ezi omume n’echiche nke a. N’eziokwu, onye Kraịst ọ bụla nke kwụsịrị ibi ndụ nke ime ihe n’eziokwu, ime omume ọma, ma ọ bụ kwụsị irube isi n’ihe ndị Chineke nyere n’iwu, ga-atụfu ọnọdụ ezi omume ya n’ihu Jehova.

Ịgbaso Ezi Omume—Ihe Ịma Aka

Ịgbaso ezi omume bụ ihe ịma aka. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị nile bụ ndị na-ezughị okè, anyị nwekwara mkpalị siri ike ime ajọ omume. (Jenesis 8:21; Ndị Rom 7:21-23) Karịsịa, anyị na-ebi n’ime ụwa nke na-agba ume echiche na ihe omume dị iche iche nke ajọ omume, nke nọkwa n’okpuru nchịkwa nke Setan bụ Ekwensu, bụ́ “ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19; 2 Ndị Kọrint 4:4) Ka a sịkwa ihe mere na mgbe ọ na-edegara Timoti akwụkwọ, Pọl jikọtara ịgbaso ezi omume na ‘ịgba mgba ọma nke okwukwe ahụ’!—1 Timoti 6:11, 12.

Ànyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma na “mgba ọma” nke a? Ee, ma ọ bụ nanị ma anyị wulite ịhụnanya sitere n’ala ala obi maka ụkpụrụ nile nke Jehova na ịkpọasị n’ebe ihe ọjọọ dị. Bible kwuru banyere Jisọs, sị: “Ị hụrụ ezi omume n’anya, wee kpọọ mmebi iwu asị.” (Ndị Hibru 1:9) Anyị kwesịrị inwe otu àgwà ahụ: ọchịchọ siri ike iwulite ịhụnanya maka ihe na-atọ Chineke ụtọ na ịkpọasị n’ebe ihe ọ bụla na-adịghị amasị ya dị.

N’otu mgbe ahụ, anyị kwesịrị icheta na mgbaso nke ezi omume abụghị ịsọ mpì. Ọ bụrụ na anyị elee onwe anyị anya dị ka ndị dị mma karịa ụfọdụ ndị ọzọ, ma ọ bụ ọ bụrụ na anyị enwee mpako maka ezi omume nke onwe anyị, mgbe ahụ, anyị yiri ndị Juu ahụ bụ ndị Farisii. (Matiu 6:1-4) Ndị ahụ na-enwe ihe ịga nke ọma n’ịgbaso ezi omume na-eji obi umeala na-ele onwe ha anya n’ụzọ ziri ezi, ‘na-agụ ndị ọzọ ná ndị ka ha onwe ha mma.’—Ndị Filipaị 2:3.

Pọl mere ka mkpa ọmụmụ Bible dị n’ịgbaso ezi omume pụta ìhè mgbe o dere, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’Akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume.” (2 Timoti 3:16) Ọ bụrụ na anyị na-amụ Bible, na-ejekwa nzukọ dị iche iche nke ndị Kraịst ebe a na-atụle Bible, a ga-enye anyị ọzụzụ n’ezi omume. Bible pụrụ ịkpụzi anyị ka anyị wee yikwasị ‘mmadụ ọhụrụ ahụ, nke e kere n’ime ezi omume na n’iguzosi ike n’ihe.’—Ndị Efesọs 4:24.

Mgbe ezị omume ghọrọ akụkụ gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’ime anyị, anyị ga-akpọ mmebi iwu asị n’ezie. A gaghị anwa anyị ịchọ ajọ ndị enyi nke ụwa nke a. (1 Ndị Kọrint 15:33) A gaghị akpali anyị ịhụ ihe nke ụwa nke a n’anya ma ọ bụ ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ọchịchọ ihe onwunwe nke ụwa nke a. (Ilu 16:8; 1 Timoti 6:9, 10; 1 Jọn 2: 15-17) N’eziokwu, anyị agaghị abụ ndị a dọọrọ gaa n’ihe ntụrụndụ ya ndị na-egosi omume na-adịghị ọcha na ime ihe ike, ndị jupụtara ebe nile taa.—Ndị Efesọs 5:3, 4.

Ngọzi Nile nke Ezi Omume

Ee, ịgbaso ezi omume n’ụzọ nke Jehova bụ ihe ịma aka, ma mgbalị e mere maka ya kwesịrị ekwesị. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ na-eduje n’anyị inweta mmekọrịta onwe onye nke anyị na Jehova n’onwe ya. Lee nnọọ ihe ùgwù pụrụ iche ọ bụ! Bible na-agwa anyị, sị: “Ebe obibi ndị ezi omume ka [Jehova] na-agọzi.” “Jehova dị anya n’ebe ndị na-emebi iwu nọ: ma ekpere ndị ezi omume ka ọ na-anụ.” (Ilu 3:33; 15:29) Tụkwasị na nke a, anyị na-enwe nghọta dị omimi nke nzube nile nke Jehova. “Okporo ụzọ ndị ezị omume dị ka ìhè na-enwu enwu, nke na-amụ aga n’ihu n’ihu ruo mgbe chi bọchara.”—Ilu 4:18.

Bible kwere nkwa na a ga-echebe ndị nile na-achọ ezi omume mgbe usoro ihe ajọ omume nke a ga-abịaru ná njedebe ya. “Chọọnụ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa, ndị rụworo ihe o kpere n’ikpe; chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.” (Zefanaịa 2:3) Mgbe nke ahụ gasịrị, nye ndị ahụ nwere olileanya elu ala, Bible na-enye ha ihe dị ebube n’ezie ha ga-atụ anya ya, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Oma 37:29.

Lee nnọọ ihe ndị dị ebube mere a ga-eji gbasoo ezi omume! Dị ka Chineke n’onwe ya kwuru: “Onye na-agbaso ezi omume na ebere na-achọta ndụ, na ezi omume, na nsọpụrụ.”—Ilu 21:21.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya