AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ HIBRU 4-6
Mee Ike Gị Niile Iji Banye n’Izu Ike Chineke
Anyị nwere ike ịbanye n’izu ike Jehova. Ihe ga-enyere anyị aka ime ya bụ ịna-akwado ihe ọ bụla o si n’aka ọgbakọ ya na-agwa anyị. Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Olee otú m si akpa àgwà ma e nye m ndụmọdụ? Olee otú m si akpa àgwà ma a gbanwee otú anyị sibu akọwa otu ihe dị na Baịbụl?’
Olee ihe ụfọdụ na-eme ná ndụ m nke na-eme ka a mata ma m̀ na-erubekwara Jehova isi?