Gịnị Ka Enyo ahụ Na-ekpughe?
LEE anya n’enyo. Gịnị ka ị na-ahụ? Mgbe ụfọdụ, iletụ anya n’enyo na-ekpughe ntụpọ na-emechu ihu n’ọdịdị gị bụ́ nke ị na-enwe obi ụtọ imezi tupu ndị ọzọ ahụta ya.
Bible dị nnọọ ka enyo. Ọ pụrụ inyere anyị aka ịhụ onwe anyị otú anyị dị n’ezie, bụ́ nke ga-egbochi anyị iche echiche gafere ókè—ma ọ bụ dị ala karị—banyere uru anyị bara n’anya Chineke. (Matiu 10:29-31; Ndị Rom 12:3) Ọzọkwa, Bible pụrụ ikpughe ntụpọ n’okwu, omume, na àgwà anyị nke dị mkpa ka anyị dozie. Mgbe nke a mere, ị̀ ga-eleghara ihe enyo ahụ kpughere anya?
Jemes so dee Bible na-asị: “A sị na onye ọ bụla bụ onye na-anụ okwu ahụ, ma ọ bụghị onye na-eme ya, onye ahụ yiri nwoke nke na-ekiri ihu ya n’enyo, bụ́ ihu o nwere mgbe a mụpụtara ya: n’ihi na o kiriri onwe ya, ọ pụwokwa, ngwa ngwa o wee chezọọ aha mmadụ ọ bụ.”—Jemes 1:23, 24.
N’ụzọ dị iche, Jemes na-akọwa nwoke ọzọ, bụ́ onye “nyochaworo n’ime iwu zuru okè, bụ́ iwu nke inwe onwe ya, nke na-anọgidekwa otú a.” (Jemes 1:25) Okwu Grik a sụgharịrị “nyochaworo” pụtara ịtụkwuru n’akụkụ ma ọ bụ ihula ihu iji kirie ihe. “Ọ gụnyere ihe karịrị nanị ilepere ihe anya,” ka akwụkwọ bụ́ Theological Dictionary of the New Testament na-asị. Okwu ahụ na-enye echiche nke ọchịchọ e ji nlezianya na-achọ ihe zoro ezo. “Ọ dị ihe dị mkpa nke onye ahụ na-ekiri ihe chọrọ ịhụ, ọ bụ ezie na ọ pụrụ isiri ya ike ịhụ ya ma ghọta ihe ọ pụtara ozugbo,” ka onye na-akọwa Bible bụ́ R. V. G. Tasker dere.
Ị̀ ga-esi otú ahụ nyochaa onwe gị n’enyo nke Okwu Chineke ma kwekọzie n’ihe ọ chọrọ gị n’aka? Jemes gara n’ihu, sị: “[Nwoke a nke na-aghọghị] onye na-anụ anụ nke na-echezọ, kama ọ bụ onye na-eme eme nke na-arụ ọrụ, onye a ga-abụ onye ngọzi n’omume ya.”—Jemes 1:25.