Ọ̀ Dịtụwo Mgbe Ị Mụnyere Oké Ọhịa Ọkụ?
Ọ DỊGHỊ MA ỌLỊ, ka i kwuru. Ma chere! Eleghị anya i mewo otú ahụ. Gee ntị n’okwu Jemes onye na-eso ụzọ: “Ire bụkwa ihe nta dị n’ahụ, ọ na-anyakwa isi oké ihe. Lee, otú oké ọhịa hà ukwuu, bụ́ nke ọkụ dịkarịsịrị nta na-eme ka o nwuru ọkụ!”—Jemes 3:5.
Ire bụ akụkụ ahụ dị mkpa maka ikwu okwu, ma lee ka e siworo jiri ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi! Ndị mmadụ na-eji ire ekwu okwu ụgha na okwu nkwutọ. Ha na-eji ya akatọ ndị ọzọ n’ụzọ dị njọ, mebie ezi aha ha, ma ghọgbuo ha. Ndị na-arakọta ndị mmadụ na-eji ire akpali nnupụisi. Adolf Hitler ji nke ya mee ihe ịchịkọta otu mba ọnụ ma kpalie ha maka agha—‘oké ọhịa ịgba ọkụ’ n’ezie!
Ọbụna ndị nwere ebumnuche dị mma pụrụ ịkpali ‘oké ọhịa ịgba ọkụ’ nke nta. Ọ̀ dịwo mgbe i kwuru ihe ma mesịa ozugbo ahụ nwee mmasị ikwugharị ya? Ya bụrụ otú ahụ, ị ghọtara ihe Jemes bu n’uche mgbe ọ sịrị: “Ọ dịghị onye ọ bụla n’etiti mmadụ pụrụ imeju ire anya.”—Jemes 3:8.
Otú o sina dị, anyị pụrụ ịgbalị iji ire anyị mee ihe dị mma. Dị ka onye ọbụ abụ ahụ, anyị pụrụ iji mkpebisi ike kwuo, sị: “Ka m lezie ụzọ m nile anya, ka m wee ghara iwere ire m mehie.” (Abụ Ọma 39:1) Kama ịkatọ ndị ọzọ n’ụzọ dị njọ, anyị pụrụ ịgbalị iwuli ha elu. Kama ikwutọ ndị mmadụ, anyị pụrụ ikwu ihe dị mma banyere ha. Kama ịghọgbu na ịghọ aghụghọ, anyị pụrụ ikwu eziokwu ma nye ntụziaka. Mgbe ezi obi kpaliri ya, ire pụrụ ikwu okwu ndị mara mma ndị na-agwọ ọrịa. Jisọs ji ire ya mee ihe n’ụzọ dị ebube ịkụziri ihe a kpọrọ mmadụ banyere nzọpụta.
N’ezie, “ọnwụ na ndụ dị ire n’aka.” (Ilu 18:21) Ire gị ọ̀ bụ nke na-akpata ọnwụ ka ọ̀ bụ nke na-enye ndụ? Ọ̀ na-akpali ‘oké ọhịa ịgba ọkụ’ ka ọ̀ na-emenyụ ya? Onye ọbụ abụ ahụ kpegaara Chineke ekpere, sị: “Ka ire m bụọ abụ banyere okwu ọnụ gị; n’ihi na ihe nile i nyere n’iwu bụ ezi omume.” (Abụ Ọma 119:172) Ọ bụrụ na anyị azụlite àgwà onye ọbụ abụ ahụ, anyị onwe anyị ga-eji ire anyị mee ihe dị mma.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]
Foto U.S. Forest Service