Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 8/15 p. 20-24
  • Kpachara Anya Maka Ọnyà Ekwensu!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kpachara Anya Maka Ọnyà Ekwensu!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • KWỤSỊ IKWU OKWU N’ECHEGHỊ ECHICHE
  • EKWELA KA EGWU NA ỊSỌ MMADỤ ANYA MEE KA Ị MA N’ỌNYÀ
  • ZERE ỌNYÀ NKE NA-EGBU MMỤỌ, YA BỤ, INWEBIGA MWUTE ÓKÈ
  • ANYỊ MA ATỤMATỤ SETAN
  • Ị Ga-esili n’Ọnyà Setan Pụta
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • “Na-eguzogidenụ Ekwensu” Dị Ka Jizọs Mere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • “Na-eguzogidenụ Ekwensu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Guzogide Setan, Ọ Ga-agbapụkwa!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 8/15 p. 20-24

Kpachara Anya Maka Ọnyà Ekwensu!

“Si n’ọnyà Ekwensu pụọ.” —2 TIM. 2:26.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

Olee otú anyị kwesịrị isi nyochaa onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị na-akatọkarị ndị ọzọ?

Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’ihe Paịlet na Pita mere banyere ịsọ mmadụ anya na ịtụ egwu mmadụ?

Olee otú i nwere ike isi zere inwebiga mwute ókè?

1, 2. Olee ọnyà ndị Ekwensu na-esi, bụ́ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

EKWENSU na-agbalịsi ike ijide ndị ohu Jehova. Ihe o bu n’obi abụchaghị igbu ha otú ahụ dinta na-eme anụ. Kama, ihe Ekwensu bu n’obi bụ ijide mmadụ ná ndụ ma jiri onye ahụ mee ihe masịrị ya.—Gụọ 2 Timoti 2:24-26.

2 Onye na-esi ọnyà nwere ike isi ụdị ọnyà dị iche iche ga-amata anụ. O nwere ike ịgbalị ime ka anụ zoro ezo pụta ka ọ dịrị ya mfe iji ọnyà waya jide ya. O nwekwara ike izo ọnyà o siri ezo ka anụ ahụ ghara ịhụ ya. Ekwensu na-eji ụdị ọnyà ndị ahụ ejide ndị ohu Chineke. Ọ bụrụ na anyị achọghị ka o jide anyị, anyị kwesịrị ịkpachara anya ma gee ntị n’ịdọ aka ná ntị ndị ga-enyere anyị aka ịmata ebe Setan siri ọnyà. N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú anyị nwere ike isi zere ọnyà atọ Ekwensu jirila jide ụfọdụ ndị ohu Chineke. Ọnyà ndị ahụ bụ (1) ikwu okwu n’echeghị echiche, (2) egwu na ịsọ mmadụ anya, na (3) inwebiga mwute ókè. N’isiokwu na-eso ya, anyị ga-atụle ọnyà abụọ ndị ọzọ Setan na-esi.

KWỤSỊ IKWU OKWU N’ECHEGHỊ ECHICHE

3, 4. Ọ bụrụ na anyị anaghị ejide ire anyị aka, olee nsogbu o nwere ike ịkpata? Nye ihe atụ.

3 Ọ bụrụ na dinta chọrọ ime ka anụ si n’ọhịa ebe o zoro gbapụta, o nwere ike isunye ọhịa ahụ ọkụ ma na-ejide anụ ọ bụla si ebe ahụ gbapụta. E nwere ike ikwu na Ekwensu chọrọ isunye ọkụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. O mee otú ahụ, o nwere ike ime ka Ndị Kraịst si n’ọgbakọ gbapụ ma banye n’aka ya. Olee otú anyị nwere ike isi dụnyere ya úkwù n’amaghị ama, ya amatakwa anyị n’ọnyà?

4 Jems, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, ji ire tụnyere ọkụ. (Gụọ Jems 3:6-8.) Ọ bụrụ na anyị ejideghị ire anyị aka, anyị nwere ike iji ya sunye ọkụ n’ọgbakọ. Olee otú ụdị ihe ahụ nwere ike isi mee? Chegodị banyere ihe atụ a: N’ọmụmụ ihe ọgbakọ, a mara ọkwa na otu nwanna nwaanyị aghọọla ọsụ ụzọ oge niile. Mgbe a gbasara, ndị nkwusa abụọ nọ na-ekwurịta banyere ọkwa ahụ a mara. Otu kwuru na obi dị ya ụtọ nakwa na ya bu n’obi na ihe ga-agaziri ọsụ ụzọ ọhụrụ ahụ. Onye nke ọzọ ekwetaghị na ọsụ ụzọ ahụ bu ezigbo ihe n’obi. O kwukwara na ọsụ ụzọ ahụ chọrọ ka a na-anụ aha ya n’ọgbakọ. N’ime ndị nkwusa abụọ ahụ, olee onye nke ị ga-achọ ka ọ bụrụ enyi gị? A naghị ajụ ajụ onye nke chọrọ iji ire ya sunye ọkụ n’ọgbakọ.

5. Gịnị ka anyị kwesịrị ichebara echiche iji kwụsị ịna-ekwu okwu n’echeghị echiche?

5 Olee otú anyị nwere ike isi kwụsị ikwu okwu n’echeghị echiche? Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụ ihe jupụtara mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.” (Mat. 12:34) N’ihi ya, ihe mbụ anyị kwesịrị ime bụ inyocha obi anyị. Ànyị na-ewepụ echiche ọjọọ ndị nwere ike ime ka anyị kwuo ihe ọjọọ banyere ndị ọzọ? Dị ka ihe atụ, anyị nụ na nwanna na-agbalịsi ike inwetakwu ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ, ànyị na-eche ozugbo na o bu ihe ọma n’obi, ka ànyị na-enyo ya enyo na ọ chọrọ ka a na-anụ aha ya? Ọ bụrụ na anyị na-echekarị na ụmụnna anyị bu ihe ọjọọ n’obi na-efe Jehova, anyị kwesịrị icheta na ọ bụkwa ụdị ihe ahụ ka Ekwensu kwuru banyere Job, bụ́ onye ji obi ya niile na-efe Chineke. (Job 1:9-11) Kama inyo nwanna anyị enyo, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ihe mere anyị ji akatọ ya. È nwere ezi ihe mere anyị ga-eji na-enyo ya enyo? Ka obi ọjọọ juru ebe niile n’oge ikpeazụ a ò meela ka anyị kpọọ nwanna anyị asị?—2 Tim. 3:1-4.

6, 7. (a) Olee ihe ụfọdụ nwere ike ime ka anyị katọwa ndị ọzọ? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma e kwujọọ anyị?

6 Chegodị ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka anyị na-akatọ ndị ọzọ. Otu n’ime ha nwere ike ịbụ na anyị chọrọ ka ndị ọzọ na-ahụkarị ihe anyị mere. Anyị katọwa ndị ọzọ, o nwere ike ịbụ na anyị na-achọ igosi na anyị ka onye ọ bụla mma. O nwekwara ike ịbụ na anyị na-agbalị ịkọwa ihe mere anyị ji hapụ ihe anyị kwesịrị ime. Ma ihe mere anyị ji akatọ ndị ọzọ ọ̀ bụ mpako, anyaụfụ, ma ọ bụ na obi esighị anyị ike, ọ ga-akpatara anyị nsogbu.

7 Anyị nwere ike iche na e nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji katọọ mmadụ. Ma eleghị anya, onye ahụ agwala anyị okwu n’echeghị echiche. Ọ bụrụ otú ahụ, imegwara onye ahụ ihe o mere anyị adịghị mma. Ime otú ahụ ga-eme ka nsogbu ahụ ka njọ. Ọ bụkwa ime uche Ekwensu, ọ bụghị nke Chineke. (2 Tim. 2:26) Anyị kwesịrị iṅomi Jizọs. Mgbe a na-ekwujọ ya, “ọ dịghị ekwujọgwara.” Kama, “ọ nọ na-enyefe onwe ya n’aka onye ahụ nke na-ekpe ikpe ziri ezi.” (1 Pita 2:21-23) Obi siri Jizọs ike na Jehova ga-eme ihe o kwesịrị ime n’oge ya nakwa otú ọ chọrọ. Anyị kwesịrị ịtụkwasị Chineke obi otú ahụ. Ọ bụrụ na anyị na-ekwu ihe na-agba ndị ọzọ ume, anyị so eme ka ‘ihe nkekọ nke bụ́ udo’ dịrị n’ọgbakọ anyị.—Gụọ Ndị Efesọs 4:1-3.

EKWELA KA EGWU NA ỊSỌ MMADỤ ANYA MEE KA Ị MA N’ỌNYÀ

8, 9. Gịnị mere Paịlet ji maa Jizọs ikpe ọnwụ?

8 Anụ ọnyà mara anaghị aga ebe ọ chọrọ ịga. Otú ahụ ka onye na-atụ egwu mmadụ ma ọ bụ na-asọ mmadụ anya na-anaghị enwe ike ime ihe ọ chọrọ ime. (Gụọ Ilu 29:25.) E nwere ụmụ nwoke abụọ tụrụ egwu ma sọọ mmadụ anya. Ka anyị tụlee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe ha mere.

9 Gọvanọ ndị Rom bụ́ Pọntiọs Paịlet ma na aka Jizọs dị ọcha. N’ihi ya, ọ chọghị ime ya ihe ọ bụla. N’eziokwu, Paịlet kwuru na Jizọs emeghị “ihe kwesịrị ọnwụ.” Ma, Paịlet mechara maa Jizọs ikpe ọnwụ. N’ihi gịnị? N’ihi na Paịlet sọrọ ndị mmadụ anya. (Luk 23:15, 21-25) Mgbe ndị ahụ na-emegide Jizọs na-agbalị ime ka Paịlet mee ihe ha chọrọ, ha tiri mkpu, sị: “Ọ bụrụ na ị hapụ nwoke a, ị bụghị enyi Siza.” (Jọn 19:12) O nwere ike ịbụ na egwu tụrụ Paịlet na a ga-anapụ ya ọkwá ya ma ọ bụ gbuo ya ma ọ bụrụ na ya ahapụ Kraịst. N’ihi ya, egwu mere ka o mee ihe Ekwensu chọrọ.

10. Gịnị mere Pita ji gọnahụ Kraịst?

10 Pita onyeozi so ná ndị bụ́ ezigbo enyi Jizọs. Egwu atụghị ya ikwu hoo haa na Jizọs bụ Mesaya. (Mat. 16:16) Mgbe ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs hapụrụ Jizọs n’ihi na ha aghọtaghị ihe o kwuru, Pita ahapụghị ya. (Jọn 6:66-69) Mgbe ndị iro bịakwara ijide Jizọs, Pita ji mma agha gbalịa ichebe ya. (Jọn 18:10, 11) Ma mgbe e mechara, Pita tụrụ ndị mmadụ egwu ma gọnahụ Jizọs Kraịst. Onyeozi ahụ tụrụ ndị mmadụ egwu, nke mere ka ọ ghara ịkata obi mee ihe o kwesịrị ime.—Mat. 26:74, 75.

11. Olee ndị nwere ike inye anyị nsogbu ka anyị mee ihe ọjọọ?

11 Anyị bụ́ Ndị Kraịst ekwesịghị ịsọ mmadụ anya ma mee ihe na-agaghị adị Chineke mma. Ndị anyị na-arụrụ ọrụ ma ọ bụ ndị ọzọ nwere ike ịgbalị ime ka anyị ghaa ụgha ma ọ bụ kwaa iko. E nwere ike inwe Ndị Kraịst bụ́ ụmụ akwụkwọ ndị ụmụaka ibe ha na-agbalị ime ka ha ghọọ aghụghọ n’ule, lee ndị gba ọtọ, ṅụọ sịga, ṅụọ ọgwụ ọjọọ, ma ọ bụ kwaa iko. N’ihi ya, gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ikwe ka egwu na ịsọ mmadụ anya mee ka anyị mee ihe na-adịghị Jehova mma?

12. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Paịlet na Pita mere?

12 Ka anyị tụlee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’ihe Paịlet na Pita mere. Paịlet amachaghị banyere Kraịst. Ma, ọ ma na aka Jizọs dị ọcha nakwa na Jizọs abụghị mmadụ nkịtị. Ma, Paịlet adịghị umeala n’obi, ọ hụghịkwa ezi Chineke n’anya. N’ihi ya, ọ dịịrị Ekwensu mfe ịnwụde ya ná ndụ. Pita hụrụ Chineke n’anya, marakwa eziokwu banyere Chineke na Jizọs Kraịst. Ma, mgbe ụfọdụ, o mere ihe gosiri na ọ dịghị umeala n’obi, ọ tụrụ egwu, sọọkwa mmadụ anya. Tupu e jide Jizọs, Pita turu ọnụ, sị: “Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ niile asụọ ngọngọ, agaghị m asụ ngọngọ.” (Mak 14:29) A sị na Pita tụkwasịrị Chineke obi otú ọbụ abụ mere, ọ gaara enwe ike imeri ọnwụnwa ahụ bịaara ya. Ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Jehova nọnyeere m; agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?” (Ọma 118:6) N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, ọ kpọọrọ Pita na ndịozi ya abụọ ọzọ gaa n’ogige Getsemeni. Kama ịmụrụ anya, Pita na ndịozi ibe ya hiwere ụra. Jizọs kpọtere ha, sị ha: “Na-echenụ nche, na-ekpekwanụ ekpere, ka unu wee ghara ịbanye n’ọnwụnwa.” (Mak 14:38) Ma ụra buuru Pita ọzọ, ya emechaa tụọ egwu, sọọkwa mmadụ anya.

13. Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ka anyị ghara ịsọ mmadụ anya ma mee ihe ọjọọ?

13 Ihe ọzọ anyị nwere ike ịmụta n’ihe Paịlet na Pita mere bụ: Ọ bụrụ na anyị achọghị ka egwu mmadụ ma ọ bụ ịsọ mmadụ anya mee ka anyị mee ihe ọjọọ, anyị kwesịrị ịma Chineke nke ọma ma hụ ya n’anya, dị umeala n’obi, na-atụ egwu Jehova, ọ bụghị egwu mmadụ. Ọ bụrụ na okwukwe anyị siri ike n’ihi na anyị ma Chineke nke ọma, anyị ga-eji obi ike na-agwa ndị ọzọ ihe anyị kweere. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịtụ egwu ma ọ bụ sọọ mmadụ anya. N’eziokwu, anyị ekwesịghị iche na anyị siri ike karịa otú anyị siri. Kama iche otú ahụ, anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma ghọta na ọ bụ ike Chineke ga-eme ka anyị ghara ịsọ mmadụ anya. Anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ya, kwekwa ka ịhụnanya anyị mee ka anyị na-asọpụrụ aha ya ma na-edebe iwu ya. Anyị kwesịkwara ibu ụzọ jikere ejikere mgbe ọnwụnwa na-abịabeghị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere ma kwadebe ụmụ anyị, ọ ga-enyere ha aka ịma ihe ha kwesịrị ime mgbe ụmụaka ibe ha na-agbalị ime ka ha mee ihe ọjọọ.—2 Kọr. 13:7.a

ZERE ỌNYÀ NKE NA-EGBU MMỤỌ, YA BỤ, INWEBIGA MWUTE ÓKÈ

14. Gịnị ka Ekwensu chọrọ ka anyị chee banyere ihe anyị mejọrọ n’oge gara aga?

14 Mgbe ụfọdụ, ọnyà a na-esiri anụ bụ igbudu, nke bụ́ ogwe osisi ma ọ bụ nkume dị arọ e ji sie ọnyà n’ebe anụ na-esikarị agafe. Anụ na-elerughị anya tatụ ihe e ji sie ọnyà ahụ, osisi ahụ ma ọ bụ nkume ahụ adagide ya. E nwere ike iji inwebiga mwute ókè tụnyere osisi ahụ ma ọ bụ nkume ahụ dị arọ nke na-adagbu anụ. Anyị cheta ihe anyị mejọrọ n’oge gara aga, o nwere ike ‘igbu mmụọ anyị nke ukwuu.’ (Gụọ Abụ Ọma 38:3-5, 8.) Setan chọrọ ka anyị chee na Jehova enweghị ike imere anyị ebere nakwa na anyị agaghị emeli ihe Chineke chọrọ.

15, 16. Olee otú i nwere ike isi zere ọnyà nke bụ́ inwebiga mwute ókè?

15 Olee otú ị ga-esi zere ọnyà a nke na-egbu mmụọ? Ọ bụrụ na i mere mmehie dị oké njọ, mee ka gị na Jehova dị ná mma ozugbo. Gakwuru ndị okenye, gwa ha ka ha nyere gị aka. (Jems 5:14-16) Gbalịsie ike ka i mezie ihe i mebiri. (2 Kọr. 7:11) A dọọ gị aka ná ntị, adala mbà. Ịdọ aka ná ntị bụ otú Jehova si egosi na ọ hụrụ gị n’anya. (Hib. 12:6) Kpebisie ike na ị gaghị emeghachi ihe mere ka i mee mmehie. Nọsie ike n’ihe ahụ i kpebiri. I chegharịa ma chigharịa, nwee okwukwe na àjà mgbapụta ahụ Jizọs Kraịst chụrụ ekpuchiela mmehie gị.—1 Jọn 4:9, 14.

16 Obi ka na-ama ụfọdụ ndị ikpe n’ihi mmehie ha mere, nke Chineke gbaghakwaara ha. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, cheta na Jehova gbaghaara Pita na ndịozi ndị ọzọ n’agbanyeghị na ha hapụrụ Jizọs, bụ́ Ọkpara ọ hụrụ n’anya, mgbe ha kwesịrị inyere ya aka. Jehova gbaghakwaara nwoke ahụ a chụrụ n’ọgbakọ na Kọrịnt n’ihi na ọ kwara iko jọgburu onwe ya ma mechaa chegharịa. (1 Kọr. 5:1-5; 2 Kọr. 2:6-8) Baịbụl kwuru banyere ndị mere mmehie dị oké njọ ma Chineke agbaghara ha n’ihi na ha chegharịrị.—2 Ihe 33:2, 10-13; 1 Kọr. 6:9-11.

17. Gịnị ka ihe mgbapụta ahụ nwere ike imere anyị?

17 Jehova ga-agbaghara gị, chefuokwa mmehie i mere n’oge gara aga ma ọ bụrụ na i chegharịa n’eziokwu, kwerekwa na ọ ga-emere gị ebere. Echela na àjà mgbapụta ahụ Jizọs chụrụ agaghị ekpuchili mmehie gị. I chee otú ahụ, ọ pụtara na otu ọnyà Setan amala gị. N’agbanyeghị ihe Ekwensu chọrọ ka i kweta, ihe mgbapụta ahụ nwere ike ikpuchi mmehie ndị niile mere mmehie ma chegharịa. (Ilu 24:16) Inwe okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ nwere ike ime ka obi kwụsị ịna-ama gị ikpe, meekwa ka i nwee ike iji obi gị niile, uche gị niile, na mkpụrụ obi gị niile na-ejere Chineke ozi.—Mat. 22:37.

ANYỊ MA ATỤMATỤ SETAN

18. Olee otú anyị nwere ike isi zere ọnyà Ekwensu?

18 Setan achọghị ịma ọnyà nke mara anyị. Ihe dị ya mkpa bụ ka e nwee nke ga-ama anyị. Ebe ọ bụ na anyị ma atụmatụ Setan, anyị ekwesịghị ikwe ka ọ ghọgbuo anyị. (2 Kọr. 2:10, 11) Ọnyà ya agaghị ama anyị ma ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere ka Chineke nye anyị amamihe anyị ga-eji merie ọnwụnwa ndị na-abịara anyị. Jems dere, sị: “Ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla n’ime unu amamihe kọrọ, ka ọ na-arịọ Chineke, n’ihi na ọ na-eji mmesapụ aka enye mmadụ niile ihe, n’akọchaghịkwa ha; ọ ga-enye onye ahụ amamihe.” (Jems 1:5) Anyị kwesịrị ịna-eme ihe anyị na-ekpe n’ekpere. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-amụchi ihe anya na ime ihe anyị mụtara n’Okwu Chineke. Akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, bụ́ ndị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, na-ebipụta, na-eme ka anyị mata ọnyà ndị Ekwensu na-esi, nyekwara anyị aka izere ha.

19, 20. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpọ ihe ọjọọ asị?

19 Ikpe ekpere na ịmụ Baịbụl na-enyere anyị aka ịhụ ezi ihe n’anya. Ma, ọ dịkwa mkpa ka anyị mụta ịkpọ ihe ọjọọ asị. (Ọma 97:10) Ọ bụrụ na anyị na-atụgharị uche ná nsogbu mmehie ga-akpatara anyị, ọ ga-eme ka anyị zere ya. (Jems 1:14, 15) Ọ bụrụ na anyị amụta ịkpọ ihe ọjọọ asị ma hụ ezi ihe n’anya, ihe Setan chọrọ iji rata anyị n’ọnyà ya ga na-asọ anyị oyi; ọ gaghị arata anyị.

20 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Chineke na-enyere anyị aka ka Setan ghara ịghọgbu anyị! Jehova ji mmụọ nsọ ya, Okwu ya, na nzukọ ya na-anapụta anyị “n’aka ajọ onye ahụ.” (Mat. 6:13) N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-amụta otú anyị ga-esi zere ọnyà abụọ ndị ọzọ Ekwensu na-ejikarị ejide ndị ohu Chineke ná ndụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ndị nne na nna na ụmụ ha kwesịrị ịtụle “Ihe M Ga-eme ma Ndị Ọgbọ M Nyewe M Nsogbu,” nke dị n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2, peeji nke 132-133. Ha nwere ike ịtụle ya n’Ofufe Ezinụlọ ha.

[Foto dị na peeji nke 21]

Ikwu okwu n’echeghị echiche nwere ike isunye ọkụ n’ọgbakọ

[Foto dị na peeji nke 24]

I nwere ike ibutu ibu ahụ na-anyịgbu gị, nke bụ́ inwe mwute gabiga ókè

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya