-
Jehova Nwere Ezi Uche!Ụlọ Nche—1994 | Ọgọst 1
-
-
Ezi Uche Bụ Akara nke Amamihe Chineke
6. Gịnị bụ ihe nkịtị okwu Grik Jemes ji mee ihe n’ịkọwa amamihe Chineke pụtara, oleekwa ihe ndị ọ gụnyere?
6 Onye na-eso ụzọ bụ́ Jemes jiri okwu na-akpali mmasị mee ihe iji kọwaa amamihe nke Chineke nke a na-eme mgbanwe n’ụzọ kasị ukwuu. O dere: “Amamihe nke si n’elu bịa . . . [nwere] ezi uche.” (Jemes 3:17, NW) Okwu Grik o jiri mee ihe ebe a (e·pi·ei·kesʹ) siri ike ịsụgharị. Ndị nsụgharị ejiwo okwu ndị dị ka “ịdị obi ọma,” “ime ebere,” “ịnagide,” na “ichebara echiche,” mee ihe. New World Translation sụgharịrị ya ịbụ “inwe ezi uche,” na-enwe ntụaka ala ala peji nke na-egosi na ihe ọ pụtara n’ụzọ nkịtị bụ “ịdị na-ekwenye ekwenye.”a Okwu ahụ na-enyekwa echiche nke esighị ọnwụ n’ihe nile ọ bụla iwu kwuru, bụrụ onye na-adịghị eme mgbanwe ma ọ bụ gbaa isi akwara n’ụzọ na-enweghị isi. Onye mmụta bụ́ William Barclay na-ekwu n’akwụkwọ bụ́ New Testament Words, sị: “Isi ihe banyere epieikeia bụ na ọ na-amalite n’ebe Chineke nọ. Ọ bụrụ na Chineke eguzogide n’ihe ndị ruuru ya, ọ bụrụ na Chineke atụkwasị anyị nanị ụkpụrụ iwu ya ndị dị ike, olee ebe anyị ga-anọ? Chineke bụ ihe nlereanya kasị elu nke onye dị epieikēs na onye ji epieikeia na-emeso ndị ọzọ.”
7. Olee otú Jehova si gosipụta ezi uche n’ogige Iden?
7 Tụlee oge mgbe ihe a kpọrọ mmadụ nupụrụ isi megide ọkaaka Jehova. Lee ka ọ ga-esiworị dị mfe Chineke igbusịsị ndị nnupụisi atọ ahụ na-enweghị ekele—Adam, Iv, na Setan! Lee aha oké obi mgbu ọ gaara egbochiworo onwe ya! Ònye kwa gaara agbagha na o nweghị ikike ịchọ ezi ikpe dị otú ahụ nke na-enweghị mgbanwe? Ka o sina dị, ọ dịghị mgbe Jehova mere ka a kpọchigide nzukọ eluigwe ya nke yiri ụgbọ ịnyịnya n’ime ụkpụrụ ezi ikpe nke dị ike, na-adịghị eme mgbanwe. Ya mere ụgbọ ịnyịnya ahụ agbaraghị gaba n’ụzọ na-enweghị nkwụsị ma kwọgbuo ezinụlọ mmadụ na olileanya nile maka ọdịnihu obi ụtọ nke ihe a kpọrọ mmadụ. N’ụzọ megidere nke ahụ, Jehova nyagharịrị ụgbọ ịnyịnya ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ yiri nke àmụ̀má. Ozugbo nnupụisi ahụ gasịrị, Jehova Chineke setịpụrụ nzube ga-ewe ogologo oge nke chere ebere na olileanya n’ihu ụmụ nile nke Adam.—Jenesis 3:15.
8. (a) Olee otú echiche hiere ụzọ nke Krisendọm banyere ezi uche si dị iche n’ezigbote inwe ezi uche nke Jehova? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ezi uche Jehova apụtaghị na ọ pụrụ imebi ụkpụrụ dị iche iche nke Chineke?
8 Otú ọ dị, ezi uche Jehova apụtaghị na ọ pụrụ imebi ụkpụrụ dị iche iche nke Chineke. Chọọchị dị iche iche nke Krisendọm taa pụrụ iche na ha na-enwe ezi uche mgbe ha na-agba omume rụrụ arụ nkịtị nanị iji nweta ihu ọma nke ìgwè atụrụ ha na-eme otú masịrị ha. (Tụlee 2 Timoti 4:3.) Ọ dịghị mgbe Jehova mebiri iwu ndị nke ya, ọ dịghịkwa emebi ụkpụrụ ya dị iche iche. Kama nke ahụ, ọ na-egosi ịdị njikere ikwenye, ime mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ, ka e wee tinye ụkpụrụ ndị ahụ n’ọrụ n’ụzọ ikpe ziri ezi ma n’ụzọ ebere. Ọ na-eburu n’uche mgbe nile iji ịhụnanya ya na amamihe ya ezi uche dị na ya mee ka ezi ikpe na ike ya nọrọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma. Ka anyị tụlee ụzọ atọ Jehova si egosipụta ezi uche.
“Na-agbaghara Mmehie”
9, 10. (a) Gịnị ka “na-agbaghara mmehie” na inwe ezi uche nwekọrọ? (b) Olee otú Devid si rite uru site na Jehova ịdị na-agbaghara mmehie, n’ihi gịnịkwa?
9 Devid dere, sị: “N’ihi na Gị onwe gị, Onyenwe anyị, dị mma, Ị bụkwa onye na-agbaghara mmehie, Ị na-abakwa ụba n’ebere n’ahụ ndị nile na-akpọku Gị.” (Abụ Ọma 86:5) Mgbe a sụgharịrị Akwụkwọ Nsọ Hibru gaa na Grik, a kpọrọ okwu e ji mee ihe maka “na-agbaghara mmehie” e·pi·ei·kesʹ, ma ọ bụ “ezi uche.” N’ezie, ịdị na-agbaghara mmehie ma na-egosi ebere bụ ma eleghị anya akụkụ kasị mkpa isi gosipụta ezi uche.
10 Devid n’onwe ya maara nke ọma otú Jehova nweruru ezi uche n’akụkụ nke a. Mgbe Devid kwasoro Bat-sheba iko ma mee ndokwa ka e gbuo di ya, ma ya ma Bat-sheba kwesịrị ntaramahụhụ nke ọnwụ. (Deuterọnọmi 22:22; 2 Samuel 11:2-27) Ọ bụrụ na ndị ọkà ikpe bụ mmadụ bụ́ ndị na-adịghị eme mgbanwe kpere ikpe ahụ, ha abụọ pụrụ ịtụfuwo ndụ ha. Ma Jehova gosipụtara inwe ezi uche (e·pi·ei·kesʹ), nke, dị ka Vine’s Expository Dictionary of Biblical Words si kwuo ya, “na-akọwa nchebara echiche ahụ nke na-ele anya ‘site ná mmetụta na ezi uche n’ihe ndị bụ eziokwu n’ikpe.’” Ihe bụ eziokwu ndị metụtara mkpebi obi ebere nke Jehova nwere ike ịgụnye nchegharị sitere n’ezi obi nke ndị ahụ mejọrọnụ na obi ebere Devid n’onwe ya gosiworo n’ebe ndị ọzọ nọ. (1 Samuel 24:4-6; 25:32-35; 26:7-11; Matiu 5:7; Jemes 2:13) Otú ọ dị, n’ikwekọ ná nkọwa Jehova nke onwe ya n’Ọpụpụ 34:4-7, ọ bụ ihe ezi uche na Jehova ga-agbazi Devid olu. O ji Netan onye amụma zigara Devid ozi dị ike, na-eme ka eziokwu ahụ bụ na o lelịwo okwu Jehova anya doo Devid anya. Devid chegharịrị, ya mere ọ nwụghị n’ihi mmehie ya.—2 Samuel 12:1-14.
-
-
Jehova Nwere Ezi Uche!Ụlọ Nche—1994 | Ọgọst 1
-
-
a Laa azụ na 1769, onye na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ John Parkhurst kọwara okwu ahụ dị ka “ịdị na-ekwenye ekwenye, nke àgwà ikwenye ekwenye, obi ọma, nwayọọ, ndidi.” Ndị mmụta ndị ọzọ nyekwara “ịdị na-ekwenye ekwenye” dị ka nkọwa.
-