-
Ndịàmà Jehova Hà Bụ Ezigbo Ndị Kraịst?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
3. Olee otú Ndịàmà Jehova si egosi na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya otú ahụ Jizọs mere?
Otú Jizọs si hụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya enweghị atụ. Otú o si hụ ha n’anya mere ka ọ dị ya ka ha si n’otu ezinụlọ. (Gụọ Mak 3:35.) Ndịàmà Jehova dịkwa n’otu otú ahụ, ha hụrụ ụmụnna ha niile nọ n’ụwa n’anya ka à ga-asị na ha si n’otu ezinụlọ. Ọ bụ ya mere anyị ji akpọ ibe anyị nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị. (Faịlimọn 1, 2) Anyị na-erubekwa isi n’iwu e nyere anyị na Baịbụl bụ́: “Hụnụ ụmụnna niile n’anya.” (1 Pita 2:17) E nwere ọtụtụ ụzọ Ndịàmà Jehova si egosi na ha hụrụ ibe ha n’anya. Otu n’ime ya bụ ịgbatara ibe ha ọsọ enyemaka mgbe ha nọ ná nsogbu n’agbanyeghị ebe ha nọ n’ụwa.
-
-
Ime Baptizim Ga-abara Gị Ezigbo UruNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
6. Anyị na-esoro n’ezinụlọ Jehova ma anyị mee baptizim
Anyị mee baptizim, anyị na-esoro n’ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke dị n’otu. N’agbanyeghị na Ndịàmà Jehova niile merela baptizim si n’obodo dị iche iche, sikwa n’ezinụlọ dị iche iche, ha niile kweere otu ihe, na-emekwa ihe Baịbụl kwuru. Gụọnụ Abụ Ọma 25:14 na 1 Pita 2:17. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Mmadụ mee baptizim, olee otú adịm ná mma ya na Jehova nakwa adịm ná mma ya na ndị ọzọ na-efe Jehova na-abịa dịrị?
-
-
Nye Aka Mee Ka Ọgbakọ Dịrị n’OtuNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
Mgbe ọ bụla anyị na ụmụnna anyị nọ, obi na-adị anyị otú ọ dị Eze Devid. O dere, sị: “Ọ bụ ihe dị mma, bụrụkwa ihe na-eme obi ụtọ ma ụmụnne bikọta ọnụ ma dịrị n’otu.” (Abụ Ọma 133:1) Anyị agaraghị adị n’otu ma a sị na anyị anaghị agba mbọ ya. Onye ọ bụla n’ime anyị so na-eme ka anyị dịrị n’otu.
1. Olee ihe pụrụ iche gbasara ndị ohu Chineke?
Ọ bụrụ na ị gaa ọmụmụ ihe anyị n’ala ọzọ, o nwere ike ị gaghị anụ asụsụ e ji amụ ihe ebe ahụ. Ma, o doro anya na ahụ́ ga-eru gị ala. Maka gịnị? Ọ bụ maka na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ebe ahụ ka e jikwa amụ Baịbụl n’ebe ndị ọzọ. Anyị na-agbakwa mbọ ka anyị hụ ibe anyị n’anya. N’agbanyeghị ebe anyị bi, anyị niile ‘na-akpọ aha Jehova ma jiri otu obi na-efe ya ofufe.’—Zefanaya 3:9.
2. Gịnị ka i nwere ike ime ka ọgbakọ unu dịrị n’otu?
Baịbụl kwuru, sị: “Jirikwanụ obi unu niile hụ ibe unu n’anya.” (1 Pita 1:22) Olee otú ị ga-esi na-eme ihe amaokwu a kwuru? Kama ịna-ahụta ihe ndị ọzọ na-anaghị emeta, lekwasị anya n’ebe ndị ha na-eme nke ọma. Kama imete naanị ndị ihe gị na-amasị enyi, chọọ otú ị ga-esi matakwuo ụmụnna dị iche iche. Ọ bụrụ na e nwere ndị anyị kpọrọ asị, anyị nwere ike ịgba mbọ kwụsị ịkpọ ha asị.—Gụọ 1 Pita 2:17.a
3. Gịnị ka ị ga-eme ma gị na nwanna nwee nghọtahie?
Ọ bụ eziokwu na anyị dị n’otu, ma anyị ezughị okè. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike mee ndị ọzọ ihe ha na-atụghị anya ya ma ọ bụdị mee ihe ga-ewute ha. Ọ bụ ya mere Okwu Chineke ji gwa anyị ka anyị ‘na-agbaghara ibe anyị.’ O kwukwara, sị: “Jehova gbaghaara unu kpamkpam, unu kwesịkwara ịna-emere ibe unu otú ahụ.” (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:13.) Anyị enweghị ike ịgụta ugboro ole anyị na-emehie Jehova, ma, ọ na-agbaghara anyị. N’ihi ya, ọ chọrọ ka anyị na-agbaghara ụmụnna anyị. Ọ bụrụ na ị chọpụta na o nwere onye i mejọrọ, gakwuru ya ka unu kpezie.—Gụọ Matiu 5:23, 24.b
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta ihe ndị i nwere ike ime ka udo dịrị n’ọgbakọ unu, unu adịrịkwa n’otu.
Gịnị ka ị ga-eme ka gị na ụmụnna gị dịrị ná mma?
4. Kwụsị ịkpa ókè
Anyị nwere ike na-agbara onye na-adịghị otú anyị dị ọsọ. Ma, anyị kwesịrị ịhụ ụmụnna anyị niile n’anya. Gịnị ga-enyere anyị aka? Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 10:34, 35. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Jehova na-anabata ụdị mmadụ niile ka ha bụrụ Ndịàmà ya. Olee otú ị ga-esi na-eme ka ya ma e nwee ndị na-adịghị otú ị dị?
Olee ụdị ókè a na-akpakarị n’ógbè unu? Gịnị mere ị ga-eji zere ya?
Gụọnụ 2 Ndị Kọrịnt 6:11-13. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú i chere i nwere ike isi hụkwuo ụmụnna dị iche iche n’anya?
5. Gbaghara ndị ọzọ kpamkpam, gị na ha kpeziekwa
N’agbanyeghị na o nweghị ihe ọjọọ Jehova mere anyị nke anyị ga-agbaghara ya, ọ na-agbaghara anyị mmehie anyị kpamkpam. Gụọnụ Abụ Ọma 86:5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Ike ọ̀ na-agwụ Jehova ịgbaghara anyị?
Gịnị mere obi ji dị gị ụtọ maka otú o si agbaghara anyị?
Olee ihe ndị nwere ike ime ka anyị na ndị ọzọ ghara ịna-adị n’otu?
Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jehova ma mee ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu na-aga? Gụọnụ Ilu 19:11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Ọ bụrụ na mmadụ akpasuo gị iwe ma ọ bụ mejọọ gị, gịnị ka i nwere ike ime ka ihe ghara ịka njọ?
Anyị na-emejọ ndị ọzọ mgbe ụfọdụ. Ọ dị otú ahụ, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Na vidio a anyị lere, gịnị ka otu nwanna nwaanyị mere ka ya na nwanna nwaanyị ọzọ dịrị ná mma?
6. Lekwasị anya n’ebe ụmụnna gị na-eme nke ọma
Ọ bụrụ na anyị abịarukwuo ụmụnna anyị nso, anyị ga-abịa mara ebe ndị ha na-eme nke ọma na ebe ndị ha na-anaghị eme nke ọma. Olee otú anyị nwere ike isi lekwasị anya n’ebe ndị ha na-eme nke ọma? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị nwere ike inyere gị aka ịna-ahụ àgwà ọma ndị ụmụnna gị na-akpa?
Jehova na-elekwasị anya n’ebe ndị anyị na-eme nke ọma. Gụọnụ 2 Ihe E Mere 16:9a. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú obi dị gị ugbu a ị matara na Jehova na-elekwasị anya n’àgwà ọma gị?
Ọ bụrụgodị na ihe kawasịrị mgbaaka e ji dayamọnd mee, ọ ka bara ezigbo uru. Otú ahụ ka Jehova ji ụmụnna anyị kpọrọ ihe n’agbanyeghị na ha ezughị okè
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na onye mejọrọ ha ga-arịọrịrị ha mgbaghara tupu ha agbaghara ya.
Olee ihe mere i ji kwesị ịgbaghara ndị ọzọ n’egbughị oge?
NCHỊKỌTA
Ị ga-eso na-eme ka ọgbakọ unu dịrị n’otu ma ọ bụrụ na ị na-agbaghara ndị mejọrọ gị ma hụ ụmụnna gị niile n’anya.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Olee ihe ga-enyere gị aka ịkwụsị ịkpa ókè?
Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na gị na nwanna gị enwee nghọtahie?
Gịnị mere i kwesịrị iji na-agbaghara ndị ọzọ otú Jehova si agbaghara anyị?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta otú otu n’ime ihe atụ ndị Jizọs mere nwere ike isi mee ka anyị ghara ịna-ekpe ndị ọzọ ikpe.
Ànyị kwesịrị ịrịọ mmadụ mgbaghara ma ọ bụrụ na anyị chere na anyị emejọghị ya?
“Ịrịọ Mgbaghara—Ụzọ Dị Irè E Si Eme Udo” (Ụlọ Nche, Nọvemba 1, 2002)
Chọpụta ihe nyeere ụfọdụ ndị aka ha akwụsị ile ndị ọzọ anya n’ihu.
Chọpụta ihe ị ga-eme ka gị na nwanna gị na ya nwere nghọtahie nwee ike ikpezi tupu nghọtahie ahụ emee ka ọgbakọ unu ghara ịdị n’otu.
a Gụọ Ihe nke 6 E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A ka ị hụ otú ịhụnanya si eme ka Ndị Kraịst ghara ibunye ndị ọzọ ọrịa.
b Gụọ Ihe nke 7 E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A ka ị chọpụta ihe a ga-eme n’okwu gbasara ego ma ọ bụ okwu ụlọikpe nwere ike ilebara anya.
-