Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w06 5/15 p. 32
  • Uru nke “Ihe Ka Bụrụ nke Na-esighị Ike”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Uru nke “Ihe Ka Bụrụ nke Na-esighị Ike”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
w06 5/15 p. 32

Uru nke “Ihe Ka Bụrụ nke Na-esighị Ike”

PITA onyeozi dere, sị: “Unu ndị bụ́ di, nọgidenụ soro [nwunye unu na-ebi] dị ka ihe ọmụma si dị, na-ekenye ha nsọpụrụ dị ka ihe ka bụrụ nke na-esighị ike, ihe bụ́ nwanyị.” (1 Pita 3:7) Ọ̀ dị ụzọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ a kpọrọ nwanyị “ihe ka bụrụ nke na-esighị ike” si eweda ụmụ nwanyị ala? Ka anyị hụ ihe onye ahụ e nyere ike mmụọ nsọ dere ya bu n’obi mgbe o dere ya.

Mkpọaha Grik a sụgharịrị ịbụ “nsọpụrụ” pụtara “iji ihe akpọrọ ihe, uru, . . . nkwanye ùgwù.” N’ihi ya, Onye Kraịst bụ́ di ga-emeso nwunye ya ihe n’ụzọ dị nro, na-echebara ya echiche n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ka ihe na-esighị ike, nke dị oké ọnụ ahịa. Nke a abụtụghị mweda n’ala. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe e ji ekpuchi bọlb ọkụ nke e mere ka o yie okooko osisi bụ́ nke Tiffany mepụtara. A pụrụ n’ezie ikwu na ọmarịcha ihe mkpuchi ọkụ a esighị ike. Ebe ọ bụ na ihe mkpuchi ọkụ ahụ esighị ike, ò mere ka ọnụ ahịa ya dị ala? Mbanụ! N’afọ 1997, e rere ezigbote ihe ahụ e ji ekpuchi bolb ọkụ ná mgbuka n’ọnụ ahịa bụ́ nde dọla abụọ na narị puku asatọ! Ihe na-akụwa akụwa e ji mee ya mere ka ọ dịkwuo oké ọnụ ahịa, kama ibelata abamuru ya.

N’otu aka ahụ, ikenye nwanyị nsọpụrụ dị ka ihe ka bụrụ nke na-esighị ike adịghị eweda ya ala. Di isoro nwunye ya na-ebi “dị ka ihe ọmụma si dị” pụtara na ọ ga na-echebara ikike na adịghị ike ya, ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị na-adịghị amasị ya, echiche na mmetụta ya, echiche. Di nke na-ahụ n’anya, na-amata ọdịiche ndị dị n’etiti ya na nwunye ya ma na-echebara ha echiche. Ọ na-echebara nwunye ya echiche n’ụzọ kwesịrị ekwesị “ka e wee ghara igbochi ekpere [ya].” (1 Pita 3:7) Di jụrụ ịkwanyere omume ọma nwunye ya ùgwù na-etinye mmekọrịta ya na Chineke n’ihe ize ndụ. O doro anya na Okwu Chineke adịghị eweda ụmụ nwanyị ala. Kama nke ahụ, ọ na-asọpụrụ ha.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

© Christie’s Images Limited 1997

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya