Ijigide Ịdị Mma n’Ụwa Jupụtara n’Omume Ọjọọ
“Meenụ ihe nile n’ejighị ntamu na ịrụ ụka ọ bụla; ka unu wee ghọọ ndị na-adịghị ịta ụta ndị na-aghọghịkwa aghụghọ, ụmụ Chineke ndị a na-apụghị ịta ụta n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ nke na-enwekwa anya uhie.”—NDỊ FILIPAỊ 2:14, 15.
1, 2. N’ihi gịnị ka Chineke ji chọọ ka e kpochapụ ndị Kenean?
IWU Jehova enyeghị ohere ọ bụla maka ịgbanwe ya. Ndị Israel agala ịbanye n’Ala Nkwa ahụ mgbe Mosis onye amụma gwara ha, sị: “Ị ghaghị iwezụga ha ka e bibie ha; bụ́ ndị Het, na ndị Amọraịt, na ndị Kenean, na ndị Perizaịt, na ndị Haịvaịt, na ndị Jebus; dị ka Jehova, bụ́ Chineke gị, nyeworo gị iwu.”—Deuterọnọmi 7:2; 20:17.
2 Ebe Jehova bụ Chineke ebere, gịnị mere o ji chọọ ka e bibie ndị bi na Kenean? (Ọpụpụ 34:6) Otu ihe mere ya bụ ‘ka ndị Kenean wee ghara izi Israel ime dị ka ihe arụ ahụ nile ha mewooro chi nile ha si dị, ha ewee mehie megide Jehova Chineke.’ (Deuterọnọmi 20:18) Mosis sịkwara: “Ọ bụ n’ihi mmebi iwu nke mba ndị a ka Jehova na-anapụ ha ala ha n’ihu gị.” (Deuterọnọmi 9:4) Ndị Kenean bụ omume ọjọọ n’onwe ha. Mmekọahụ rụrụ arụ na ikpere arụsị bụ ihe e ji mara ofufe ha. (Ọpụpụ 23:24; 34:12, 13; Ọnụ Ọgụgụ 33:52; Deuterọnọmi 7:5) Idina onye ikwu, idina ụdị onwe, na idina anụmanụ bụ “omume ala Kenean.” (Levitikọs 18:3-25) E ji obi ọjọọ jiri ụmụaka aka ha dị ọcha chụọrọ chi ụgha dị iche iche àjà. (Deuterọnọmi 18:9-12) Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji kpebie na nanị ịdị adị nke mba ndị a na-eyi ọdịmma anụ ahụ, omume, na ime mmụọ nke ndị ya egwu!—Ọpụpụ 34:14-16.
3. Gịnị mere n’ihi na ndị Israel emezughị iwu Chineke banyere ndị bi na Kenean?
3 N’ihi na e mezuchaghị iwu Chineke, ọtụtụ ndị bi na Kenean lanarịrị mmeri Israel meriri Ala Nkwa ahụ. (Ndị Ikpe 1:19-21) Ka oge na-aga, e nwetara mmetụta dị aghụghọ nke ndị Kenean, a pụkwara ikwu: “Ha [ndị Israel] wee jụ ụkpụrụ [Jehova] nile, na ọgbụgba ndụ Ya nke Ya na ndị bụ nna ha gbara, na ihe àmà Ya nile nke Ọ gbaara ha; ha wee jesoo ihe efu, wee ghọọ ihe efu, soro mba ọzọ ndị nọ ha gburugburu, ndị Jehova nyere ha iwu banyere ha, ka ha ghara ime dị ka ha.” (2 Ndị Eze 17:15) Ee, n’ime afọ ndị na-agafenụ ọtụtụ ndị Israel mere kpọmkwem omume ọjọọ ndị ahụ meworo ka Chineke nye iwu ka e kpochapụ ndị Kenean—ikpere arụsị, ajọ mmekọahụ, na ọbụna ịchụ ụmụaka n’àjà!—Ndị Ikpe 10:6; 2 Ndị Eze 17:17; Jeremaịa 13:27.
4, 5. (a) Gịnị mere Israel na Juda na-ekwesịghị ntụkwasị obi? (b) Agbamume dị aṅaa ka e nyere ná Ndị Filipaị 2:14, 15, ajụjụ ndị dịkwa aṅaa ka a na-ewelite?
4 Ya mere, Hosea onye amụma kwupụtara, sị: “Nụrụnụ okwu Jehova, ụmụ Israel: n’ihi na ikpe ka Jehova na ndị bi n’ala nke a ga-ekpe, n’ihi na ọ dịghị eziokwu, ọ dịghịkwa ebere, ọ dịghịkwa ọmụma Chineke, dị n’ala nke a. Ọ bụ nanị ọgbụgba iyi, na okwu ụgha, na ogbugbu mmadụ, na izu ohi, na ịkwa iko; ha etipuwo etipu, ịwụsị ọbara mmadụ emetụwokwa ịwụsị ọbara mmadụ. N’ihi nke a ka ala nke a ga-eru újú, onye ọ bụla nke bi n’ime ya ga-atakwa ahụ, ya na anụ ọhịa na anụ ufe nke eluigwe; ọ bụkwa azụ nile nke oké osimiri ka a ga-ekpochapụ.” (Hosea 4:1-3) Na 740 T.O.A., Asiria meriri alaeze ugwu rụrụ arụ nke Israel. N’ihe dị ka otu narị afọ n’ihu, Babilọn bibiri alaeze ndịda na-ekwesịghị ntụkwasị obi nke Juda.
5 Ihe omume ndị a gosiri otú ọ pụrụ isi dịrị ize ndụ ikwe ka omume ọjọọ rikpuo anyị. Chineke kpọrọ ajọ omume asị, ọ gaghịkwa ekwe ka ọ dịrị n’etiti ndị ya. (1 Pita 1:14-16) Ọ bụ eziokwu na anyị bi “n’ajọ oge nke dị ugbu a,” n’ụwa na-arụwanye arụ. (Ndị Galetia 1:4; 2 Timoti 3:13) N’agbanyeghị nke ahụ, Okwu Chineke na-agba ndị Kraịst nile ume ịnọgide na-eme ihe n’ụzọ ha ga-abụ “ndị na-adịghị ịta ụta ndị na-aghọghịkwa aghụghọ, ụmụ Chineke ndị a na-apụghị ịta ụta n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ nke na-enwekwa anya uhie, ndị a na-ahụ [ha] n’etiti ha dị ka ndị na-enye ìhè n’ụwa.” (Ndị Filipaị 2:14, 15) Ma olee otú anyị pụrụ isi jigide ịdị mma n’ụwa jupụtara n’omume ọjọọ? Ọ̀ ga-ekwe omume n’ezie ime otú ahụ?
Ụwa Rom nke Jupụtara n’Omume Ọjọọ
6. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst narị afọ mbụ ji chee ihe ịma aka nke ijigide ịdị mma ihu?
6 Ndị Kraịst narị afọ mbụ chere ihe ịma aka nke ịnọgide na-eme ihe dị mma ihu n’ihi na omume ọjọọ jupụtara akụkụ nile nke ọha mmadụ Rom. Ọkà ihe ọmụma Rom bụ́ Seneca kwuru banyere ndị biri n’oge ya, sị: “Ndị mmadụ na-agba mgba n’oké asọmpi nke ajọ omume. Ọchịchọ ime ihe ọjọọ na-aka ukwuu kwa ụbọchị, ịtụ ya egwu na-ebelata.” O ji ọha mmadụ Rom tụnyere “ógbè anụ ọhịa.” Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na maka ntụrụndụ, ndị Rom chụsoro asọmpi ịlụ ọgụ ọnwụ n’ụzọ obi ọjọọ na ihe nkiri rụrụ arụ.
7. Olee otú Pọl si kọwaa omume ọjọọ ndị dị ebe nile n’etiti ọtụtụ ndị na narị afọ mbụ O.A.?
7 O nwere ike ịbụ na Pọl onyeozi bu n’uche omume rụrụ arụ nke ndị mmadụ na narị afọ mbụ mgbe o dere, sị: “Chineke raara ha nye n’aka agụụ ihe ihere: n’ihi na ndị inyom ha weere nwanyị ha bụ site n’ọmụmụ gbanwere ihe na-emegide ka e si mụọ ha: otú a ndị ikom hapụkwara otú a na-eme nwanyị site ka e si mụọ ya, wee ree ọkụ n’ahụ ha n’ahụ ndị ikom ibe ha, ndị ikom na-arụpụta ihe na-adịghị mma n’anya n’ahụ ndị ikom, na-anarakwa n’ime onwe ha ụgwọ ọrụ ahụ nke njehie ha nke ha na-aghaghị ịnara.” (Ndị Rom 1:26, 27) N’ịbụ ndị kpebisiri ike ịchụso ọchịchọ anụ ahụ na-adịghị ọcha, ọha mmadụ Rom ghọrọ ndị omume ọjọọ zuru ahụ.
8. Olee otú e sikarị metọọ ụmụaka n’ọha mmadụ Gris na Rom?
8 Akụkọ ihe mere eme emeghị ka o doo anya ókè ndina ụdị onwe dịruru n’etiti ndị Rom. Otú ọ dị, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị Gris bu ha ụzọ nwere mmetụta n’ahụ ha, bụ́ ndị a na-eme ya n’ụzọ sara mbara n’etiti ha. Ọ bụ omenala ndị meworo okenye imerụ ụmụ okorobịa, na-akpọbata ha n’okpuru ha ná mmekọrịta nwa akwụkwọ na onye nkụzi bụ́ nke na-edurukarị ụmụ okorobịa ndị a gaa n’àgwà mmekọahụ rụrụ arụ. N’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-akpata ụdị omume ọjọọ ahụ na imeso ụmụaka omume ọjọọ.—Joel 3:3; Jud 6, 7.
9, 10. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka 1 Ndị Kọrint 6:9, 10 si katọọ ụdị dị iche iche nke omume ọjọọ? (b) Gịnị bụ ọnọdụ ụfọdụ n’ọgbakọ Kọrint, mgbanwe dịkwa aṅaa weere ọnọdụ n’ihe banyere ha?
9 N’ide ihe n’okpuru mmụọ nsọ Chineke, Pọl gwara ndị Kraịst nọ na Kọrint, sị: “Ma ọ bụ ùnu amataghị na ndị ajọ omume agaghị eketa alaeze Chineke? Unu ekwela ka e duhie unu: ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị ikom na-akwa iko, bụ́ ndị nwere nwunye, ma ọ bụ ndị ikom na-eme dị ka ndị inyom, ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom, ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ha agaghị eketa alaeze Chineke. Otú a ka ụfọdụ n’etiti unu dịkwarị: ma unu sachara onwe unu, ma e doro unu nsọ, ma a gụrụ unu ná ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ya na n’ime Mmụọ nke Chineke anyị.”—1 Ndị Kọrint 6:9-11.
10 Akwụkwọ ozi Pọl e dere n’ike mmụọ nsọ si otú a katọọ mmekọahụ rụrụ arụ, na-ekwu na “ndị na-akwa iko” agaghị “eketa alaeze Chineke.” Otú ọ dị, mgbe o depụtasịrị ọtụtụ omume ọjọọ, Pọl kwuru, sị: “Otú a ka ụfọdụ n’etiti unu dịkwarị: ma unu sachara onwe unu.” Site n’enyemaka Chineke o kwere omume ka ndị mere ihe ọjọọ dị ọcha n’anya ya.
11. Olee otú ihe si gaara ndị Kraịst narị afọ mbụ n’ime ajọ gburugburu ebe obibi nke oge ha?
11 Ee, e nwere ụba nke ịdị mma ndị Kraịst ọbụna n’ụwa nke narị afọ mbụ jupụtara n’omume ọjọọ. Ndị kwere ekwe bụ ndị ‘e nwoghara site n’ime ka ha bụrụ ihe ọhụrụ.’ (Ndị Rom 12:2) Ha gbahapụrụ ‘ibi obi ha na mbụ’ wee bụrụ ndị ‘e mere ka ha dị ọhụrụ ná mmụọ nke uche ha.’ Ha si otú a gbanarị omume ọjọọ nke ụwa wee ‘yikwasị mmadụ ọhụrụ nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.’—Ndị Efesọs 4:22-24.
Ụwa Taa nke Jupụtara n’Omume Ọjọọ
12. Mgbanwe dị aṅaa dakwasịworo ụwa kemgbe 1914?
12 Gịnị banyere oge anyị? Ụwa anyị bi n’ime ya jupụtara n’omume ọjọọ karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Karịsịa kemgbe 1914 e nwewo ndakpọ omume n’ụwa nile. (2 Timoti 3:1-5) Ịjụ echiche ọdịnala banyere ịdị mma, omume ọma, aha ọma, na ụkpụrụ omume, ọtụtụ abụrụwo ndị na-echere nanị onwe ha, ‘mmehie ha adịghịkwa ewute ha ọzọ.’ (Ndị Efesọs 4:19) Magazin bụ́ Newsweek sịrị: “Anyị bi n’oge nke onye ọ bụla mere ihe masịrị ya,” na-agbakwụnye na ọnọdụ omume dị ebe nile “emewo ka echiche nile nke ezi ihe na ihe ọjọọ bụrụzie nke ihe masịrị onye, nhọrọ sitere ná mmetụta uche ma ọ bụ nhọrọ ọdịbendị.”
13. (a) Olee otú ihe dị ukwuu ná ntụrụndụ nke taa si na-akwalite omume ọjọọ? (b) Mmetụta ọjọọ dị aṅaa ka ntụrụndụ na-ekwesịghị ekwesị pụrụ inwe n’ahụ ndị mmadụ n’otu n’otu?
13 Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, ntụrụndụ rụrụ arụ juru ebe nile taa. Telivishọn, redio, ihe nkiri sịnịma, na ihe nkiri vidio na-awụpụtasị ọtụtụ ihe ndị metụtara mmekọahụ. Ọbụna omume ọjọọ egbebanyela n’usoro njikọ kọmputa. Ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na-adịwanye ọtụtụ n’usoro njikọ kọmputa nke oge a, ndị nọ n’afọ ndụ dị iche iche na-enwetakwa ya. Gịnị bụgasị mmetụta ihe ndị a nile na-enwe? Otu onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ na-asị: “Mgbe ọbara na ime ihe ike na inwe mmekọahụ aghara aghara jupụtara n’ọdịbendị anyị, ọbara na ime ihe ike na inwe mmekọahụ aghara aghara na-amara anyị ahụ. Ha adịghị adị anyị ka ihe ọ bụla. Nretọ na-aghọwanye ihe a na-anakwere n’ihi na ókè na-adịwanye nta na-awụ anyị akpata oyi n’ahụ.”—Tụlee 1 Timoti 4:1, 2.
14, 15. Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na omume mmekọahụ adakpọwo n’ụwa nile?
14 Tụlee akụkọ a dị na The New York Times: “Ihe a gaara ewere dị ka ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ afọ 25 gara aga abụrụwo ugbu a ụzọ ndụ a na-anakwere. Ọnụ ọgụgụ ndị nwoke na nwanyị na-ahọrọ ibikọ ọnụ kama ịlụ ji 80 pasent rịa elu [na United States] n’agbata 1980 na 1991.” Nke a abụghị ihe na-eme nanị n’Ebe Ugwu America. Magazin bụ́ Asiaweek na-akọ, sị: “Nrụrịta ụka ọdịbendị kpụ ọkụ n’ọnụ ná mba nile dị [n’Esia]. Ihe a na-arụrụ ụka bụ nnwere onwe mmekọahụ megide ụkpụrụ ọdịnala, nrụgide maka mgbanwe nọgidekwara na-arị elu.” Ndekọ ọnụ ọgụgụ na-egosi nnakwere na-arịwanye elu nke ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye na mmekọahụ tupu alụmdi na nwụnye n’ọtụtụ ala.
15 Bible buru amụma na ihe omume Setan ga-arị elu n’oge anyị. (Mkpughe 12:12) Ya mere, o kwesịghị iju anyị anya na omume ọjọọ jupụtara ebe nile n’ụzọ dị egwu. Dị ka ihe atụ, mmetọ ụmụaka n’ụzọ mmekọahụ agbasawo ebe nile.a Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu na-akọ na “iji nrigbu n’ụzọ mmekọahụ azụ ahịa na-ebibi ụmụaka n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mba nile nke ụwa.” Kwa afọ “a na-akọ na a na-amanye ihe karịrị 1 nde ụmụaka gburugburu ụwa ịbanye n’ịgba akwụna ụmụaka, jiri ha gbaa mgbere ahịa ma ree ha maka nzube mmekọahụ, jirikwa ha mepụta ihe na-akpali mmekọahụ ụmụaka.” Ndina ụdị onwe dịkwa ebe nile, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị ndú okpukpe na-ebute ụzọ n’ịkwalite ya dị ka “ụzọ ndụ a pụrụ ịhọrọ.”
Ịjụ Omume Ọjọọ nke Ụwa
16. Nguzo dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova na-ewere n’ihe banyere omume mmekọahụ?
16 Ndịàmà Jehova adịghị esonyere ndị na-akwado ụkpụrụ ime ihe masịrị onye banyere omume mmekọahụ. Taịtọs 2:11, 12 na-asị: “E gosiri amara nke Chineke, na-ewetara mmadụ nile nzọpụta, na-adọ anyị aka ná ntị ka anyị wee jụ asọpụghị Chineke na agụụ ihe ọjọọ dị n’ụwa, wee dị ndụ uche zuru okè na nke ezi omume na nke ịsọpụrụ Chineke n’oge dị ugbu a.” Ee, anyị na-azụlite ezigbo ịkpọasị, ịsọ oyi, maka ụdị omume ọjọọ ndị dị ka mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye, ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, na idina ụdị onwe.b (Ndị Rom 12:9; Ndị Efesọs 5:3-5) Pọl nyere agbamume a, sị: “Ka onye ọ bụla nke na-akpọ aha Onyenwe anyị si n’ajọ omume wezụga onwe ha.”—2 Timoti 2:19.
17. Olee otú ezi ndị Kraịst si ele iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe anya?
17 Ezi ndị Kraịst na-ajụ echiche ụwa banyere omume ọjọọ ndị yiri ka ha dị nta. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị taa na-ewere iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi dị ka ihe ọchị. Ma ndị Jehova na-aṅa ntị ná ndụmọdụ nke Ndị Efesọs 5:18: “Unu aṅụbigakwala mmanya ókè, nke ndụ ịla n’iyi dị n’ime ya, kama jupụtanụ ná Mmụọ Nsọ.” Ọ bụrụ na onye Kraịst ahọrọ ịṅụ mmanya, ọ na-aṅụru ya n’ókè.—Ilu 23:29-32.
18. Olee otú ụkpụrụ Bible si eduzi ndị ohu Jehova ná mmeso ha na-emeso ndị òtù ezinụlọ ha?
18 Dị ka ndị ohu Jehova, anyị na-ajụkwa echiche ụfọdụ n’ime ụwa nke na mmadụ itikwasị di ma ọ bụ nwunye na ụmụ ya mkpu ma ọ bụ iji okwu ndị na-akpasu iwe akpọ ha iyi bụ akparamàgwà dị mma. Site n’ikpebisi ike ịchụso ụzọ ịdị mma, ndị di na nwunye bụ́ ndị Kraịst na-arụkọ ọrụ ọnụ itinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ: “Ka e wepụ ihe ilu na ọnụma na iwe na iti mkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọọ nile, n’etiti unu: nwerịtanụ obiọma n’ahụ ibe unu, nweenụ obi ọmịiko, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, dị ka Chineke werekwaara amara gbaghara unu n’ime Kraịst.”—Ndị Efesọs 4:31, 32.
19. Olee ókè omume ọjọọ dịruru n’ụwa azụmahịa?
19 Akwụwaghị aka ọtọ, wayo, ịtụ asị, atụmatụ azụmahịa arụrụala, na izu ohi jukwara ebe nile taa. Otu isiokwu dị na magazin azụmahịa bụ́ CFO na-akọ, sị: “Ajụjụ a gbara ndị ọrụ 4,000 . . . chọpụtara na 31 pasent nke ndị zaghachirinụ ahụwo ‘àgwà jọgburu onwe ya’ n’afọ gara aga.” Ụdị àgwà ọjọọ ahụ gụnyere ịtụ asị, ịgbanwe ihe ndekọ, iyi egwu mmekọahụ, na izu ohi. Ọ bụrụ na anyị ga-anọgide na-adị ọcha n’omume n’anya Jehova, anyị aghaghị izere ụdị àgwà ndị ahụ ma kwụwa aka ọtọ ná mmekọrịta ego anyị.—Maịka 6:10, 11.
20. N’ihi gịnị ka o ji dị ndị Kraịst mkpa ịghara “ịhụ ego n’anya”?
20 Tụlee ihe mere otu nwoke chere na ya ga-enwekwu oge maka ozi Chineke ma ọ bụrụ na ya egbuo ozu n’achụmnta ego. Ọ dọbatara ndị ọzọ n’atụmatụ itinye ego n’azụmahịa site n’ikwu na uru ha na-atụ anya inweta ga-adị nnọọ ukwuu. Mgbe ihe kụrụ afọ n’ala, ọ chọsiri ike inwetaghachi nnukwu mfu ya nke na o zuuru ego e nyefeworo ya n’aka. N’ihi ihe o mere na àgwà enweghị nchegharị ya, a chụpụrụ ya n’ọgbakọ ndị Kraịst. Ịdọ aka ná ntị Bible bụ nnọọ eziokwu: “Ndị na-ezube ịbụ ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha, nke na-emerụkwa ahụ, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ mikpuo emikpuo n’ime mbibi na ịla n’iyi. N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche: nke ụfọdụ na-agbasosi ike, e wee duhie ha n’okwukwe anyị, ha werekwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.”—1 Timoti 6:9, 10.
21. Akparamàgwà dị aṅaa jupụtara n’etiti ndị ikom nwere ike n’ụwa, ma olee otú ndị nọ n’ọnọdụ ibu ọrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst si akpa àgwà?
21 Ọtụtụ mgbe ndị ụwa nwere ike na ebube adịghị egosi ịdị mma, ha na-egosikwa eziokwu nke okwu ahụ a ma ama, ‘Ike na-emerụ emerụ.’ (Eklisiastis 8:9) N’ala ụfọdụ, iri ngo na ụdị ndị ọzọ nke nrụrụ aka bụ ụzọ ndụ n’etiti ndị ọkàikpe, ndị uwe ojii, na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Otú ọ dị, ndị na-edu ndú n’ọgbakọ ndị Kraịst aghaghị ịdị mma, ha agaghịkwa eme ndị ọzọ dị ka ndị nwe ha. (Luk 22:25, 26) Ndị okenye, nakwa ndị ohu na-eje ozi, adịghị eje ozi “n’ihi uru na-eweta ihere.” Ha aghaghị ichebe onwe ha pụọ ná mgbalị ọ bụla ịrọgharị ma ọ bụ ịgbanwe ikpe ha n’atụmanya nke uru onwe onye.—1 Pita 5:2; Ọpụpụ 23:8; Ilu 17:23; 1 Timoti 5:21.
22. Gịnị ka isiokwu na-esonụ ga-atụle?
22 N’ozuzu ha, ndị Kraịst na-enwe ihe ịga nke ọma n’imeri ihe ịma aka nke oge a nke ijigide ịdị mma n’ụwa anyị jupụtara n’omume ọjọọ. Ma, ịdị mma gụnyere ihe karịrị nanị izere ajọ omume. Isiokwu na-esonụ ga-atụle ihe ịdị mma na-achọ n’ezie.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee usoro isiokwu bụ́ “Chebe Ụmụ Gị!,” nke pụtara na Teta! nke February 8, 1994.
b Ndị dinaworo ụdị onwe ha n’oge gara aga pụrụ ime mgbanwe n’akparamàgwà ha, dị nnọọ ka ụfọdụ mere na narị afọ mbụ. (1 Ndị Kọrint 6:11) E nyere ihe ọmụma na-enye aka na Teta! nke April 8, 1995, peji nke 19-21.
Isi Ihe Ndị A Ga-atụleghachi
◻ N’ihi gịnị ka Jehova ji nye iwu ka e kpochapụ ndị Kenean?
◻ Omume ọjọọ ndị dị aṅaa juru ebe nile na narị afọ mbụ, oleekwa otú ihe si gaara ndị Kraịst gburugburu ebe dị otú ahụ?
◻ Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na ụwa ahụwo ndakpọ omume zuru ebe nile kemgbe 1914?
◻ Omume ọjọọ ndị dị aṅaa a na-ahụkarị ka ndị Jehova na-aghaghị ịjụ?
[Foto dị na peeji nke 9]
Ndị Kraịst narị afọ mbụ mere ihe dị mma, ọ bụ ezie na ha biri n’ụwa omume ọjọọ jupụtara
[Foto dị na peeji nke 10]
Omume ọjọọ egbebanyela ọbụna n’usoro njikọ kọmputa, na-eme ka ọtụtụ ndị na-eto eto na ndị ọzọ nweta ihe ndị na-akpali mmekọahụ
[Foto dị na peeji nke 12]
Ndị Kraịst aghaghị ijigide ịdị mma, n’eṅomighị atụmatụ akwụwaghị aka ọtọ nke ndị ọzọ