Nọrọ Na Nche Megide Enweghị Mmasị Ịgụ Ihe
ỤDỊ nsogbu ọhụrụ nke ịgụ ihe na-emetụta ụwa anyị n’ụzọ sara mbara. A na-akpọ ya enweghị mmasị ịgụ ihe. A na-akọwa ya dị ka “ọdịdị ma ọ bụ ọnọdụ nke inwe ike ịgụ ihe ma ghara [inwe] mmasị ime otú ahụ.”a (Merriam-Webster’s Collegiate Dictionary, Tenth Edition) Ee, ịgụ ihe—nke a na-emebu dị ka ihe obi ụtọ—ka a na-ajụ ugboro ugboro ugbu a dị ka ọrụ siri ike. “Ị ghaghị ime mgbalị iji gụọ ihe,” ka otu nwa agbọghọ dị afọ 12 mere mkpesa ya, “nke ahụ abụghịkwa ihe na-enye obi ụtọ.”
Ọtụtụ ndị meworo okenye enweghịkwa mmasị ịgụ ihe. Dị ka ihe atụ, United States ji ịnya isi na-azọrọ inwe 97 pasent nke ọ̀tụ̀tụ̀ ịma otú e si agụ na otú e si ede; ma, ọ na-esiri ihe dị ka ọkara ndị America meworo okenye ike ịgụ akwụkwọ ma ọ bụ magazin! N’ụzọ doro anya, ikike ịgụ ihe na ọchịchọ ịgụ ihe adịghị aha nhata mgbe nile. Nke a bụ eziokwu ọbụna n’etiti ndị gụrụ akwụkwọ nke ọma. “Mgbe m bu ike ọgwụgwụ ụbọchị nke ọrụ siri ike lọta n’ụlọ,” ka otu onye gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Harvard na-ekwu, “m na-agbanye TV kama iwelite otu akwụkwọ. Ọ ka mfe.”
Gịnị meworo ịgụ ihe? N’iri afọ ndị a, ya ịbụ nke ọha na-anakwere adawo n’ihi usoro mgbasa ozi ndị na-anwụchi mmasị. “Ugbu a anyị nwere MTV nke anyị—na VCR nke anyị na Nintendo na Walkman—atụmanya nke ịdọgbu onwe onye n’ọrụ n’ịgụ akwụkwọ eyighị ihe dị mfe dị ka ọ dị n’oge ndị dị mfe karị,” ka Stratford P. Sherman na-ede na magazin bụ́ Fortune. Ma eleghị anya ihe kasị na-eri oge nke na-ama ịgụ ihe aka bụ telivishọn. N’eziokwu, ka ọ na-agbaru 65 afọ, onye America ga-ejiworị afọ itoolu nke ndụ ya kirie TV!
Ebe ọ bụ na a na-ejikarị abamuru nke ịgụ ihe achụrụ telivishọn àjà, ọ ga-adị mma ịtụle ihe na-esonụ.
Abamuru Dị Iche Iche nke Ịgụ Ihe
Ịgụ ihe na-akpali iche echiche. Telivishọn na-echere gị echiche gị. A na-eme ka ihe nile pụta ìhè: ọdịdị ihu, mgbanwe ụda olu, na ọnọdụ dịnụ.
Otú ọ dị, n’ihe banyere ịgụ ihe, ị na-ahọrọ ndị na-eme ihe nkiri, hazie ọnọdụ, ma duzie ihe omume ahụ. “I nwere nnwere onwe dị nnọọ ukwuu,” ka nwa okoro dị afọ 10 na-ekwu. “Ị pụrụ ime ka onye nke ọ bụla dị nnọọ ka ị chọrọ ka ọ dị n’anya. Ị na-enwekarị ike ịchịkwa ihe mgbe ị na-agụ akwụkwọ karịa mgbe ị na-ahụ ihe na TV.” Dị ka Dr. Bruno Bettelheim siri kwuo, “telivishọn na-adọrọ echiche ma ọ dịghị eme ka o nwere onwe ya. Akwụkwọ dị mma na-akpali akpali ozugbo, na-emekwa ka uche nwere onwe ya.”
Ịgụ ihe na-azụlite nkà ikwu okwu. “Ọ dịghị nwatakịrị ma ọ bụ onye meworo okenye ọ bụla nke na-eme nke ọma karị n’ikiri telivishọn site n’ikirikwu ya,” ka Reginald Damerall nke Mahadum Massachusetts na-arịba ama. “Nkà ndị a chọrọ dị mfe nke na anyị anụbeghị banyere nkwarụ nke ikiri telivishọn.”
N’ụzọ dị iche, ịgụ ihe na-achọ ma na-azụlite nkà ikwu okwu; e jikọtara ya na ikwu okwu na ide ihe n’ụzọ a na-apụghị ikewa ekewa. Otu onye na-akụzi Bekee n’ụlọ akwụkwọ dị elu na-asị: “Ọ bụ eziokwu na ihe ịga nke ọma gị dị ka nwa akwụkwọ na-adabere n’ụzọ dị ukwuu n’ìgwè okwu gị, ma n’ihe ị pụrụ ịghọta ka ị na-agụ ihe ma n’otú i si eche echiche ka ị na-ede ihe, e nweghịkwa ụzọ e si ewulite ìgwè okwu dị mma ma ọ́ bụghị site n’ịgụ ihe—e nweghị nnọọ ụzọ ọzọ.”
Ịgụ ihe na-akwalite ndidi. Foto karịrị otu puku pụrụ ịgafe n’ihu TV n’ime nanị otu hour, na-eme ka onye na-ekiri ya nwee oge dị nta iji tụgharịa uche n’ihe ọ na-ahụ. “Ụzọ ime ihe nke a na-eme ka e nwee ikike itinye uche n’ihe nke dị nta,” ka Dr. Matthew Dumont na-ekwu. N’ụzọ na-adịghị eju anya, ọmụmụ ihe ụfọdụ na-ejikọta ikiri TV gabiga ókè na ime mkpebi n’echeghị echiche nke ọma na enweghị ahụ iru ala—n’ebe ma ụmụaka ma ndị toruworo ogo mmadụ nọ.
Ịgụ ihe chọrọ ndidi. “Ahịrịokwu, paragraf, na peji na-apụta nwayọọ nwayọọ, n’usoro n’usoro, na dị ka usoro iche echiche sitere n’ọgụgụ isi si dị,” ka ọkachamara ná nzirịta ozi bụ́ Neil Postman na-ede. Dị ka ikike ya hà, onye na-agụ ihe aghaghị ịkọwa, ịtụle, na ịtụgharị uche n’ihe dị na peji ahụ. Ịgụ ihe bụ usoro ịtụgharị ihe n’uche nke dị mgbagwoju anya nke na-achọ—na-ewulitekwa—ndidi.
Echiche Ziri Ezi
E wezụga abamuru nke ịgụ ihe, a ghaghị ikwenye na telivishọn nwekwara abamuru ndị nke ya. Ọ pụrụ ịdị mma karịa ịgụ ihe n’inye ụdị ihe ọmụma ụfọdụ.b Ihe omume mara mma nke TV pụrụ ọbụna ịkpali mmasị n’ịgụ ihe. “A na-akọ na ihe omume TV ndị na-egosi akwụkwọ ọgụgụ ụmụaka na sayensị na-akpali ụmụaka ịchọ akwụkwọ n’isiokwu ndị ahụ na ndị yiri ha,” ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana na-ekwu.
Echiche ziri ezi dị mkpa. Akwụkwọ e biri ebi na telivishọn bụ usoro abụọ dịgasị iche. Nke ọ bụla nwere ikike na erughị eru ndị nke ya. A pụrụ iji nke ọ bụla mee ihe—ma ọ bụ mehie ihe. Ee, ịgụ akwụkwọ gabiga ókè ruo n’ọnọdụ nke ikewapụ onwe onye pụrụ ịdị na-emerụ ahụ dị ka ikiri TV gabiga ókè.—Ilu 18:1; Eklisiastis 12:12.
Ma, a na-elegharakarị ịgụ ihe anya n’ihi ndọpụ uche nke ihe anya na-ahụ. Otu onye Japan bụ́ onye nta akụkọ kwara arịrị, na-asị: “Anyị na-agbanwe site n’ịbụ ndị e ji ịgụ ihe mara gaa n’ịbụ ndị e ji ikiri ihe mara.” A na-ahụkarị nke a n’etiti ndị ntorobịa. N’ihi ya, ọtụtụ n’ime ha na-etolite ma bụrụ ndị na-enweghị mmasị n’ịgụ ihe, ha na-emesịakwa taa ahụhụ ya. Ya mere, olee otú ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi nyere ụmụ ha aka ịzụlite ọchịchọ ịgụ ihe?
Otú Nne na Nna Pụrụ Isi Nye Aka
Setịpụ ihe nlereanya. Otu isiokwu dị na magazin bụ́ Newsweek nke a kpọrọ “Otú E Si Azụlite Ndị Na-agụ Ihe nke Ọma” na-atụ aro nke a guzo kwem: “Ọ bụrụ na ị bụ onye na-etinye oge buru oké ibu n’ikiri TV, ma eleghị anya nwa gị pụkwara ịbụ onye dị otú ahụ. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ụmụaka gị na-ahụ ka i ji obi ụtọ na-etinye uche n’ịgụ akwụkwọ dị mma, ha ga-enweta echiche nke na ọ bụghị nanị na ị na-ekwusa ịgụ ihe, ị na-emekwa ya eme.” Ọbụna nke ka mma, ụfọdụ nne na nna na-agụrụ ụmụ ha ihe n’olu na-ada ụda. N’ime nke ahụ, ha na-ewulite nkekọ na-ekpo ọkụ—ihe dị ụkọ n’ụzọ dị mwute n’ọtụtụ ezinụlọ taa.
Malite ọbá akwụkwọ. “Nwee akwụkwọ—ọtụtụ akwụkwọ,” ka Dr. Theodore Isaac Rubin na-atụ aro ya. “Ana m echeta ịgụ ha n’ihi na ha dị ya na n’ihi na onye ọ bụla ọzọ na-agụkwa ha.” Ụmụaka ga-agụ akwụkwọ ma ọ bụrụ na ha dị n’ebe dị nso. Ike mkpali ịgụ ihe ga-adị ukwuu ọbụna karị ma ọ bụrụ na akwụkwọ ndị ahụ dị n’ọbá akwụkwọ nke aka ha.
Mee ka ịgụ ihe dị ụtọ. E kwuwo ya na ọ bụrụ na nwatakịrị nwere mmasị n’ịgụ ihe, e meriwo ọkara nke agha mmụta a na-alụ. Ya mere mee ka ịgụ ihe bụrụ ahụmahụ dị ụtọ nye nwa gị. N’ụzọ dị aṅaa? Nke mbụ, kpaa ókè n’oge telivishọn; ọ ga-ebutere ịgụ ihe ụzọ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile. Nke abụọ, hụ na e nwere ọnọdụ dabara adaba maka ịgụ ihe; oge na ebe mkpọtụ na-adịghị, dị ka ọbá akwụkwọ onwe onye nke nwere ìhè dị mma, na-akpọ ịgụ ihe òkù. Nke atọ, emela ịgụ ihe ná mmanye. Wepụta akwụkwọ na ohere iji gụọ ihe, ma hapụ nwa ahụ ka ọ zụlite ọchịchọ ahụ.
Ụfọdụ nne na nna na-amalite ịgụrụ ụmụ ha ihe n’oge ha bụ ụmụ ọhụrụ. Nke a pụrụ ịbụ ihe bara uru. Ụfọdụ ọkachamara na-ekwu na ka ọ na-agbaru afọ atọ, nwatakịrị na-aghọta ihe ka ọtụtụ n’ime okwu ndị ọ ga-eji mee ihe ná mkparịta ụka nkịtị nke onye meworo okenye—ọ bụ ezie na ọ pụghị ikwu okwu ndị a n’ụzọ na-aga were were ugbu a. “Ụmụaka na-amalite ịmụta ịghọta asụsụ n’oge nakwa n’ụzọ dị oké ngwa karịa ka ha na-amụta ikwu ya n’ọnụ,” ka akwụkwọ bụ́ The First Three Years of Life na-ekwu. Bible na-ekwu banyere Timoti: “I sitere n’oge ị dị na nwa ọhụrụ mata ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ.” (2 Timoti 3:15) Okwu Bekee maka nwa ọhụrụ sitere n’okwu Latin bụ́ infans, nke pụtara n’ụzọ nkịtị “onye na-adịghị ekwu okwu.” Ee, Timoti nụrụ okwu ndị sitere n’akwụkwọ nsọ ogologo oge tupu o nwee ike ikwu ha.
Bible—Ihe Enyemaka Magburu Onwe Ya
“Bible bụ nchịkọta dị ebube nke akwụkwọ ọgụgụ,” ka akwụkwọ bụ́ The Bible in Its Literary Milieu na-ekwu. N’ezie, 66 akwụkwọ ya nwere ụdịdị nke abụ uri, abụ, na ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme nke ma ndị na-eto eto ma ndị okenye pụrụ ịmụta ihe n’ime ha. (Ndị Rom 15:4) Ọzọkwa, ihe e dere na Bible “si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume.”—2 Timoti 3:16.
Ee, ihe ọgụgụ kasị mkpa e nwere bụ Okwu Chineke, bụ́ Bible. E nwere ezi ihe mere e jiri chọọ ka eze Israel nke ọ bụla nwee ihe ndepụta nke ya nke Akwụkwọ Nsọ ma ‘gụọ ihe dị n’ime ya ụbọchị nile nke ndụ ya.’ (Deuterọnọmi 17:18, 19) E nyekwara Joshua iwu iji ‘ịtụgharị uche’ gụọ akwụkwọ nsọ—ya bụ, ịgụrụ ya onwe ya, n’olu dị ala—“ehihie na abalị.”—Joshua 1:8.
N’ikwu eziokwu, akụkụ ụfọdụ nke Bible adịghị mfe ọgụgụ. Ha pụrụ ịchọ itinye uche n’ihe. Cheta, Pita dere, sị: ‘Dị ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, ka agụụ mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya, na-agụsi unu ike.’ (1 Pita 2:2) N’ime ya ugboro ugboro, agụụ maka “mmiri ara” nke Okwu Chineke pụrụ ịghọ ihe ebumpụta ụwa dị ka agụụ ebumpụta ụwa nwa ọhụrụ nwere maka mmiri ara nne ya. A pụrụ ịzụlite mmasị maka ịgụ Bible.c Mgbalị a na-emere ya kwesịrị ya. “Okwu Gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m,” ka onye ọbụ abụ ahụ dere. (Abụ Ọma 119:105) Ọ̀ bụ na nduzi dị otú ahụ adịghị anyị nile mkpa n’oge anyị nke nsogbu?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gaghị aghọtahie enweghị mmasị ịgụ ihe na “amaghị otú e si agụ na otú e si ede,” nke bụ “enweghị ike ịgụ ma ọ bụ ide ihe.”
b N’ịghọta nke a, Watch Tower Society atụkwasịwo ihe ná mmepụta ya nke akwụkwọ e biri ebi site n’imepụta kaseti vidio n’isiokwu dị iche iche metụtara Bible.
c Iji nyere ụmụaka aka inwe agụụ maka ihe ọmụma Bible, Watch Tower Society ewepụtawo ihe ndị dị mfe na-enye aka n’ịmụ Bible, dị ka Akwukwọm nke Akukọ Bible na Ige Onye-Ozizi Uku Ahu Nti. Akwụkwọ abụọ ndị ahụ dịkwa na kasetị ụda olu n’asụsụ Bekee.