-
A Zaa Ajụjụ Anọ Banyere ỌgwụgwụỤlọ Nche—2010 | Ọgọst 1
-
-
Mụta ihe n’ihe ndị merela eme. Pita dere na Chineke “[ahapụghị] inye ụwa oge ochie ahụhụ, kama o chebere Noa, onye na-ekwusa ezi omume, ya na mmadụ asaa ndị ọzọ, mgbe o ji iju mmiri bibie ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 2:5) Pita kwuru banyere ndị ahụ na-akwa emo, sị: “Dị ka ha si chọọ, ha na-echezọ eziokwu a, na e nwere eluigwe nke dị site n’oge ochie na ala kpụkọrọ ọnụ nke si na mmiri pụta ma guzoro n’etiti mmiri site n’okwu Chineke; e jikwa ihe ndị ahụ bibie ụwa nke oge ahụ mgbe e mere ka iju mmiri rikpuo ya. Ma site n’otu okwu ahụ, eluigwe na ụwab dị ugbu a ka e debeere ọkụ, a na-edebekwa ha ruo ụbọchị ikpe na ụbọchị mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.”—2 Pita 3:5-7.
-
-
A Zaa Ajụjụ Anọ Banyere ỌgwụgwụỤlọ Nche—2010 | Ọgọst 1
-
-
b Ụwa Pita na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụwa ihe atụ. Onye so dee Baịbụl bụ́ Mozis kwukwara okwu banyere ụwa ihe atụ. O dere, sị: “Ụwa niile wee na-asụ otu asụsụ.” (Jenesis 11:1) Otú ahụ ụwa nkịtị na-anaghị asụ “otu asụsụ,” ọ bụghị ụwa nkịtị ka a ga-ebibi. Kama nke ahụ, dị ka Pita kwuru, ọ bụ ndị ajọ omume ka a ga-ebibi.
-