Igosi Ndị Nọ ná Mkpa Ịhụnanya
NDỊ Kraịst nwere ma ibu ọrụ ma ihe ùgwù igosi ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị nọ ná mkpa ịhụnanya. (1 Jọn 3:17, 18) Pọl onyeozi dere, sị: “Ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma ka anyị na-arụ ezi ihe karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.” (Ndị Galetia 6:10) Otu nwanna nwoke onye nọworo na-ejere Jehova ozi ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ anọ na nso nso a nwetara ịhụnanya nke òtù ụmụnna ndị Kraịst n’oge nrịanrịa nwunye ya na ọnwụ ya sochirinụ. Ọ na-ede, sị:
“Ebe m lekọtara nwunye m n’ụlọ n’oge nrịanrịa ya, enweghị m ike ịrụ ọrụ ego ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọnwa abụọ. Lee ahụ efe m nwere mgbe ndị enyi nọ n’ọgbakọ jiri ọchịchọ obi ha bịa nyere anyị aka! Ọtụtụ onyinye ego—‘iji nye aka maka mmefu ndị ọzọ,’ ka kaadị ndị na-esonụ na-ekwu—kwụrụ ụgwọ ụlọ, ụgwọ ọkụ na mmiri, na mmefu ndị ọzọ.
“Izu abụọ tupu ọnwụ nwunye m, onye nlekọta sekit anyị letara anyị nleta na-agba ume. Ọbụna o gosiri ihe nkiri slide nke ọgbakọ anyị ga-ekiri ná ngwụsị izu. O kwere anyị mee ịṅa ntị ná nzukọ ahụ na telifon—tinyere nzukọ maka ije ozi ubi nke onye nlekọta sekit duziri. N’otu n’ime ndị a, o mere ka ndị nile nọ maka ije ozi ubi jụọ nwunye m ‘kedụ ka i mere?’ dị ka otu ìgwè. N’ihi ya, ọ bụ ezie na ọ nọpụrụ iche n’ụzọ anụ ahụ, ọ dịghị mgbe owu mara ya.
“Ka ọ na-erule otu hour mgbe ọnwụ ya gasịrị, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị okenye nile nọ n’ọgbakọ m nọ n’ụlọ m. Ihe karịrị narị ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị letara anyị n’ụbọchị ahụ nanị. Nri dọkwasịrị n’elu table ‘n’ụzọ ọrụ ebube’ maka ndị nile nọ ebe ahụ. Apụghị m ịmalite ịkọ banyere onyinye dị iche iche, okwu ọmịiko, okwu nkasi obi, na ekpere ndị e kpere n’ihi m. Lee ka ha si bụrụ ndị na-ewusi ike! N’ikpeazụ aghaghị m ịgwa ụmụnna ka ha kwụsị iweta nri na inye aka ihicha ụlọ!
“Olee ebe ọzọ ma ọ bụghị ná nzukọ Jehova ka anyị pụrụ ịchọta ụdị okwu ọmịiko nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-adịghị, nchegbu, na ịhụnanya? Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ taa pụrụ iji otu aka gụọ ezi ndị enyi ole ha nwere. Jehova ejiriwo ezinụlọ dị ukwuu gbasapụrụ agbasapụ nke ụmụnna ime mmụọ ndị nwoke na ndị nwanyị gọzie anyị!”—Mak 10:29, 30.