-
Otú Geyọs Si Nyere Ụmụnna Ya AkaỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2017 | Mee
-
-
O nwere ike ịbụ na ndị ọbịa ndị ahụ bụ ndị ozi ala ọzọ, ndị Jọn dunyere ozi, ma ọ bụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Nke ọ bụla ọ bụ, ọ bụ ozi ọma mere ka ha palie njem. Jọn kwuru, sị: “Ha gawara n’ihi aha ya.” (3 Jọn 7) Jọn ebula ụzọ kwuo gbasara Chineke n’amaokwu nke isii. N’ihi ya, ọ dị ka ọ̀ bụ aha Jehova ka Jọn bu n’obi kwuo “n’ihi aha ya.” O doro anya na ụmụnna ndị ahụ nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, kwesịkwa ka a nabata ha. Ọ bụ ya mere Jọn ji dee, sị: “Anyị ji ụgwọ ịnabata ndị dị otú ahụ nke ọma, ka anyị wee ghọọ ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ n’eziokwu ahụ.”—3 Jọn 8.
-
-
Otú Geyọs Si Nyere Ụmụnna Ya AkaỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2017 | Mee
-
-
Nke mbụ, e nwere ike ikwu na ihe mere ọtụtụ n’ime anyị ji mụta eziokwu Baịbụl bụ na e nwere ụmụnna wepụtara onwe ha bịa kụziere anyị ya. O doro anya na ọ bụghị ụmụnna niile taa na-aga ebe dị anya n’ihi ozi ọma. Ma, anyị nwere ike ịna-akwado ndị na-aga ebe dị iche iche ma na-agba ha ume, dị ka onye nlekọta sekit na nwunye ya. Ọ bụ ihe Geyọs mere. Anyị nwekwara ike ịna-enyere ụmụnna ndị kwagara n’obodo ọzọ aka, ma ọ bụ ná mba ha ma ọ bụ ná mba ọzọ, bụ́ ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. N’ihi ya, ka anyị ‘na-ele ọbịa.’—Rom 12:13; 1 Tim. 5:9, 10.
-