-
Ile Ọbịa Ndị Kraịst n’Ụwa Kewasịrị EkewasịỤlọ Nche—1996 | Ọktoba 1
-
-
“Ya mere anyị onwe anyị ji ụgwọ ịkpọbata mmadụ dị otú a, ka anyị wee bụrụkwa ndị sooro eziokwu ahụ na-arụkọ ọrụ.”—3 JỌN 8.
-
-
Ile Ọbịa Ndị Kraịst n’Ụwa Kewasịrị EkewasịỤlọ Nche—1996 | Ọktoba 1
-
-
3. Ànyị pụrụ isi aṅaa chọta ezi ọṅụ na afọ ojuju?
3 Lee otú ihe ga-esi dị iche ma ndị mmadụ ṅomie ụzọ Jehova si emeso ndị ọzọ—inwe obiọma, mmesapụ aka, ile ọbịa! O mere ka o doo anya na isi ihe dị n’inweta ezi obi ụtọ abụghị anyị ịgbalị imejụ ọchịchọ anyị. Kama nke ahụ, lee isi ihe dị na ya: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Iji nweta ezi ọṅụ na afọ ojuju, anyị aghaghị imeri ihe mgbochi na nkewa ndị pụrụ ijikpa anyị. Anyị aghaghịkwa irute ndị anyị na ha na-ejere Jehova ozi. Ọ dị mkpa ka anyị ṅaa ntị na ndụmọdụ bụ́: “Ya mere anyị onwe anyị ji ụgwọ ịkpọbata mmadụ dị otú a, ka anyị wee bụrụkwa ndị sooro eziokwu ahụ na-arụkọ ọrụ.” (3 Jọn 8) Ile ndị ruru eru ọbịa, ruo n’ókè ọnọdụ anyị kwere bara uru n’ụzọ abụọ—ọ na-abara ma ndị na-ele ma ndị a na-ele ya uru. Mgbe ahụ, olee ndị so ná ndị ruru eru ndị anyị kwesịrị “ịkpọbata”?
-