-
Otú Geyọs Si Nyere Ụmụnna Ya AkaỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2017 | Mee
-
-
JỌN NYEERE GEYỌS AKA MGBE NSOGBU BỊAARA YA
Ihe mere Jọn ji degara Geyọs akwụkwọ ozi ahụ abụghị naanị ka o kelee ya. Jọn chọkwara inyere ya aka imeri nsogbu tara akpụ. N’ihi ihe ụfọdụ, otu nwanna aha ya bụ Dayọtrefis achọghị ịna-ele ụmụnna bịara ileta ọgbakọ ọbịa. Ọ gbalịdịrị igbochi ndị ọzọ ile ha ọbịa.—3 Jọn 9, 10.
O doro anya na Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi agaghị achọ ịnọ n’ụlọ Dayọtrefis ọ bụrụgodị na o kwere ha omume. Ọ chọrọ ịnọ n’ọkwá kachanụ n’ọgbakọ. O nweghị ihe o ji ihe Jọn kwuru kpọrọ. Ọ na-ekwukwa okwu ọjọọ gbasara Jọn onyeozi na ndị ọzọ. Jọn ekwughị na Dayọtrefis na-akụzi ihe na-abụghị eziokwu. Ma ọ naghị ekwe ka e mee ihe Jọn kwuru. Otú Dayọtrefis si jiri aka abụọ na-azọ ọkwá nakwa ụdị àgwà ndị ụwa ọ na-akpa gosiri na ọ naghị erubere Chineke isi. Ihe o mere na-egosi na nwanna nwee oké ọchịchọ ma ọ bụ dị mpako, o nwere ike itisa ọgbakọ. Ọ bụ ihe mere Jọn ji gwa Geyọs ka ọ ghara ‘ịna-eṅomi ihe ọjọọ.’ Ihe a o kwuru gbasakwara onye ọ bụla n’ime anyị.—3 Jọn 11.
-
-
Otú Geyọs Si Nyere Ụmụnna Ya AkaỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2017 | Mee
-
-
Nke abụọ, o kwesịghị iju anyị anya ma e nwee ndị na-ekweghị eme ihe e kwuru ka e mee n’ọgbakọ, ọ bụ eziokwu na ụdị ihe ahụ anaghị emekarị. E nwere ndị na-ekweghị eme ihe Jọn kwuru ka e mee. Ụfọdụ mekwara Pọl otú ahụ. (2 Kọr. 10:7-12; 12:11-13) Gịnịkwanụ ka anyị ga-eme ma anyị hụ ndị na-eme otú ahụ n’ọgbakọ? Pọl gwara Timoti, sị: “Ohu nke Onyenwe anyị ekwesịghị ịlụ ọgụ, kama o kwesịrị ịbụ onye na-emeso mmadụ niile n’ụzọ dị nwayọọ, onye ruru eru izi ihe, onye na-ejide onwe ya mgbe ọnọdụ dị njọ, jiri nwayọọ na-ezi ndị isi ike ihe.” Anyị jide onwe anyị ma a kpasuo anyị iwe, o nwere ike ime ka ụfọdụ ndị na-akatọ ndị ọzọ jiri nwayọọ nwayọọ gbanwee àgwà ha. Jehova nwere ike ime “ka ha nwee nchegharị nke na-eduga n’ezi ihe ọmụma nke eziokwu.”—2 Tim. 2:24, 25.
-