-
“O Mere Ihe Dị Chineke Ezi Mma”Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2017 | Nke 1
-
-
INỌK ‘BURU AMỤMA BANYERE HA’
O nwere ike ịbụ na Inọk chere na o nweghị onye na-ahụ mbọ ọ na-agba ife Chineke ebe ọ bụ na ndị oge ahụ anaghị efe Chineke. Ma, Jehova Chineke ya, ọ̀ na-ahụ mbọ ọ na-agba ime ihe ziri ezi? Eenụ. Otu ụbọchị, Jehova gwara Inọk okwu. O ziri ya ozi ọ ga-ezi ndị oge ya ahụ. Ọ bụ otú a ka Inọk si bụrụ onye amụma mbụ e dere ihe o buru n’amụma na Baịbụl. Olee otú anyị si mara? Ọ bụ ihe Jud, onye nne ji ya na Jizọs dere mgbe ọtụtụ narị afọ gachara mere ka anyị mara. Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka Jud dee amụma ahụ na Baịbụl.a
Gịnị ka Inọk buru n’amụma? O kwuru, sị: “Lee! Jehova bịara, ya na ọtụtụ iri puku ndị nsọ ya, ime ha niile ihe e kpere n’ikpe, na ịma ndị niile na-adịghị asọpụrụ Chineke ikpe banyere omume ha niile nke asọpụrụghị Chineke, bụ́ ndị ha mere n’ụzọ asọpụrụghị Chineke, nakwa banyere ihe niile na-awụ akpata oyi nke ndị mmehie na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.” (Jud 14, 15) Ị̀ chọpụtara na Inọk kwuru okwu ka à ga-asị na Chineke emezuola amụma ahụ o buru? Ọ bụ otú ahụ ka ọtụtụ ndị amụma sikwa buo amụma mgbe Inọk nwụchara. Ihe mere Inọk ji buo amụma ahụ otú ahụ bụ na o ji n’aka na ọ ga-emezurịrị, ya ekwuzie ya ka à ga-asị na o mezuola.—Aịzaya 46:10.
Inọk ji obi ike zie ndị oge ya na-anaghị asọpụrụ Chineke ozi Chineke ziri ya zie ha
Olee otú Inọk si zie ndị mmadụ ozi ahụ? Ọ gwara ha okwu n’ezoghị ọnụ. O kwuru ugboro abụọ na ha bụ ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke, kwuokwa ugboro abụọ na ha na-eme omume asọpụrụghị Chineke. O ji ihe a o kwuru katọọ ndị ahụ na-eme ihe ọjọọ, ihe ha na-eme, na otú ha si na-eme ya. Ihe a o kwuru gosikwara na Chineke ga-ebibi ha n’ihi na ndị mmadụ akpaala arụ n’ụwa kemgbe ahụ a chụpụrụ Adam na Iv n’ogige Iden. Jehova ga-eji “ndị nsọ” ya, ya bụ, ìgwè ndị mmụọ ozi ya bibie ha. Inọk gwara ha ihe a Chineke ga-eme na-atụghị egwu. E nweghị onye ya na ya na-eso aga agwa ha ya. Ọ ga-abụ na o juru Lemek anya ka ọ nọ na-ele otú nna nna ya si kata obi na-ezi ndị mmadụ ozi a. Ọ bụrụ otú ahụ, anyị ghọtara ihe kpatara ya.
Okwukwe Inọk nwere mere ka o lee ụwa anya otú Chineke si ele ya anya. Ụdị okwukwe a o nwere ò kwesịghị ime ka anyị na-elekwa ụwa a anya otú Chineke si ele ya? Ozi ahụ Inọk ji obi ike zie ndị oge ya gbasakwara anyị taa. Jehova bibiri ndị ahụ na-anaghị asọpụrụ ya otú ahụ Inọk buru n’amụma. O ji mmiri bibie ha n’oge Noa. Chineke ga-ebibi ndị na-anaghị asọpụrụ ya n’oge anyị a otú ahụ o bibiri ndị nke oge Noa. (Matiu 24:38, 39; 2 Pita 2:4-6) Ya na ìgwè ndị mmụọ ozi ya ejikerela ibibi ha. Anyị kwesịrị iji ozi ahụ Inọk ziri kpọrọ ihe ma na-akọrọ ya ndị ọzọ. Ndị enyi anyị na ndị ezinụlọ anyị nwere ike ha agaghị ege ntị n’ozi ahụ. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike iche na o nweghị onye na-ahụ mbọ anyị na-agba ife Chineke. Ma, Jehova na-ahụ mbọ anyị na-agba. Ọ gaghị ahapụ anyị otú ahụ ọ na-ahapụghị Inọk.
-
-
“O Mere Ihe Dị Chineke Ezi Mma”Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2017 | Nke 1
-
-
a Ụfọdụ ndị ọkà mmụta Baịbụl na-ekwu na ihe Jud dere si n’akwụkwọ a na-akpọ Akwụkwọ Inọk. Amaghị onye dere akwụkwọ ahụ, ma, a na-asị na ọ bụ Inọk dere ya. E nwere ebe e dere amụma ahụ Inọk buru n’ime ya. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ ga-abụ na onye dere ya si n’akwụkwọ ọzọ e dere n’oge ahụ anyị na-amaghịzi ebe ọ dị nweta ihe o dere. O nwekwara ike ịbụ na ndị ma gbasara amụma ahụ kọọrọ ya gbasara ya. Ọ ga-abụkwa otú ahụ ka Jud si nweta ihe o dere ma ọ bụkwanụ ya abụrụ Jizọs kọọrọ ya gbasara ya n’ihi na Jizọs nọ n’eluigwe mgbe ahụ na-ahụ Inọk.
-