-
Inọk na Chineke Yịkọrọ Jegharịa n’Ụwa nke Na-adịghị Asọpụrụ ChinekeỤlọ Nche—2001 | Septemba 15
-
-
Amụma Megide Ndị Na-adịghị Asọpụrụ Chineke
Ịnọgide na-enwe ụkpụrụ dị elu na-esi nnọọ ike mgbe ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke gbara anyị gburugburu. Ma Inọk zikwara ozi ikpe dị ike megide ndị na-emebi iwu. N’ịbụ onye mmụọ Chineke duziri, Inọk kwupụtara n’ụzọ amụma, sị: “Lee, Onyenwe anyị bịara, Ya na ndị nsọ Ya a na-apụghị ịgụta ọnụ, ikpe mmadụ nile ikpe, na ịtụ ndị nile ndị na-asọpụrụghị Chineke ihe n’anya, bụ́ ọrụ nile nke asọpụrụghị Chineke ha nke ha rụrụ n’asọpụrụghị Chineke, ha na okwu dị ike nile nke ndị mmehie ndị na-asọpụrụghị Chineke kwugidere Ya.”—Jud 14, 15.
Mmetụta dị aṅaa ka ozi dị otú ahụ ga-enwe n’ahụ ndị na-ekweghị ekwe kpọrọ ekwo nkụ? Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya iche na okwu ndị ahụ na-agba agba ná ntị mere ka a kpọọ Inọk asị, ikekwe na-akpata ịkwa ya emo, ime ya akaje, na iyi ya egwu. Ọ ghaghị ịbụ na ụfọdụ chọrọ igbu ya. Otú ọ dị, e menyelighị Inọk ụjọ. Ọ maara ihe mere onye ezi omume bụ́ Ebel, dịkwa ka ya, Inọk kpebisiri ike ijere Chineke ozi, n’agbanyeghị ihe ga-emenụ.
-
-
Inọk na Chineke Yịkọrọ Jegharịa n’Ụwa nke Na-adịghị Asọpụrụ ChinekeỤlọ Nche—2001 | Septemba 15
-
-
[Igbe dị na peeji nke 30]
Bible Ọ̀ Na-ehota Okwu Site n’Akwụkwọ Inọk?
Akwụkwọ Inọk bụ ihe odide nke apọkrịfa na nke pseudepigrapha. E kwuru n’ụzọ na-abụghị eziokwu na ọ bụ Inọk dere ya. Ikekwe n’ịbụ nke e dere n’ihe dị ka narị afọ nke abụọ na nke mbụ T.O.A., ọ bụ nchịkọta nke akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke ndị Juu bụ́ nke e tinyere nnu na ose, nke ihe àmà na-egosi na ọ bụ nkọwa sara mbara banyere aka dị mkpirikpi Jenesis zoro n’ebe Inọk nọ. Nanị nke a ezuola ime ka onye hụrụ Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ n’anya jụ ihe odide ahụ.
N’ime Bible, ọ bụ nanị akwụkwọ Jud bu okwu amụma nke Inọk, bụ́: “Lee, Onyenwe anyị bịara, Ya na ndị nsọ Ya a na-apụghị ịgụta ọnụ, ikpe mmadụ nile ikpe, na ịtụ ndị nile ndị na-asọpụrụghị Chineke ihe n’anya, bụ́ ọrụ nile nke asọpụrụghị Chineke ha nke ha rụrụ n’asọpụrụghị Chineke, ha na okwu dị ike nile nke ndị mmehie ndị na-asọpụrụghị Chineke kwugidere Ya.” (Jud 14, 15) Ọtụtụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na e si kpọmkwem n’Akwụkwọ Inọk hota amụma Inọk buru megide ndị ya na ha dịkọrọ ndụ bụ́ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Ò kwere omume na Jud ga-esi n’akwụkwọ apọkrịfa a na-apụghị ịdabere na ya nweta ihe o dere?
E kwughị otú Jud si mara banyere amụma Inọk n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ pụrụ ịbụ nnọọ na o hotara ya site n’ihe odide a ma ama a pụrụ ịdabere na ya bụ́ nke dịwara eri oge gboo. Ihe àmà na-egosi na Pọl mekwara ihe yiri nke ahụ mgbe o kwuru na aha ndị majik ahụ na-anọ n’obí eze Fero a na-akpọghị aha ha bụ́ ndị megidere Mosis, bụ Janis na Jambris. Ọ bụrụ na onye dere Akwụkwọ Inọk nwere ike inweta ihe odide oge ochie dị otú a, gịnị mere Jud apụghị inweta ya?a—Ọpụpụ 7:11, 22; 2 Timoti 3:8.
Otú Jud si nweta ihe ọmụma banyere ozi Inọk ziri megide ndị ahụ na-adịghị asọpụrụ Chineke bụ obere okwu. Eziokwu ahụ bụ́ na Jud dere ihe odide ya site n’ike mmụọ nsọ Chineke nwapụtara na ọ bụ ihe a pụrụ ịdabere na ya. (2 Timoti 3:16) Mmụọ nsọ Chineke duziri ya ka ọ ghara ikwu ihe ọ bụla na-abụghị eziokwu.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Onye na-eso ụzọ bụ́ Stifen nyekwara ihe ọmụma nke na-adịghị ebe ọ bụla ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. O metụtara agụmakwụkwọ Mosis n’Ijipt, ya ịbụ onye dị afọ 40 mgbe ọ gbapụrụ n’Ijipt, afọ 40 ọ nọrọ na Midian, na òkè mmụọ ozi keere n’inye Iwu Mosis.—Ọrụ 7:22, 23, 30, 38.
-