-
Jehova Na-eji Ozi Gị Sitere ná Mkpụrụ Obi Dum Akpọrọ IheỤlọ Nche—1997 | Ọktoba 15
-
-
5. Olee otú ihe nlereanya nke ndị ozi si gosi na ọ bụghị iwu na mmadụ nile ga-eme otu ihe ahụ n’ozi?
5 Ime ihe site ná mkpụrụ obi dum ọ̀ pụtara na anyị nile aghaghị ime ihe hà nhata n’ozi? Nke ahụ agaghị ekwe omume ma ọlị, n’ihi na ọnọdụ na ikike dịgasị iche site ná mkpụrụ obi gaa ná mkpụrụ obi. Tụlee ndị ozi kwesịrị ntụkwasị obi nke Jisọs. Ha nile enweghị ike ime ihe hà nhata. Dị ka ihe atụ, anyị maara ihe dị nnọọ nta banyere ụfọdụ ndị ozi, dị ka Saịmọn Kananịọs na Jemes nwa Alfịọs. Ikekwe ọrụ ha dị ka ndị ozi dị nnọọ nta. (Matiu 10:2-4) N’ụzọ dị iche, Pita nwere ike ịnakwere ọtụtụ ibu ọrụ dị arọ—leenụ, Jisọs ọbụna nyere ya “mkpịsị ugodi nke alaeze”! (Matiu 16:19) Ma, e bulighị Pita elu karịa ndị ọzọ. Mgbe Jọn hụrụ ọhụụ nke Jerusalem Ọhụrụ ná Mkpughe (ihe dị ka na 96 O.A.), ọ hụrụ nkume ntọala 12, e dekwasịkwara n’elu ha “aha iri na abụọ nke ndị ozi iri na abụọ ahụ.”a (Mkpughe 21:14) Jehova jiri ozi nke ndị ozi ahụ nile kpọrọ ihe, ọ bụ ezie na ihe àmà na-egosi na ụfọdụ nwere ike imekarị ndị ọzọ.
-
-
Jehova Na-eji Ozi Gị Sitere ná Mkpụrụ Obi Dum Akpọrọ IheỤlọ Nche—1997 | Ọktoba 15
-
-
a Ebe Mataịas nọchiri Judas dị ka onyeozi, aha ya—ọ bụghị nke Pọl—ga-apụtaworị n’etiti ndị ahụ nọ na nkume ntọala 12 ahụ. Ọ bụ ezie na Pọl bụ onyeozi, o soghị n’ime 12 ahụ.
-