Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Obodo Ọma Ahụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 6. (a) Olee ụzọ Jọn si kọwaa ọ̀tụ̀tụ̀ a tụrụ obodo ahụ, gịnịkwa ka ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ na-egosi? (b) Gịnị pụrụ ikọwa na ihe ọ̀tụ̀tụ̀ e ji mee ihe bụ “dị ka ọ̀tụ̀tụ̀ mmadụ si dị, ya bụ, nke mmụọ ozi”? (Lee nkọwa ala ala peji.)

      6 Jọn gara n’ihu n’akụkọ ya, sị: “Onye ahụ nke na-akpanyere m ụka nwekwara ihe ọ̀tụ̀tụ̀, bụ́ amị nke ọlaedo, ka o wee tụọ obodo ahụ, na ọnụ ụzọ ámá ya nile, na mgbidi ya. Obodo ahụ nwekwara nkuku anọ hà nhata, ogologo ya hàkwa ka obodobo ya: o wee were amị ahụ tụọ obodo ahụ, [puku furlong iri na abụọ]: ogologo ya na obodobo ya na elu ya hà. O wee tụọ mgbidi ya, [otu narị cubit na iri anọ na anọ], dị ka ọ̀tụ̀tụ̀ mmadụ si dị, ya bụ, nke mmụọ ozi.” (Mkpughe 21:15-17) Mgbe a tụrụ ụlọ nsọ ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, nke a kwere nkwa mmezu nke nzube nile nke Jehova n’ihe banyere ya. (Mkpughe 11:1) Ugbu a, ọ̀tụ̀tụ̀ nke mmụọ ozi ahụ na-atụ Jerusalem Ọhụrụ ahụ gosiri otú nzube Jehova nile banyere obodo nke a dị ebube si bụrụ ihe na-enweghị mgbanwe.a

      7. Gịnị bụ ihe kwesịrị ịrịba ama banyere ọ̀tụ̀tụ̀ nile nke obodo ahụ?

      7 Lee nnọọ obodo kwesịrị ịrịba ama nke a bụ! Akụkụ anọ hà nhata nke gburugburu ya dị 12,000 furlong (ihe dị ka 2,220 kilomita), nke mgbidi ya dị elu 144 cubit gbara gburugburu, ma ọ bụ 64 mita. Ọ dịghị obodo nkịtị pụrụ inwe ọ̀tụ̀tụ̀ dị otú ahụ. Ọ ga-anọchi mbara ala nke ihe dị ka okpukpu 14 nke Israel nke oge a, ịdị elu ya ga-erukwa ihe dị ka 560 kilomita banye na mbara igwe! E zitere Mkpughe n’ihe ịrịba ama. Ya mere, gịnị ka ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị a na-agwa anyị banyere Jerusalem Ọhụrụ ahụ nke dị n’eluigwe?

      8. Gịnị ka e gosiri site na (a) mgbidi obodo ahụ dị elu 144 cubit? (b) ọ̀tụ̀tụ̀ obodo ahụ nke dị 12,000 furlong? (ch) obodo ahụ ịbụ akụkụ anọ hà nhata?

      8 Mgbidi ndị ahụ ịdị elu ha dị 144 cubit na-echetara anyị na ihe mejupụtara obodo ahụ bụ 144,000 ndị e ji mmụọ nabata dị ka ụmụ Chineke. Ọnụ ọgụgụ ahụ bụ 12 nke dị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ 12,000 furlong nke obodo ahụ—nke ogologo ya, obodobo ya, na ịdị elu ya hà nhata—bụ nke a na-eji eme ihe n’ụzọ ihe atụ n’ihe metụtara nhazi n’amụma Bible. Ya mere, Jerusalem Ọhụrụ bụ nhazi na-enweghị atụ e mere iji wee mezuo nzube ebighị ebi nke Chineke. Jerusalem Ọhụrụ, ya na Eze ahụ bụ Jisọs Kraịst, bụ nhazi Alaeze nke Jehova. E nwekwara ihe banyere ọdịdị nke obodo ahụ: nke bụ akụkụ anọ hà nhata. N’ụlọ nsọ nke Solomọn, Ebe Kasị Nsọ ahụ, nke nwere ihe nnọchianya nke ọnụnọ Jehova, bụkwa akụkụ anọ hà nhata. (1 Ndị Eze 6:19, 20) Ya mere, lee ka o si kwesị ekwesị na Jerusalem Ọhụrụ, bụ́ nke ebube Jehova n’onwe ya na-enye ìhè, bụ nke a na-ahụ dị ka akụkụ anọ buru ibu nke hà nhata n’ụzọ zuru okè. Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ya nile bụ nke a haziri n’ụzọ zuru okè. Ọ bụ obodo nke na-enweghị ihe ndị na-ezughị okè ma ọ bụ ntụpọ.—Mkpughe 21:22.

  • Obodo Ọma Ahụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • a Eziokwu ahụ bụ na ihe ọ̀tụ̀tụ̀ a e ji mee ihe bụ “dị ka ọ̀tụ̀tụ̀ mmadụ si dị, ya bụ, nke mmụọ ozi” pụrụ imetụta eziokwu ahụ bụ na ihe mejupụtara obodo ahụ bụ 144,000 ndị bụbu mmadụ, ma ndị mesịrị ghọọ ihe okike ndị bụ mmụọ n’etiti ndị mmụọ ozi ahụ.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya